You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Nigeria Election 2019: Ogbunigwe n'Ebonyi?

Akụkọ ihe na-eme na Naijiria gbaa gburugburu ka ọ fọrọ naanị otu ụbọchị tupu eme ntuliaka 2019.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Chimezie UcheAgbo and Chimamaka Ihenacho

  1. N'Anambara steeti, ọtụtụ ndị njem na-aga obodo ha

    Ọtụtụ ụgbọala kwụjuru n'ahịa Eke Ọka, na Steeti Anambara dịka ọtụtụ ndị njem malitere njem ịga obodo ha dị iche iche.

    Ndị na-achịkwa ụgbọala nọkwa n'oru na-ahụ na ihe na-aga etu o kwesịrị.

  2. Ndị ọrụ agaghị ọrụ n'Anambara steeti taa

    Ụlọọrụ gọọmenti n'Anambara steeti tọgbọrọ chakoo dịka ndị mmadụ na-agaghị ọrụ taa.

    Gọọmenti steeti ahụ nyere ezumike taa na steeti niile gba gburugburu.

    Komishoma na-ahu maka mgbasa ozi n'Anambara steeti bụ Don Adinuba kwuru ezumike ahụ bụ iji nye ndị ọrụ gọọmenti ohere ka ha laa n'obodo ha ga tụọ vootu echi bụ ụbọchị ntuliaka.

  3. Ị hụla ihe ndị Nnamdi Kanu chọrọ?

    Ihe ọtụtụ ndị Igbo na-ajụ bụ ihe ndị ahụ Nnamdi Kanu kwuru na e mezuola, onye mezuru ha?

  4. Nnamdi Kanu agwaghị ndị Igbo anatala PVC

    Onye ọkaikpe Nnamdi Kanu bụ Paul Achalla ekwuola na o nweghi mgbe Kanu jiri gwa ndị Igbo ka ha ghara ịnata PVC ha maọbụ binye aka n'akwụkwọ e ji atụ vootu.

    Achalla kwuru nke a oge BBC Igbo gbara ya ajụjụọnụ gbasara okwu Kanu kwuru ka ndị Igbo gaa tụọ vootu.

    Nke a bụ agbanyeghi na kamgbe ihe karịrị otu afọm, Kanu na-ekwu ka ndị Igbo ghara itu vootu.

    N'ozi o dere n'akara twitter ya ụnyaa, Kanu kwuru na e mezuola ihe niile ọ chọrọ kpatara o jiri kwuo ka ndị mmadụ gaa tụọ vootu.

    Achalla kwuru n'ezie Kanu kwuru ka a ghara ịtụ vootu na mbụ mana o kwughi ka a ghara ịnata PVC.

  5. Anyị na-anabata gị na mgbasa ozi nke taa gbasara ntuliaka 2019.

    Ọ fọrọ naanị ụfọdụ elekere tupu ntuliaka e biri ọkụ.

    Soro anyị ebe a ka ị hụ etu o si aga.