"Ụbịam karịrị n’Abịa.
Achọrọm ka gbanwe Abịa. Ọkwa gọvanọ ga-enye mụ ohere ime ọfụma karịa ebe m nọ ugbua."- Blessing Okwuchi Nwagba - SDP
Ndị na-azọ ọchịchi gọvanọ n'Abia na-eme nrụrịtaụka n'Umuahia taa.
Chiagozie Nwonwu
"Ụbịam karịrị n’Abịa.
Achọrọm ka gbanwe Abịa. Ọkwa gọvanọ ga-enye mụ ohere ime ọfụma karịa ebe m nọ ugbua."- Blessing Okwuchi Nwagba - SDP
Chris Okereke bụ onye nchịkọta

Blessing Okwuchi Nwagba bụ ọkammụta n’ihe banyere mmekọ mmadụ na mmadu bụ nke Bekee kpọrọ “Sociologist”
Ọ gara akwụkwọ na Mahadum Pọt Hakọt nakwa Legọs.
O na-azọ ọkwa n’okpuru SDP

Emeka Uwakolam bụ ọkaikpe.
Ọrụbụru ọrụ dịka osote onyeisi ndị ntoroọbịa PDP, nakwa onye ndụmọdu pụrụiche na ulọ omeiwu Naịjirịa.
Ọ na-azọ ọchịchị n’okpuru pati Accord.

Alex Otti bụ onye okachamara n’ihe metutara akụnaụba obodo, bụ nke Bekee kpọrọ “Economist”.
Ọ bụbụ onyeisi ụlọakụ Diamond Bank Plc.
Otti zọbụru ọchịchị n’okpuru APGA n’afọ 2014.Ọ ka na-azọkwa ọchịchị n’okpuru APGA.

Nkọrọ bụ onye ojiegoachọego. Ọ gara akwụkwọ na mahadum Pọt Hakọt nakwa Nnamdị Azikiwe nke Awka.
Ọ bụ ya bụ onye “not too young to run” so azọ ya bụ oche.
Ọ na-azo ọchịchị n’okpuru pati YPP

Dịka ọkwu ugbua, anyị nọzị nsọ. Lee obele ihe maka ndị anyị ga-ege ntị taa:
Osote Onyeisi BBC na naịjirịa bụ Aliyu Tnako nọ n'Umuahịa. Njikere bụ bịa kirie!
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ya nwee ajụjụ ịchọrọ ịjụ, ga n’akara Facebook anyi ga jụọ ya.
Ndị nchekwa zụrụ ka eme.
Ha na-enyocha mmadụ ọfụma tụpụ ibanye.

Ndị BBC zuru ka eme.
Gee ha ntị!


Ndị otu anyị akwadola. Anyi na-echezi ndị mmadụ


Ndị kwere nkwa na ha ga-abịa taa bụ Alex Otti nke APGA, Blessing Nwagba nke SDP, Emeka Uwakolam nke Accord na Joseph Nkoro nke YPP.
Anyị na-asị unu nnọọ n'akụkọ metụtara nrụrịta ụka BBC na-eme.
Taa anyị nọ Abịa steeti, ebe ndị chọrọ ịbụrụ aka ga-achị steeti ahụ ga-agwa ndị Abịa ihe ha ji bịa.
Ngwa ka anyị malite!
