Ihe ndị chọrọ Biafra na-azọ, Maazị Ifeanyichukwu Okonkwo na-akpa nkata ugbua maka ihe ndị chọrọ Biafra na-azọ.
Sonye anyị na Facebook ebe anyị na Maazị Okonkwo na-akpa nkata maka ihe ndị Biafra chọrọ.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ka o si aga n'ihe gbasara ncheta Biafra na Naijiria na ụwa gburugburu taa bụ Mee 30, nke afọ 2018.
Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Chimamaka Ihenacho and Chioma Obianinwa
Sonye anyị na Facebook ebe anyị na Maazị Okonkwo na-akpa nkata maka ihe ndị Biafra chọrọ.
Ebe a bụ ụzọ Ogui dị n'Enugwu. Ndị ahịa niile kpọchịrị ụlọ ahịa ha iji rube isi na ya bụ #sitathome ndị Ipob hibere.
Ụgbọala na-agagharịkwa mana o rughị etu ọ na-adị mgbe ihe niile zuru oke.
Ndị na-akwado Biafra gbakọrọ n'isi obodo Italy bụ Rome, ebe ha na-eme emume ncheta Biafra. Ha bucha ọkọlọtọ Biafra ma na-ekwu na ha ejighị ọgụ bịa.
Paul Achalla so na ndị isi ndị na-akwado Ipob na mba Briten na-enwe aṅụrị na ndị mmadụ gere ntị ma nọrọ n'ụlọ taa.
Ọ katọrọ ndị isi ndị Igbo ma kwuo na "Ebe niile gbachiri agbachi na mpaghara ọwụwa-anyanwụ."
Ezema Sunday C Donald kwuru "Chineke nna biko kwụghachị ndi ọjọọ niile gburu ndị Biafra ụgwọ dịka ọlụ ha si dị"
Adimchinobi Onyegbuchulam kwuru "E chetere m etu ndị ji ọtụtụ ngwa agha na ndị obu agha dị iche iche si megide mmadu ole na ole ndị gba aka na-acho inweta ihe ruru ha na-ịchekwa ndụ ha."
Chinedu Eze kwuru "ihe m chetara maka BIAFRA bụ maka ogbugbu e gburu ndị IGBO na mgbe agha nkpochapu ndị IGBO n'eluwa site n'aka ndi Naijirịa. Ihe mmegide niile e mere ndị IGBO n'ihi na ha chọrọ ịza aha nna ha. Ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka ndị IGBO nile kwado achụmnta nwereonwe BIAFRA dịka obodo nke anyị."
E nwere ọtụtụ otu ndị na-akwado Biafra, mana ndị kacha pụta ihe bụ Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra (MASSOB), Indigenous People of Biafra (IPOB) na Zionist Movement.
Nnamdị Kanụ bụ onye ndu ndị IPOB, ebe Ralph Uwazuruike bụ onye a chụpụrụ na MASSOB gara hibe otu Biafra Independent Movement (BIM).
Ọkọlọtọ Biafra na-acha ọbara ọbara, akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ nakwa oji, ma nwee eserese ọwụwa-anyanwụ.
Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu bụ onye kpọrọ ala mpaghara ọwụwa-anyanwụ 'Biafra' n'afọ 1967.