You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Nrụrịtaụka BBC Igbo n'Imo steeti

Ndị na-azọ ọchịchi gọvanọ n'Imo na-eme nrụrịtaụka n'Owere taa

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo and Chiagozie Nwonwu

  1. #bbcigbogovdebate: Anyị adịla nkwadebe imalite.

    Ọtụtụ mmadụ anọrọlarị ala n'ụlọ nzụkọ dị n'Owerre, Imo steeti ebe nrụrịta ụka nke BBC Igbo chikọbara maka gọvanọ ga anọ kpọtụọ. Ndebanye aha n'akwụkwọ malitere ka mgbe elekere iri na out nke ụtụtụ taa bụ mkpụrụ ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Janụwarị afọa bụ 2019. Ọtụtụ ndị Uwakwe Roland, Wilson Amaefule, Fidel Onyeneke, Bar Macdonald Ogu, Ogechi, Emmanuel...

  2. Oche wụsara ka aja!

    Ebe a niile bụ ndị mmadụ ga-anọ na ha maka na ndị Imo chọrọ iwere ọchịchị n'aka ha ugbua.

    Ha kwuru na ha agaghị anọ na mmiri ncha aba ha anya.

  3. Etu nhazị nrụrịtaụka taa na-aga

    Ihe onyonyo a na-egosi etu anyi si ahazị ha bu nrụrịtauka na-eme taa

    #BBCGovDebate, #BBCIgboDebate

  4. Onye bụ Chukwuemeka Ihedioha?

    Chukwuemeka Ihedioha bụbu osote onyeisi ụloomeiwu nta. Ọ na anọchịte anya Aboh Mbaise/Ngor Okpala.

    Ọ na-azọ ọchịchị n’okpuru Peoples Democratic Party (PDP).

    #BBCGovDebate, #BBCIgboDebate

  5. Onye bụ Ifeanyi Ararume?

    Ifeanyi Godwin Ararume anọchitere anya Imo North n’ụlọ Ọmeiwu nke ukwu. Ọ nọbụ na pati na-anọghị n’ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) nakwa All Progressives Congress (APC).

    Ọ na-azọ ọchịchị n’okpuru All Progressive Grand Alliance (APGA).

    #BBCGovDebate, #BBCIgboDebate

  6. Onye bụ Uche Nwosu?

    Uche Nwosu bụbụ aka nri aka na-achị Imo bụ Rochas Okorocha, ma bụrụkwa ọgo ya nwoke. Ọ rụkwara ọrụ ka Kọmịsọna na-ahụ maka ala site afọ 2013 ruo 2015. Ọ nọ bụ All Progressives Congress (APC).

    Ọ na-azọ ọkwa gọvanọ n’okpuru Action Alliance (AA).

    #BBCGovDebate, #BBCIgboDebate

  7. Onye bụ Hope Uzodimma?, Ihe ikwesiri ịma maka Hope Uzodimma.

    Hope Uzodinma na-zọ ọkwa dịka gọvanọ Imo steeti n’okpuru pati nọ n’ochichị bụ All Progressives Congress (APC). Ọ bụ onye omeiwu na-anọchịte anya mpaghara Ọrlụ. Ọ nọbu na pati na-anọghị n’ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP).

    #BBCGovDebate, #BBCIgboDebate

  8. Mmadụ anọ na-azọ oche gọvanọ n'Imo steeti ga-ezute taa n’Owere

    Nrụrịtaụka nke BBC haziri maka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ jisike aga n'ihu ugbua. Ọ ga-akpọtụ taa n'Owere.

    Ndi ga-apụta bụ Hope Uzodimma, Uche Nwosu, Ifeanyi Ararume na Emeka Ihedioha.

    Ihe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a ga-akpa maka ya bụ mwulite ọchịchị bara uru.

    #BBCGovDebate, #BBCIgboDebate

  9. Unu asaala chi?

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ nrụrịtaụka a taa.

    Ụgbọ anyị nọ n'Owere taa ebe BBC Igbo na-ahazị nrụrịtaụka maka ndọrọndọrọ ọchịchị gọvanọ Imo steeti.

    #BBCGovDebate #BBCIgboDebate