Aka akparala agadi nwoke, ndị ọzọ maka mgbere ọgwụ ike

Nchịkọta akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile n'ọnwa Sepụtemba 2023.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Adline Okere, Jessica Nwankwo, Chukwunaeme Obiejesi, Chimezie UcheAgbo and Chioma Nkemdilim Daramola

  1. O nweghi mgbe anyị nyere mba Russia ngwa agha – Mba South Afrịka

    Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ekwuola na nyocha e mere gosiri na onweghi ihe akaebe gosiri na ha nyere mba Russia ngwa agha.

    Ndị nyocha ahụ jụrụ ịnabata ebubo ahụ nke onye nnọchiteanya mba Amerịka na Saụt Afrịka boro na e bujuru ngwa agha n’ime ụgbọmmiri Russia bịara na ‘Cape town’ n’ọnwa Disemba gara aga.

    Ebubo a emeela ka a na-ele mba Saụt Afrịka anya dị aṅaa maka ebe ha kwụụ n’ọgụ dị n’etiti Russia na Ukraine.

    Ramaphosa kwuru na ebubo ahụ emebiela ugwu na akụnaụba mba ha.

    “Ndị nyocha a chọpụtara na onweghi ike akaebe kwadoro ebubo na e bujuru ngwa agha n’ime ụgbọmmiri si Saụt Afrịka gawa na Russia,” dịka o kwuru na mgbasaozi TV na Sọnde.

    “O nweghi akwụkwọ ikike ọbụla gosiri na e bupuru ngwa agha, onweghi ngwa agha e bupuru.”

    Kama nyocha ahụ gosiri na e bubatara ngwa agha site na Russia bịa Saut Afrịka bụ nke ha tụrụ ahịa ya n’afọ 2018.

    Onye nnọchiteanya mba Amerịka bụ Reuben Brigety gwara ndị ntaakụkọ na ụgbọmmiri a kpọrọ Lady R bupuru ngwa agha n’ụbọchị isii na asatọ nke ọnwa Disemba.

    N’ime otu ụbọchị garachara minista mba ndị ọzọ na Saụt Afrịka kwuru na Brigety arịọla mgbaghara maka ihe o kwuru.

    Kamgbe ọgụ malitere n’etiti Russia na Ukraine, mba Saụt Afrịka na-agba mbọ ịhụ na ọgụ ahụ agaghị emetụta mmekọ ha na mba Russia, nke a emeela ka mba Amerịka na ndị ọzọ na-akatọ ha.

  2. Onyeisiala Tinubu ga-aga mba India maka ọgbakọ G-20

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ga-eme njem gaa obodo New Delhi nke mba India n’ụbọchị Mọnde maka ọgbakọ ndị ndu otu G-20 nke a kpọrọ “Otu Ụwa-Otu Ezinaụlọ-Ofu ọdịnihu”.

    N’akwụkwọ ozi onye ndụmọdụ ya bụ Ajuri Ngelale wepụtara n’ụbọchị na Sọnde kwuru na ọ bụ Narendra Moli, praịm minista mba India kpọrọ Tinubu oku n’ụzọ pụrụiche.

    “N’akụkọ ọgbakọ ahụ, Tinubu ga-agbasa ozi n’ọgbakọ ndị Naịjirịa na India na-azụ ahịa ga-eme.”

    Ndị ga-abịa ọgbakọ a pụrụiche bụ ndị a ma ama na-azụ ahịa n’India nakwa Naịjirịa, tinyere ndị ọrụ gọọmentị Naịjirịa nakwa India.

    “Onyeisiala Tinubu chọrọ iji ohere ahụ adọta ndị mba ofesi na-arụpụta ihe dị iche iche ka ha bịa Naịjirịa tinye anya n’ihiwe ụlọọrụ iji wulite akụnaụba Naịjirịa ma nye ndị mmadụ ọrụ.”

    Ndị ga-eso Tinubu mee njem ahụ gụnyere; minista na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Yusuf Tuggar, minista na-ahụ maka akụnaụba bụ Wale Edun, minista nziriteozi na tekịnụzụ bụ Bosun Tijani nakwa na-ahụ maka azụmaahịa bụ Doris Uzoka-Anite.

  3. Igbo ndị ọma daalụ nụ ooo!

    Anyị ji ekele ọma anabata unu n'izuụka ọhụrụ a, na-asị ka ọ dịrị unu na mma.

    Biko bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ a maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

    Ndewo.

  4. Ụlọ adagbuola ụmụaka anọ bụ ụmụnne n'Enugwu

    ụlọ dara n'ebe ọzọ abụghị Enugwu
    Nkọwa foto, ụlọ dara n'ebe ọzọ abụghị Enugwu

    Onyeisioche ECTDA n'Enugwu bụ Uche Anya ekwuola na ụmụaka anọ anwụọla n'ụlọ dara n'ebe akpọrọ Agric Quarters, Mgbemena dị na Coal Camp dị na steeti ahụ.

    Anya gwara ụlọntaakụkọ NAN nke a dịka o legharịchara anya n'ebe ọdachi ahụ mere.

    O kwukwara na ụlọ ahụ dara na mgbede ụbọchị Fraịde dịka mmiri zochara.

    Anya kwukwara na ebe ahụ bụ ụlọ amapụtara iji zụ anụmanụ mana atụgharịrị ya ka ọ bụrụ ụlọ nwere imeụlọ 44 ebe ihe ruru mmadụ narị abụọ bi.

    "Ndị mmadụ kwesighi ibi n'ụlọ ahụ chaachaa. Gaa ebe ahụ ka ị hụ"

    "..o wutere m na ndị nwụrụ n'ihe a bụ ụmụaka aka ha dị ọcha" ka o kwuru.

  5. Gọọmentị Kaduna Steeti enyela mmadụ 7000 ọrụ dịka ndị nche iji wulite nchekwa

    Gọvanọ Uba Sani nke Kaduna steeti na ndị ọrụ nche ọhụrụ o were n'ọrụ

    Ebe foto si, Gọọmentị Kaduna Steeti

    Nkọwa foto, Gọvanọ Uba Sani nke Kaduna steeti na ndị ọrụ nche ọhụrụ o were n'ọrụ

    Gọọmentị Kaduna Steeti enyela ndị ntorobịa ọnụọgụgụ ha ruru 7000 ọrụ dịka ndị nche na steeti ahụ iji nyere ndị ọrụ nchekwa nke gọọmentị etiti aka wulite ọnọdụ nchekwa steeti ahụ.

    N'emume ọzụzụ ndị nche a n'ụlọakwụkwọ ebe a na-azụ ndị uweojii na Kaduna n'ụbọchị Satọde, Septemba 2, Gọvanọ Uba Sani nke Kaduna Steeti kwuru na ọchịchị ya ga-eme ihe niile o nwereike iji buso ndị ekperima na ndị ntọrị mmadụ agha na steeti ahụ.

    Sani kwuru na ndị ahụ e were n'ọrụ dịka ndị nche si n'okpuru ọchịchị 23 e nwere na Kaduna Steeti, dịka ọ sị na a ga-eziga ha n'ime obodo dị icheiche iji nye aka na nchekwa.

    O kwukwara na ọ bụghị naanị atụmatụ iji wulite nchekwa kama ọ bụkwa ụzọ iji nye ndị ntorobịa ọrụ na Kaduna steeti.

    Kaduna so na steeti dị na mpaghara Ọdịda-Ugwu nke Naịjirịa ebe nsogbu ndị ekperima a kpọrọ 'bandit' kacha enye nsogbu.Steeti ndị ọzọ gụnyere Katsina na Zamfara, na ndị ọzọ.

  6. PDP emeriela ntuliaka n'okpuru ọchịchị niile nke Edo Steeti - Lee mpụtara ha

    Godwin Obaseki na-atụ vootu

    Ebe foto si, GovernorObaseki/X

    Nkọwa foto, Gọvanọ Edo Steeti bụ Godwin Obaseki dịka ọ tụchara vootu n'okpuru ọchịchị ya bụ Oredo n'ụbọchị Satọde, Septemba 2

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party emeriela ntuliaka ọkwa onyeisioche n'okpuru ọchịchị niile dị n'Edo Steeti.

    N'ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị abụọ nke ọnwa Septemba ka ụlọọrụ nhazi ntuliaka nke Edo Steeti haziri ntuliaka a iji họpụta ndị ga-elekọta okpuru ọchịchị 18 dị na steeti ahụ.

    Pati ndị ọzọ so zọọ ndọrọndọrọ a gụnyere 'All Progressives Congress' (APC), Labour Party (LP) na ndị ọzọ.

    Lee etu ụlọọrụ Edo State Independent Electoral Commission (EDSIEC) si kpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ:

    Ovia South West

    APC: 5361

    LP: 3216

    PDP: 10,721 - Edosa Enowoghomwenma meriri

    Uhunmwode

    APC: 2317

    LP: 1436

    PDP: 15,615 - Adodo O. Kenneth meriri

    Owan West

    APC: 3825

    LP: 2365

    PDP: 13, 171 - Ahonsi Dickson Idojemu meriri

    Akoko Edo

    APC: 5369

    LP: 2083

    PDP: 21,417 - Tajudeen Alade Suleiman meriri

    Etsako East

    APC: 4076

    LP: 1711

    PDP: 16, 428 - Ato Benedicta

    Etsako Central

    APC: 7, 896

    LP: 4, 606

    PDP: 30, 594 - Obomigie Imokhae Solomon meriri

    Etsako West

    APC: 29, 445

    LP: 23, 832

    PDP: 98, 046 - Zimbiril Marvelous meriri

    Ikpoba-Okha

    APC: 3, 085

    LP: 3, 857

    PDP: 27, 768 - Eric Iyoba Osayande meriri

    Ovia North East

    APC: 636

    LP: 617

    PDP: 4, 869 - Collins Osamede Ogbewe meriri

    Igueben

    APC: 557

    LP: 660

    PDP: 5, 262 - Asueleme Clement meriri

    Esan Central

    APC: 23, 885

    LP: 14, 331

    PDP: 47, 771 - Iyoha Paul meriri

    Esan North East

    APC: 5550

    LP: 3298

    PDP: 20, 702 - Inegbe Paul

    Esan South East

    APC: 1344

    LP: 791

    PDP: 16072 - Imadegbeho Luis meriri

    Esan West

    APC: 1, 665

    LP: 2, 183

    PDP: 11, 963 - Aigbogun O. Collins meriri

    Orhionmwon

    APC: 1616

    LP: 1737

    PDP: 14, 904 - Ugiagbe Newman Oghomwen meriri

    Owan East

    APC: 12, 203

    LP: 7695

    PDP: 35, 380 - Prince Aminu Kadiri meriri

    Egor

    APC: 8, 308

    LP: 10, 188

    PDP: 70, 293 - Eghe Ogbemudia meriri

    Oredo

    APC: 2519

    LP: 2536

    PDP: 16077 - Obaseki Tom Osazee meriri

  7. Ndị 'bandit' awakpola ụlọekpere ndị alakụba na Kaduna gbuo mmadụ asaa

    Ndị ojiegbe

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ekperima 'bandit' wakporo otu ụlọ ekpere ndị alakụba n'obodo Saya-Saya dị n'okpuru ọchịchị Ikara nke Kaduna Steeti na mgbede ụbọchị Satọde, gbuo mmadụ asaa.

    Akụkọ kwuru na mwakpo a mere oge ndị mmadụ gbakọrọ ikpe ekpere mgbede a na-akpọ Isha'i.

    Mmadụ ise, nke gụnyere otu onye nche, ka a gbagburu ebe ha na-ekpe ekpere, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ndị ekperima ahụ gbagburu n'ime obodo.

    Otu onye okenye n'obodo ahụ bụ Abdulrahman Yusuf gwara ndị ntaakụkọ Punch na ọ bụ onye isi ndị nche obodo ahụ ka a gbagburu.

    "Anyị na-eche na ọ bụ onyeisi ndị nche ahụ ka ha chọrọ bịa. Anyị nọ n'ime 'mosque' na-ekpe ekpere oge ha bịara malite ịkwa mgbọ. Ha gbagburu mmadụ ise n'ime 'mosque', gbukwaa otu onye ọkwọ ụgbọala butere ihe oriri n'obodo. Onye nke ọzọ ha gbagburu bụ n'obodo dị anyị nso," Yusuf kwuru.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kaduna Steeti bụ Mansir Alhassan, kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie, mana ndị uweojii amalitela ịbanye n'ime ọhịa dị icheiche iji chọta ma jide ndị mere ihe ahụ.

  8. France Must Go: Ndị mmadụ na mba Niger Republic chọrọ ka ndị agha France hapụ mba ha

    Ndị na-eme ngagharịwe na mba Nijie Repọblik

    Ebe foto si, AFP

    Puku kwuru puku ndị mmaọ̄ụ na mba Niger Republic' mere ngagharịiwe n'ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị nke abụọ nke ọnwa Septemba, ma kwuo na ha achọghịzi ndị agha mba France na mba ha.

    Cheta na ndị agha weghaara ọchịchị na Nijie Rịpọblik n'ọnwa Julaị gwara ndị agha mba Fransị nọ na mba ha nakwa onye nnọchite anya mba Fransị ka ha kwara laa, mana nke a emebeghị.

    Ndị a mere ngagharị iwe zukọrọ na nso ogige ebe ndị agha mba Fransị nọ, dịka ha jicha ọkọlọtọ e dere ihe dị icheiche nke tinyere: "Ndị agha Fransị hapụnụ mba anyị".

    N'ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgọst, ndị agha mba Nijie kwuru na ha akagbuola nkwekọrịta nchekwa dị n'etiti Fransị, mana gọọmentị Fransị sị na ha agaghị ege ha ntị n'ihi na ọchịchị ha enweghị ikike ziri ezi.

    N'otu aka ahụ kwa, ndị agha mba Nijie nyere onye nnọchiteanya mba Fransị na mba ha bụ Sylvain Itte iwu ka ọ hapụ ha n'ime abalị abụọ, mana ọ jụrụ ịhapụ, kama ọ nọgidere n'ụlọ nnochiteanya mba Fransị.

    Cheta na dịka ngalaba 22 nke iwu 'Vienna Convention on Diplomatic Relations' si dị, mba ọbụla enweghị ikike ịbanye n'ime ụlọ nnọchiteanya mba ọbụla dị na mba ha.

  9. Lee etu ụkọchukwu ụlọụka 'Redeem' si bụrụ Oba n'Ogbomoso, Oyo Steeti

    Olaoye

    Ebe foto si, RCCG JESUS HOUSE/YOUTUBE

    Ụkọchukwu Afolabi Ghandi Olaoye abụrụla onye eze ọdịnala n'obodo Ogbomoso dị n'Oyo Steeti na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa.

    Ọkwa eze a bụ 'Soun nke Ogbomoso' so na ndị eze ọdịnala a kacha akwanyere ugwu n'agbụrụ Yoruba.

    Ọ bụ gọvanọ Oyo Steeti bụ Seyi Makinde nyere nkwado maka nke a, site n'akwụkwọ ozi nke si n'aka Kọmishọna na-ahụ maka okpuru ọchịchị n'Oyo Steeti bụ Olusegun Olayiwola.

    Olayiwola kwuru na a họpụtara Olaoye dịka e sochara ọtụtụ usoro iwu wepụtara maka nhọpụta onye eze ọdịnala ọhụrụ.

    Ọ karịala afọ abụọ onye jibu ọkwa 'Soun nke Ogbomoso' bụ Jimoh Oladuni Oyewumi, ji nwụọ, dịka ọ chịrị ihe ruru afọ 48.

    Kamgbe ahụ, ọgbaaghara dapụtara n'etiti ezinụlọ eze maka onye ga-anọchi ya, nke kpatara o ji wee ogologo oge tupu a họpụta onye ọhụrụ.

    N'otu oge, Olaye kwuru na ya gwara onyeisi ụka ya bụ 'Redeemed Christian Church of God' bụ ụkọchukwu Enoch Adeboye na ya enweghị mmasị n'ọkwa eze ahụ, mana Adeboye gwara ya ka ọ ghara ịjụ ihe Chineke họpụtara ya ka ọ bụrụ.

    Onye bụ Ụkọchukwu Ghandi Olaoye?

    Ghandi Olaoye

    Ebe foto si, RCCG JESUS HOUSE/YOUTUBE

    • Tupu a họpụta ya dịka 'Soun nke Ogbomoso', Olaoye bụ ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka RCCG Jesus House dị na Washington DC na mba Amerịka
    • Ya na nwunye ya bụ ụkọchukwu Omo Olaoye mụrụ ụmụ nwaanyị abụọ
    • O nwetara ọzụzụ na ngalaba asụsụ bekee nakwa nlekọta ndị ọrụ, o nwekwara asambodo na ngalaba mmụta dị icheiche
    • Ọ bụbu onye oji ego achụ ego tupu e chie ya ụkọchukwu n'afọ 1992
    • Nna ya nwara ịbụ eze n'afọ 1940 mana o rughị ya aka, kama Olaoye ekwuola ugboro ugboro na ya enweghị mmasị ọbụla ịbụ eze. Mana dịka oge na-aga o kwuru na Chineke nyere ya ihe mkpughe banyere oche eze ahụ
    • Ụkọchukwu Olaoye abụrụla onye ndu ụka na mba atọ - Naịjirịa Jamanị na Amerịka
    • Oge a jụrụ ya etu ọ ga-esi jikwaa ọkwa ya dịka onye eze ọdịnala na ụkọchukwu, o kwuru sị: Ụkọchukwu bụ onye nche atụrụ. Eze ọdịnala, Mayor maọbụ gọvanọ - ha ncha bụcha ndị nche atụrụ. Mana anyị bụ ncị ụkọchukwu na-echekwa atụrụ bụ ndị ụka anyị, mana eze bụ onye nche atụrụ obodo niile. Ihe dị iche bụ na ọnụọgụgụ ndị ha na-elekọta."
  10. Onyeisiala Tinubu akpọghachila ndị nnọchiteanya Naịjirịa na mba ụwa niile

    Bola Ahmed Tinubu

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/X

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu enyela iwu ka ndị niile na-anọchite anya Naịjirịa na mba ụwa dị icheiche, nke bekee na-akpọ 'Ambassadors', lọghachi na Naịjirịa ngwangwa.

    Nke a dị n'akwụkwọ ozi nke Alkasim Abdulkadir, bụ ọnụ na-ekwuru Mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ, wepụtara n'ụbọchị Satọde.

    "Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Yusuf Maitama Tuggar ekwuola na Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu enyela iwu ma kpọghachi ndị niile na-anọchite anya NAịjirịa na mba dị icheiche. Ha nọ na mba ndị ahụ n'aha onyeisiala, onyeisiala nwekwara ikike ịkpọghachi ha na mba ọbụla ha nọ," akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

    Mana n'ozi ọzọ nke si n'aka ọnụ na-ekwuru onyeisiala Tinubu bụ Ajuri Ngelale o kwuru na "Ndị nnọchite anya Naịjirịa n'otu United Nations na New York nakwa Geneva esoghi na ndị onyeisiala kpọghachiri, n'ihi ọgbakọ United Nationa General Assembly, nke a ga-enwe n'ọnwa".

    Ngelale kwukwara na iwu ahụ onyeisiala nyere iji kpọghachi ndị 'ambassador' niile malitere ịdị ire ozugbo ozugbo.

    Cheta na onyeisiala Tinubu bu ụzọ nye iwu iji kpọghachi onye nnọchite anya Naịjirịa na mba United Kingdom bụ Sarafa Tunji Ishola, onye onyeisiala Muhammadu Buhari nyere ọkwa ahụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021.

    Tinubu nyere Ishola iwu ka ọ malite ịchịkọta ọrụ ya na mba UK ma dị njikere ịhapụ mba ahụ n'ime ụbọchị 60 ma lọghachi Naịjirịa, o tekata aka, n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba 2023.

  11. Nnọọ na Septemba

    Igbo ndị ọma, nnọọ n'ọnwa ọhụrụ Septemba.

    Ka ọnwa 'ember' nke anyị banyere wetara anyị niile ihe ọma.

    N'ebe a ka ị ga-ahụ isi akụkọ niile dị mkpa na mba ụwa niile maka ọnwa a.

    Ka anyị malite n'uju.