You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Nigeria Elections 2019: E jizi egwu agụta Biafra?

Ihe na-eme na mpaghara Naijiria niile dịka Inec bugharịrị ntuliaka kara ime taa bụ Satọde Febụwarị 16, afọ 2019.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa and Chimamaka Ihenacho

  1. Chụọ onyeisi Inec n'ọrụ- Ndị Imo

    Ọtụtụ okporoụzọ n'Owere tọgbọ chakọọ dịka naanị mmadụ na ụgbọala ole na ole na-agagharị.

    Obi adịghị ọtụtụ ndị mmadụ ndị ha na onye ntakụkọ anyị nwere mkparịtaụka.

    Otu nwoke kpọrọ onwe ya Chukwueze na-ewe iwe.

    Onye ọzọ sị na ya bụ Emmanuel na ya ga-apụta tụọ ọ vootu izu ọzọ, mana ọ kpọrọ oku ka a chụọ onyeisi Inec bụ Yakubu Mahmood maka 'amaghị ọrụ."

  2. N'Abia, ndị n'ọchị, ndị n'akwa

    Ọ bụghị mmadụ niile nwere otu echiche banyere nkagbu Inec kagburu ntuliaka taa.

    N'Abia steeti ụfọdụ na-enwe anụrị, ebe iwe ji ụfọdụ.

  3. Iro tọgbọ chakoo n'Anambara

    N'ebe ụfọdụ n' Ọka Anambara steeti, ụzọ niile togboro chakoo.

    Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu uche ha gbasara ya bụ nhighari mberede e highariri ntụliaka taa kwuru n' obi aghị ha mma.

  4. Iwe, ọnụma jụrụ ụmụ Naịjiria obi

    Ọsụkọsụ nwa mkpi ji ọtụtụ ụmụ Naijiria dịka Inec kagburu ntuliaka nke ta.

    Ha kwupụtara nke a n'igwe okwu soshal midia.

    Aka na-achị Rịvas steeti bụ Nyesom Wike kwuru na ya gbaburu ama na Inec chọrọ ihigharị ntuliaka.

    Ayo Sogunnro sị na ọ bụ aghụghọ.

  5. PDP na APC na-arụ onwe ha aka

    PDP na APC na-ebo onwe ha ebubo makanhịgharị Inec hịgharịrị ntụliaka ọkwa onyeisiala nakwa nke ndị omeiwu nke etiti na steeti.

    PDP sị na ọ bụ nkata Inec na Buhari APC kpara, APC gbụkwa otu asọ ahụ n'ọnụ.

    Ọnụ na-ekwuru PDP bụ Kola Ologbidiyan gọsịị ịtụnaanya n'ihe mere.

    N'aka nke ọzọ, onye ojeozi onyeisala Muhammadu Buhari n'ihe gbasara scshal midia bụ Bashir Ahmed jụrụ Inec ma ha amakwa na ndị mmadụ emefuola ego iji mee njem maka ntuliaka a.

  6. Inec mara ọkwa ntụmadị

    N'ihe dịka Elekere Atọ nke ụtụtụ taa bụ Satọde, ngalaba na-achịkọta ihe gbasara ntuliaka na Naijirịa bụ Inec higharịrị ụbọchị ntuliaka ọkwa onyeisiala,tinye ya n'izụ na-abịa.

    Ha kwuru na nke a mere n'ihi na ha akwadoteghi ọ kachasị n'ikesa akaụrụngwaọrụ nakwa ịhazi ihe niile dị na ntuliaka kwesiri ime taa.

    Kepụkepu na-enwere ike ihigharị ntuliaka pụtara n'ime abali ebe Elekere iri abali Fraide dịka Inec kpọrọ nzukọ ndị ntuliaka metụtara n' International Conference Centre (ICC) dị n'Abuja.

    Oge o fọrọ nkeji iri abụọ ka Elekere mbụ nke Satode akụọ , ka e mechara nzụkọ ahụ mana akwaghị ndị ntakụkọ ihe ekpebiri na nzuko ahụ.