You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Nrụrịtaụka BBC nke Abia steeti

Ndị na-azọ ọchịchi gọvanọ n'Abia na-eme nrụrịtaụka n'Umuahia taa.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chiagozie Nwonwu

  1. Chris Okereke bụ onye nchịkọta

  2. Njem amalitela!

  3. Nke na-eme ugbua: Okezie Ikpeazu ekwuola na ya agaghị abịa nrụrịta ụka BBC

  4. Blessing okwuchi nwagba - SDP

    Blessing Okwuchi Nwagba bụ ọkammụta n’ihe banyere mmekọ mmadụ na mmadu bụ nke Bekee kpọrọ “Sociologist”

    Ọ gara akwụkwọ na Mahadum Pọt Hakọt nakwa Legọs.

    O na-azọ ọkwa n’okpuru SDP

  5. Chukwuemeka Uwakolam - Accord Party

    Emeka Uwakolam bụ ọkaikpe.

    Ọrụbụru ọrụ dịka osote onyeisi ndị ntoroọbịa PDP, nakwa onye ndụmọdu pụrụiche na ulọ omeiwu Naịjirịa.

    Ọ na-azọ ọchịchị n’okpuru pati Accord.

  6. Alex Otti –APGA

    Alex Otti bụ onye okachamara n’ihe metutara akụnaụba obodo, bụ nke Bekee kpọrọ “Economist”.

    Ọ bụbụ onyeisi ụlọakụ Diamond Bank Plc.

    Otti zọbụru ọchịchị n’okpuru APGA n’afọ 2014.Ọ ka na-azọkwa ọchịchị n’okpuru APGA.

  7. Joseph Nkoro - YPP

    Nkọrọ bụ onye ojiegoachọego. Ọ gara akwụkwọ na mahadum Pọt Hakọt nakwa Nnamdị Azikiwe nke Awka.

    Ọ bụ ya bụ onye “not too young to run” so azọ ya bụ oche.

    Ọ na-azo ọchịchị n’okpuru pati YPP

  8. Dịka ọkwu ugbua, anyị nọzị nsọ. Lee obele ihe maka ndị anyị ga-ege ntị taa:

  9. Onyeisi anyị yi isi agụ bịa!

    Osote Onyeisi BBC na naịjirịa bụ Aliyu Tnako nọ n'Umuahịa. Njikere bụ bịa kirie!

  10. Ekedụ ajụjụ ịchọrọ ka ajụọ?

    Ya nwee ajụjụ ịchọrọ ịjụ, ga n’akara Facebook anyi ga jụọ ya.

  11. Adịghị amaba ebe amaba o

    Ndị nchekwa zụrụ ka eme.

    Ha na-enyocha mmadụ ọfụma tụpụ ibanye.

  12. Lee etu anyị hazie nrụrịta ụka a

    Ndị BBC zuru ka eme.

    Gee ha ntị!

  13. Ndị mmadụ na-edenye aha iji banye

  14. Anyị akwadola!

    Ndị otu anyị akwadola. Anyi na-echezi ndị mmadụ

  15. Ndị ga-etinye ọnụ n'okwu

    Ndị kwere nkwa na ha ga-abịa taa bụ Alex Otti nke APGA, Blessing Nwagba nke SDP, Emeka Uwakolam nke Accord na Joseph Nkoro nke YPP.

  16. Unu asala chị

    Anyị na-asị unu nnọọ n'akụkọ metụtara nrụrịta ụka BBC na-eme.

    Taa anyị nọ Abịa steeti, ebe ndị chọrọ ịbụrụ aka ga-achị steeti ahụ ga-agwa ndị Abịa ihe ha ji bịa.

    Ngwa ka anyị malite!