O nweghi mgbe anyị nyere mba Russia ngwa agha – Mba South Afrịka

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa ekwuola na nyocha e mere gosiri na onweghi ihe akaebe gosiri na ha nyere mba Russia ngwa agha.
Ndị nyocha ahụ jụrụ ịnabata ebubo ahụ nke onye nnọchiteanya mba Amerịka na Saụt Afrịka boro na e bujuru ngwa agha n’ime ụgbọmmiri Russia bịara na ‘Cape town’ n’ọnwa Disemba gara aga.
Ebubo a emeela ka a na-ele mba Saụt Afrịka anya dị aṅaa maka ebe ha kwụụ n’ọgụ dị n’etiti Russia na Ukraine.
Ramaphosa kwuru na ebubo ahụ emebiela ugwu na akụnaụba mba ha.
“Ndị nyocha a chọpụtara na onweghi ike akaebe kwadoro ebubo na e bujuru ngwa agha n’ime ụgbọmmiri si Saụt Afrịka gawa na Russia,” dịka o kwuru na mgbasaozi TV na Sọnde.
“O nweghi akwụkwọ ikike ọbụla gosiri na e bupuru ngwa agha, onweghi ngwa agha e bupuru.”
Kama nyocha ahụ gosiri na e bubatara ngwa agha site na Russia bịa Saut Afrịka bụ nke ha tụrụ ahịa ya n’afọ 2018.
Onye nnọchiteanya mba Amerịka bụ Reuben Brigety gwara ndị ntaakụkọ na ụgbọmmiri a kpọrọ Lady R bupuru ngwa agha n’ụbọchị isii na asatọ nke ọnwa Disemba.
N’ime otu ụbọchị garachara minista mba ndị ọzọ na Saụt Afrịka kwuru na Brigety arịọla mgbaghara maka ihe o kwuru.
Kamgbe ọgụ malitere n’etiti Russia na Ukraine, mba Saụt Afrịka na-agba mbọ ịhụ na ọgụ ahụ agaghị emetụta mmekọ ha na mba Russia, nke a emeela ka mba Amerịka na ndị ọzọ na-akatọ ha.









