Agha Ukraine: Onye enyemaka Zelensky na-ekwu na ihe ruru mmadụ 13,000 anwụọla

Nke so agha malitere n'Ukraine kemgbe Febụwarị mgbe ndị agha Russia malitere iwakpo ha.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Alex Pereira anapụla Israel Adesanya ugo ọkaibe UFC championship

    Alex Pereira na Israel Adesanya

    Ebe foto si, Get

    Alex Pereira nke Brazil akụnyela Israel Adesanya ụkwụ ọmajiji were nweta mmeri n’asọmpi ọkpọ 'UFC middleweight Championship' ha sọrọ n’abalị Satode na New York, mba Amerịka.

    Pereira, onye sọnyerela na nani ọgụ ise na UFC bụrụụ ọkaibe dịka ọ napụrụ Adesanya ihe o ji ama mma kemgbe afọ atọ Adesanya chị ọgbọ dịka ọkaibe UFC.

    Israel gbaliri n' agba nke mbụ rue atọ n'asọmpi ahụ mana ọ sọwara ngọngọ n’agba nke anọ dịka Pereira ji ọkpọ e-cheta-e-bewe kụwaa ya agba nke mere ka ogbuasọmpi gbubie ọgụ ahu.

    Onye bụdị Israel Adesanya?

    A mụrụ Adesanya na Legọs.

    O bụkwa onye nwere ikike nwaamala mba New Zealand bụ ebe o toro.

    Adesanya enwetala nzere dị icheiche n' ịkpụ ọkpọ.

    Ọ ma eme Taekwando,ịgba egwu nakwa nka egwurewu ndị ọzọ.

  2. Ndewoonụ!

    Igbo ndị ọma, ndewoonụ!

    Nke onye chiri, ya zere!

  3. Ihe Inec kwuru maka okwu nnyocha Bola Tinubu n'ihi ebubo ibu ọgwụike

    Inec ekwuola na ọ bụ akụkọ ụgha.

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Inec/Facebook

    Ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ezipụtala ozi ma kwuo na ha akụkọ na-ekwu na ha na-enyocha Bola Tinubu maka ebubo ibu ọgwụike na mba Amerịka bụ ụgha.

    N’ozi a, Inec gọpụ onwe ha n’okwu otu akwụkwọ ozi na-efegharị na soshal midia kemgbe abalị Fraịdee kwuru, nke sị na ha amalite nnyocha aha Bola Ahmed Tinubu onye ji ọkọlọtọ All Progressives Congress (APC) azọ ọkwa onyeisiala 2023.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    N’ozi ọhụrụ sị n’aka Inec pụta na mgbede Satọdee a, ọnụ na-ekwuru ha bụ Festus Okoyo gwara ọha na ya bụ akwụkwọ ozi na-efegharị bụ akụkọ ụgha ma kọwa na ọ bụ ndị na-achọ ibute nsogbu bụ ndị bipụtara ya bụ akwụkwọ ozi.

    Ha gara n’ihu gwaa ọha na ọ bụ na naanị ọba ozi websaịti ha nakwa soshal midia ha bụ ebe ha si ezipụta ozi.

    Akwụkwọ ozi ụgha a nke nyiri ozi si n’aka Inec kwuru na n’ihi akụkọ malitere iwu ọzọ n’izu nke na-ekwu na Bola Tinubu hapụrụ mba Amerịka ụfọdụ ego ya n’ihi ebubo mpụ nakwa ibu ọgwụike nọ n’isi ya ebe ahụ na ha bụ ndị Inec amalite nnyocha n’isi ya.

    Dịka Inec siri kwuo, ozi a apụtaghị n’ọba ozi ha ọbụla ma ncha.

    Inec ekwuola na ozi nọ n'akwụkwọ a bụ akụkọ ụgha gbara ọkpụrụkpụ

    Ebe foto si, Screenshot

    Nkọwa foto, Inec ekwuola na ozi nọ n'akwụkwọ a bụ akụkọ ụgha gbara ọkpụrụkpụ
  4. Ọnụ ejola ndị Ukraine ọnụ dịka ndị agha Russia si obodo Kherson pụọ

    Anụrị na-akpọtụ n'Ukraine ugbua

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Anụrị na-akpọtụ n'Ukraine ugbua

    Ọṅụ ka na-akpọtụ n’obodo Kherson nke mba Ukraine dịka ndị agha Russia weghara ọchịchị ebe ahụ kemgbe agha ha malitere e sila ebe ahụ pụọ.

    Ndị isi ọchịchị n’Ukraine, Amerịka, nakwa Briten ezipụtala ozi na-eto ndị agha mba Ukraine maka etu ha siri nweta mmeri n’obodo ahụ.

    Ndịagha Russia pụrụ obodo ahụ n’ụbọchị Fraịdee.

    A na-atụ anya na Russia nwereike imalite mwakpo ọhụrụ n’akụkụ Ukraine ka ha pụrụ obodo Kherson.

    Cheta na Russia mere mwakpo ha ji bọọ ọbọ dịka ndịagha Ukraine weghara ọchịchị ọzọ n’ụfọdụ obodo mba ha gụnyere, Kyiv bụ isi obodo mba ha.

    N’akụkụ mba Ukraine dị icheiche, ọkọlọtọ mba ha bụ ihe a na-ahụ n'ebe niile, dịka igwe mmadụ na-agbakọ ma na-abụ abụ mmeri na abụ aṅụrị iji gosi ka obi dị ha maka nke a.

    E wezụga ụkọ mmiri, Kherson enweghị ihe ndị ọzọ dị mkpa e ji ebe ndụ dịka ọgwụ, achịcha na nri ndị ọzọ, mana ihe enyemaka amalitla ibata ebe ahụ site n’obodo Mykolaiv dị nso Khersib, dịka otu onye enyemaka onyeisi obodo ahụ si kwuo kwuru.

    Roman Golovnya kọwara na enweghị ọkụ latrịk ebe ahụ egbochila ndị na-eme achịcha atụmatụ ime ya bụ ihe. O boro ndị ọchịchị Russiaa ebubo na ha mere ka ndị bi n’obodo ahụ nọrọ n’oke ahụhụ.

    Ka ọ dị ugbua, Russia emeela obodo dị nso ọdụ ụgbọ mmiri Ukraine bụ obodo Henichesk dịka ebe isi ọrụ ndị agha ha nwa mgbe nta bụ ebe ha hibere maka atụmatụ ndị metụtara mpaghara Kherson.

    Obodo Henichesk a dị na ndịda ọwụwa anyanwụ Ukraine.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Ndị mba Ukraine apụtala n'igwe na-enwe aṅụrị maka ọpụpụ ndị agha Russia na Kherson.

    Ebe foto si, Getty Images

  5. Etu ndịagha Naịjirịa siri sụọ ndị ojigbe akwụ n’Isuofia, Anambra

    Ndị agha Naịjirịa na-agba mbọ idaju ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na-arị elu n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị agha Naịjirịa na-agba mbọ idaju ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na-arị elu n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche.

    Ndị agha Naịjirịa meminara ụfọdụ ndị ojiegbe wakporo ha n’akụkụ okporoụzọ Afor-Uzo nke Isuofia dị n’Anambra steeti.

    Dịka ozi si n’aka Kọmịshọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Paul Nwosu siri kwuo, ya bụ ndị ojiegbe pụtara wakpoo ndị agha Naịjirịa n’akụkụ ụzọ ebe ha na-anọ arụ ọrụ nchekwa ha n’ụtụtụ Satọdee a bụ ụbọchị 12 nke ọnwa Nọvemba.

    Ihe a mere kpọm kwem n'Umuona nke Isuofia dị n'okpuruọchịchị Aguata.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gbara ama na ndịagha zutere ndị ojiegbe ahụ ma sụọ ha akwụ dịka ozi ya kọwara na mmadụ ise n'ime ha nwụrụ

    Ozi Nwosu kọwakwara na ndị agha na ndị ojiegbe ahụ kwakọrịtara mgbọ aghara aghara ebe ahụ tupu ndị agha ememina ụfọdụ n’ime ha.

    Ọ gara n’ihu gbaa ama na a napụrụ ndị ojiegbe ụgbọala ha bu pụta ime ya bụ mwakpo.

    Cheta na Anambra steeti so n'akụkụ steeti ndị ọwụwa anyanwụ ebe ọtụtụ otu ndị ojiegbe na-akpa ike kemgbe afọ ole m ole.

    Ọnọdụ enweghị ezi nchekwa riri oke elu n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche na nso nso a gụnkwara akụkụ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

    Otu ndị ojiegbe ndị a na-akpa na-awakpo ndị mmadụ, na-atọrọ ndị mmadụ, na-awakpo ụlọọrụ gọọmentị dị ịche iche, ndị ọrụ gọọmentị, ndị agha Naịjirịa, ndị uweojii Naịjirịa nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ.

    Gọọmentị Anambra steeti nke gọvanọ Chukwuma Soludo na-achị ekwuola ugboro ugboro ma gosikwa na ha na-agba mbọ ịhụ na-adajụrụ ọnọdụ enweghị nchekwa a kemgbe mana ụfọdụ ndị otu a ka na-egosikwa ike ha na steeti ahụ.

  6. Aka m adịghị n’ọgbaghara dị n'etiti PDP na ndị Gọvanọ G5

    Goodluck Jonathan

    Ebe foto si, Goodluck Jonathan

    Goodluck Jonathan bụbu Onyeisiala Naịjirịa akatọọla akụkọ na-ekwu na ndị Gọvanọ Peoples Democratic Party (PDP) ise a kpọrọ G5 na-ebuso agha maka ọdị mma ya.

    N’akwụkwọ ozi onye ndụmọdụ ya bụ Ikechukwu Eze wepụtara, Jonathan rịọrọ ka ngalaba ndị a iwe na-ewe mịnye mma ha n’ọbọ maka ntuliaka na-abịa n’afọ 2023.

    Cheta na nso nso a ndị Gọvanọ PDP ise gụnyere Nyesom Wike, Okezie Ikpeazu, Seyi Makinde, Samuel Ortom na Ifeanyi Ugwuanyi chọrọ ka onyeisi pati ha bụ Iyorchia Ayu rituo n’ọkwa ka ha nwee ike kwadoo Atiku Abubakar n’ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ọ na-azọ.

    Ndị Gọvanọ ise nke PDP (G5)

    Ebe foto si, Nyesom Wike/Facebook

    N'okwu ya “Anyị nụrụ akụkọ ụgha na-efegharị nke kwuru na ọ bụ Onyeisiala Jonathan na-ebute nsogbu dị na PDP ugbua, na ọ na-akwanye Gọvanọ Nyesom Wike, Makinde, Ikpeazu, Ugwuanyi nakwa Ortom ka ha na-eme etu ha si ene.”

    “Jonathan achịchaala, ihe chere ya n’ihu bụ ịrụ ọrụ dịka okenye obodo ma mee ka udo dị na mba Afrịka niile.

    “Ọ ga-ara ahụ mmadụ inwete ihe ọ na-achọ ma ọ bụrụ iji ụzọ ịkatọ ndị mmadụ ka o ji achụ ya.”

  7. Ukraine werekwala obodo Kherson site n'aka mba Russia

    Ụmụaka Ukraine na-enwe obi aṅụrị

    Ebe foto si, Reuters

    Ndịagha mba Ukraine alọghachịla n’obodo Kherson dị na mba ha dịka ndịagha mba Russia kwakọọrọ ngwongwo ha si ebe ahụ pụọ.

    Obodo Kherson so n’otu n’ime obodo gbapụtara ihe na Ukraine bụ nke mba Russia kpachiburu n’agha.

    Minista ha na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Dmytro Kuleba kwuru na nweghara obodo Kherson site n'aka ndị Russia gosiri na ha na-agba ọsọ ụkwụ erughi ala ugbua, na a ga-emeri ha.

    "Nke a bụ agha ọzọ anyị meriri. Achọrọ ka i cheta na kamgbe agha a bidoro, anyị emeriela na Kyiv, chụpụ Russia na mpaghara 'North-east', Kharkive, ugbua anyị emeriela na Kherson."

    Nwata ji ọkọlọtọ Ukraine

    Ebe foto si, Reuters

    Obi juputara ọtụtụ ụmụafọ mba Ukraine n'aṅụrị dịka ha na-anabata ndịagha n'obodo Kherson, Ihe onyonyo gosiri ebe ha na-efe ọkọlọtọ mha ha.

    Onyeisiala mba Ukraine Volodymir Zelensky kọwara ụbọchị dịka "a ga-akọ n'akụkọ", ebe mba Amerịka jara Ukraine ike maka ịna-apụta Kherson site n'aka ndị Russia.

    Russia sị na ha ezigala ndịagha dị puku iri atọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dị nso na mmiri Dnipro, tinyere ngwagha ruru puku ise nakwa ihe ndị ọzọ.

  8. Ikechi Emenike vs Uche Ogah: Onye ga-efe ọkọlọtọ APC na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Abia Steeti?

    Ikechi Emenike na Uche Ogah

    Ebe foto si, Ikechi Emenike/Uche Ogah

    Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja anapụla Ikechi Emenike ikike iji ọkọlọtọ APC azọkwa Gọvanọ Abia Steeti ma were ya nye Uchechukwu Ogah.

    Ọkaikpe Binta Nyako kwuru na ụlọọrụ Inec nọ mgbe e mere ntuliaka ime ụlọ nyere Ogah mmeri n’ọnwa Maachi.

    Ọ kagburu ikike e nyere Ikechi Emenike n’iji aha APC azọ ọkwa ahụ bụ nke ụlọọrụ nabataburu.

    Uche Ogah gbara mmadụ ise gụnyere Ikechi Emenike,APC, Abdullahi Adamu bụ onyeisi APC, ụlọọrụ Inec nakwa Daniel Eke akwụkwọ n’ụlọikpe nke akara ya bụ FHC/ABJ/CS/95/2022 n’ụlọikpe.

    Ọ rịọrọ ụlọikpe ka o kwuo na ntuliaka imeụlọ ‘direct primary’ nke pati ya bụ APC mere, nke ụlọọrụ Inec nọkwa mgbe e mere ya bụ nke ezi ya.

    Ọ gwakwara ụlọikpe ka o nye pati APC iwu ka ha ziga aha ya n’ụlọọrụ Inec dịka onye ji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa Gọvanọ n’Abia Steetị.

    N’ikpe ahụ, ọkaikpe Nyako kagburu ntuliaka ime ụlọ ‘indirect primary’ nke kpọpụtaburu aha Ikechi Emenike.

    Na nzaghachị, ọkaiwu pati APC bụ Vigilus Nwankwo kwuru na Ụlọikpe Mkpegharị adịla mbụ kwuo na ọ bụ Ikechi Emenike ji aha APC azọ ọkwa.

    Ya mere na ụlọikpe Ukwu agaghị akagbunwu ikpe Ụlọikpe Mkpegharị kpere.

    N'ụbọchi 14 Ọktoba, 2022 ka Ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja kwadoro ihe Ụlọikpe Ukwu dị n'Umuahịa kwuru nke sị na ọ bụ Ikechi Emenike ga-efe ọkọlọtọ APC na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Abia Steeti.

  9. Igbo ndị ọma ndewonu

    Anyị na-anabata unu n'ọgbakọ anyị nke taa.

    Buru oche gị bịa n'ọnyere anyị taa.

  10. Etu otu nwoke onye ejije Bollywood siri nwụọ ebe ọ nọ na ‘gym’

    Siddhaanth Vir Surryavansh

    Ebe foto si, _siddhaanth_/Instagram

    Otu nwoke na-eme ejije na mba India a ma ama bụ Siddhaanth Vir Surryavansh anwụọla dịka akụkọ kwuru na obi koropuru ya ebe ọ nọ n’ụlọ megharịahụ.

    E kwuru na e bugara ya ụlọọgwụ Kokilaben Dhirubhai Ambani ebe a kpọchitere ya ndụ ruo nkeji 45 tupu ọ mechaa nwụọ.

    Onye ejije ibe ya bụ Aditya Deshmukh gbara ụlọọrụ ntaakụkọ ama ọnwụ Vir Surryavansh ETimes TV.

    Vir Surryavansh gbara afọ 46 emela ọtụtụ ejijie na Bollywood gụnyere Krishna Arjun, Kasautii Zindagii Kay, Virrudh, Bhagyavidhaata, Kya Dill Mein Hai nakwa ndị ọzọ.

    Ọ lụrụ nwaada na-agba egwu ma na-akwa akwa bụ Alesia Raut n’ọnwa Novemba 2017.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  11. Ụjọ na-atụ anyị maka ọnọdụ nchekwa ọjọọ na-arị elu na Naịjirịa - INEC

    Mahmood Yakubu

    Ebe foto si, Inec/Twitter

    Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola na ọnọdụ nchekwa ọjọọ nke na-agbali elu na Naịjirịa na-enye ha isi ọwụwa.

    Onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a n'ọgbakọ nke ha na ndị isi ọrụ nchekwa niile dị na Naịjirị nwere n'Abuja n'ụbọchị Fraịde.

    O kwuru na dịka ntuliaka 2023 na-eru nso, ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ n'ọtụtụ mpaghara Naịjirịa.

    "Anyị na-atụ egwu maka na ọ bụrụ na emeghị ihe ọbụla iji kwụsị nke a, mwakpo ga na-arị elu dịka ụbọchị ntuliaka na-eruwanye nso," Yakubu kwuru.

    "Ọ dị mkpa ka anyị gbasie mbọ ike kwụsị ọnọdụ nchekwa ọjọọ a ugbua."

    "Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ndị kacha nwee ọrụ ịhụ na ntuliaka gara n'udo. Anyị niile kwesịrị ịgba mbọ mee nke a. Naịjirịa na-ele anyị anya."

    Ndị isi agha Naịjirịa

    Ebe foto si, INEC/Twitter

    Nkọwa foto, Inec na ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa nwere ọgbakọ n'Abuja taa

    A ga-enwe ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa Febrụwarị afọ 2023 iji họpụta onye ga-anọchi Onyeisiala Muhammadu Buhari.

    Ka ọ dị ugbua, ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa, dịka ndị ọgụ nnupuisi Boko Haram nakwa ndị ekperima 'bandits' na-enye nsogbu na mpaghara Ugwu, ebe ntọrị mmadụ na iji egbe ezu ohi na-arị elu na mpaghara Ndịda.

    Ụlọọrụ Onyeisiala Naịjirịa ekwela nkwa na tupu Buhari arịtuo n'ọchịchị, ọnọdụ nchekwa ga-aka mma karịa etu ọ dị tupu o were ọchịchị.

  12. Unu abọọla chi?

    Ị na-akwado maka ngwụcha izuụka?

    Akụkọ dị mkpa metụtara gị ka anyị ka na-eweta taa.

    Jisike!

  13. Ụlọikpe akụchapụla mkpọrọ a tụrụ onyeisi EFCC bụ Abdulrasheed Bawa

    Abdulrasheed Bawa

    Ebe foto si, EFCC

    Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akụchapụla mkpọrọ a tụrụ onyeisi ụlọọrụ 'Economic and Financial Crimes Commission' bụ Abdulrasheed Bawa.

    Ọkaikpe Chizoba Oji nyere mkpebi a n'ụbọchị Tọzde, Nọvemba 10 2022, dịka ndị ndị EFCC wetara mkpesa iji gbaghaa mkpọrọ a tụrụ Bawa.

    Cheta na ọkaikpe Oji nyeburu iwu n'ụbọchị Tuzde, Nọvemba 8 2022, ka a tụkpuo Bawa n'ụlọ mkpọrọ dị na Kuje n'ihi na EFCC nupuru isi na mkpebi ụlọikpe nyere n'afọ 2018.

    Mkpebi ahụ bụ ka ndị EFCC nyeghachi otu nwoke ha boro ebubo nrụrụaka ụgbọala Range Rover ha naara ya nakwa ego dị nde naịra 40.

    Mana n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde, EFCC kọwaara ọkaikpe Chizoba Oji na ha erubela isi n'iwu ahụ n'ihi na ha enyeghachila nwoke ahụ ụgbọala ya, ma malitekwa usoro iji kwụghachi ya ego ahụ.

  14. Anyị agaghị alaghachi azụ n'atụmatụ mgbanwe akwụkwọ Naịra - Buhari

    Buhari na Emefiele

    Ebe foto si, Nigeria Government

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na onweghị ịlaghachi azụ dị n'atụmatụ nke ụlọakụ etiti wepụtara maka mgbanwe akwụkwọ naịra.

    Buhari kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ na London dịka ya na Eze Charles III nwechara obere ọgbakọ n'ụbọchị Wenezde.

    "Anyị agaghị alachi azụ," Buhari kwuru. "Ebumnuche m bụ ime ka ụmụ Naịjirịa mata na ọchịchị anyị na-akwanyere ha ugwu."

    "Anyị agaghị ahapụ ndị ide ego ka ha nwee ohere ha ga-eji were ego nakwa ndị ekperima na-eyi ndị mmadụ egwu n'oge ntuliaka. Nke a bụ ihe m chọrọ ka e jiri cheta ọchịchị m."

    Cheta na onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele kwuru na a ga-agbanwe akwụkwọ N200, N500, na N1000.

    Emefiele kwuru na ọ bụ n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Disemba ka onyeisiala Buhari ga-ewepụta akwụkwọ ego nke ọhụrụ bụ nke a ga-ejizi na-atụ mgbere ahịa na Naịjirịa.

    Akwụkwọ ego nke ochie ga-akwụsị ịdị ire ma ọ gachaa ụbọchị 31 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023.

  15. Anwụchiela nwata akwụkwọ mara Eze Charles na nwunye ya akwa na York

    Ndị uweojii ebe ha nwụchiri nwoke ahụ

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị uweojii mba Briten anwụchiela otu nwata akwụkwọ mara Eze Charles na nwunye ya akwa mgbe ha na-ekele ndị mmadụ n’obodo York.

    Nke a mere n'ụbọchị nke abụọ na njem nke Eze na nwunye ya bụ Camilla mere na Yorkshire bụ ebe ha sị gawa Doncaster.

    Ọ bụ mgbe ndị isi obodo ahụ na-anabata Eze na nwunye ya ka amalitere ịma ha akwa ma na-akwa ha emo.

    Charles gbachiri nkịtị na-ekele ndị pụtara ịnabata ha dịka akwa ndị ahụ na-agata n'akụkụ ebe ọ kwụ mana o nweghi nke metụrụ ya.

    Eze Charles gara York maka mkpughe akpụrakpụ mbụ nke nne ya bụ Ezenwaanyị Elizabeth nwụrụ anwụ.

  16. Unu abọọla chi ụmụ Igbo?

    Nnọọnụ na peeji anyị taa!

    Gbadokwa anya ebe a maka akụkọ ndị dị mkpa n'ọwụwa anyanwụ, na Naịjirịa nakwa na mba ụwa niile.

    Yagazie nu.

  17. Ụlọọrụ Meta, nwe Facebook, Instagram na Whatsapp, ga-achụ ndị ọrụ 11,000 n'ọrụ

    Meta

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ Meta ekwuola na ha ga-achụ pasentị 13 n'ime ndị ọrụ ha niile, n'ihi mgbatu ego na-abata ụlọọrụ ahụ.

    Mark Zuckerberg bụ onye nwe ụlọọrụ a kwupụtara nke a n'ụbọchị taa bụ Wenezde, Nọvemba 9, 2022.

    O kwuru na "nke a bụ mkpebi kacha si ike anyị na-eme kamgbe ụlọọrụ Meta malitere".

    Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ Twitter chụkwara ọtụtụ ndị ọrụ ya ọnụọgụgụ ha karịrị puku atọ.

    Zuckerberg kwuru na ha tụrụ anya na ego na-abatara ụlọọrụ ha ga-aga n'ihu na-agbali elu, dịka o si mee n'oge 'pandemic'.

    "Ọtụtụ ndị mmadụ tụrụ anya n'akụnụba ụlọọrụ anyị ga na-agbali, mụ onwe m chekwara na ọ ga-adị otu a," Zuckerberg kwuru.

    "Mana etu ọnọdụ akụnụba ụwa si gbatuo nakwa n'ihi ụlọọrụ ndị ọzọ anyị na ha na-asọ mpi, ego abataghịzi etu anyị si tụọ anya ya."

    "N'ezie, emehiere m, ọ bụ m ka o si n'aka."

    Zuckerberg kwuru na ụlọọrụ Meta ga-agbadozi anya ugbua na ngalaba na-ewetara ha nnukwu uto nakwa ọmụrụnwa, dịka 'Artificial Intelligence', mgbasaozi azụmahịa (advertising), nakwa 'metaverse'.

  18. Etu ndị ekperima si wakpo ụgbọala Atiku na Borno

    Atiku

    Ebe foto si, Channels

    Nkọwa foto, Otu n'ime ụgbọala ndị ekperima kuriti dịka Atiku gara ịchụnta vootu na Borno Steeti

    Akụkọ na-apụta ugbua na-ekwu na ndị ekperima wakporo otu n'ime ụgbọala Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'otu 'Peoples Democratic Party'.

    Nke a mere dịka ndị PDP nwere ọgbakọ achụmnta vootu na Borno Steeti taa bụ Wenezde, ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba 2022.

    Ụlọ ntaakụkọ Channels TV kwuru na ọ bụ oge Atiku na ndị nkwado ya gachara kelee onye ezeọdịnala a na-akpọ Shehu nke Borno na-apụta ka ndị ekperima a wakporo ụgbọala ha ma merụọ ụfọdụ ndị nkwado ya ahụ.

    Dịka ọnụ na-ekwuru Atiku bụ Dino Melaye si kwuo, mmadụ 174 merụrụ ahụ na mwakpo ahụ, ebe ndị ekperima ahụ mebikwara ọtụtụ ụgbọala.

    Oge ọ na-agwa ndị nkwado ya okwu, Atiku kwuru kasiri ndị ọgbaaghara ahụ metụtara obi ma kwuo na onweghị mmegide ọbụla ga-eme ka obi daa ha mba n'ịchụpụ pati 'All Progressives Congress' n'ọkwa onyeisiala Naịjirịa nakwa n'ụlọ gọọmentị nke Borno Steeti.

  19. Ụlọikpe enye iwu ka etinye onyeisi EFCC bụ Abdulrasheed Bawa na mkpọrọ

    Abdulrasheed Bawa

    Ebe foto si, EFCC

    Nkọwa foto, Onyeisi EFCC bụ Abdulrasheed Bawa

    Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka a tụọ Abdulrasheed Bawa, bụ onyeisi ngalaba na-egbochi nrụrụaka bụ 'Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), mkpọrọ n'ihi inupu isi na mkpebi ụlọikpe.

    Ọkaikpe Chizoba Orji nyere iwu a n'ụbọchị Tuzde, ma nyekwa onyeisi ndị uweojii iwu ka o mee nke a na-egbughi oge.

    Ọkaikpe ahụ kwuru na Abdulrasheed Bawa nupuru isi na mkpebi ụlọikpe nyere n'ụbọchị 21 nke ọnwa Nọvemba afọ 2018, nke kwuru ka EFCC nyeghachi otu nwoke aha ya bụ Adeniyi Ojuawo ụgbọala Range Rover nakwa ego dị nde naịra 40 ha naara ya.

    "Ebe ọ bụ na onyeisi ndị EFCC ma ama na-enupuru ụlọikpe isi, a ga-etinye ya n'ụlọmkpọrọ dị na Kuje n'ihi nnupuisi ya...ruo mgbe ọ ga-ewepu onwe ya na nnupuisi a," Ọkaikpe Chizoba Orji kwuru.

    "Onyeisi ndị uweojii ga-ahụ na e mezuru mkpebi a ụlọikpe nyere taa na-egbughị oge."

    Ndị EFCC kpụpụrụ Mazi Adeniyi Ojuawo n'ụlọikpe dị n'Abuja n'afọ 2016.

    Ha boro ya ebubo na ọ nara akaazụ n'aka otu onye aha ya bụ Hima Aboubakar onye na-arụ n'ụlọọrụ 'Societe D’Equipment Internationaux Nigeria Limited'.

    Akaazụ a gụnyere nde naịra 40 na otu ụgbọala Range Rover Sport (supercharged) nke ọnụahịa ya karịrị nde naịra N29.

    Mana n'ụbọchị 21 nke ọnwa Nọvemba afọ 2018 ka ọkaikpe kpebiri ikpe ahụ bụ Muawiyah Baba Idris kwuru na ikpe amaghị Ojuawo n'ihi na ndị EFCC egosighi ihe akaebe ọbụla iji kwado ebubo ha boro ya.

    Ọkaikpe ahụ gwakwara EFCC ka ha nyeghachi nwoke ahụ ego ha naara ya nakwa ụgbọala ya, mana ndị EFCC erubeghị isi na mkpebi ahụ ruo taa.

  20. Itinye asọmpi iko mba ụwa na mba Qatar bụ ndahie ụkwụ - Sepp Blatter

    Sepp Blatter

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Sepp Blatter bụ onyeisi Fifa n'afọ 2010 oge ekpebiri na ọ bụ Qatar ga-ahazi asọmpi iko mbaụwa nke 2022

    Aka chịburu otu Fifa bụ Sepp Blatter ekwuola na itinye asọmpi iko mba ụwa nke 2022 na mba Qatar bụ nnukwu ndahie ụkwụ.

    Blatter onye dị afọ 86 ugbua bụ onyeisi otu Fifa na 2010 oge e nyere mba Qatar ikike ịhazi iko mbaụwa nke afọ 2022.

    Mana mba Qatara anatala ọtụtụ nkatọ n'ọdị nso a gbasara etu ha si akpaso ndị mbịarambịara agwa, imegide ikike dịịrị mmadụ, nakwa ịkpa oke megide ndị LGBTQ.

    Na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Tages Anzeiger, Blatter kwuru na Qatar "bu obere mba" ịhazi asọmpi dịka iko mba ụwa.

    "Egwuregwu bọọlụ nakwa Asọmpi Iko mba ụwa karịrị Qatar nke ukwu.

    N'afọ 2010, ndị isi otu Fifa tụrụ vootu iji mara mba a ga-enye ikike ịhazi asọmpi Iko Mbaụwa nke 2022.

    N'ime mba Amerịka na mba Qatar, Qatar nwetara vootu iri na anọ ebe Amerịka nwetara vootu asatọ.

    Blatter kwuru na ya tụọrọ mba Amerịka vootu, mana ọ bụ onyeisi otu Uefa n'oge ahụ bụ Michel Platini na ndị otu ya mere Qatar ji merie.