Gọvanọ Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufia azaghachila ndị ọrụ oyibo steeti ahụ malitere ịgba abụbụ ọrụ kemgbe abalị ụka.
Ọ sị na ọnọdụ mere ha jiri chụọ ndị ọrụ na steeti ahụ agbanwebeghị maka abụbụ ọrụ ndị ọrụ na-agba gbasara mgbaokpuru ha sị na-agba akụnaụba Naịjria.
Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ steeti ahụ militere abụbụ ọrụ abali ise taa bụ Mọnde.
Onyeisi ndị Nigeria Labour Congress na steeti ahụ bụ Ayuba Magaji Sulaiman sị na ya bụ abụbụ ọrụ bụ iji dọọ gọọmentị steeti ahụ aka na ntị ka ha were kpochite ndị ọrụ ahụ ha chụrụ.
N'ụbọchị mbụ nke ya bụ abụbụ ọrụ, ndị otu a mere ngagharịiwe na gburugburu ebe ahụ ọkachasị n'ụlọ omeiwu steeti ahụ.
Ka ọ dị ugbua, ọkụ adịghị na ya bụ steeti nke mmanụ ụgbọala na-adị maka ya bụ abụbụ ọrụ ndị otu ha so agba.
Mgbe ikpeazụ ndị bi na ya bụ steeti hụrụ ọkụ na petrolu anya bụ na Satọde.
Onye ntaakụkọ BBC sị na-ebe niile anaghị ekwoekwo ka o sị adibu.
Ụlọakwụkwọ niile kpochiri akpochị maka na ndị otu National Union of Teachers so na ya bụ abụbụ ọrụ.
Atụrụ anya na ụlọọrụ ndị ọzọ dịka ụlọakụ na ụlọọgwụ ga-agbachi agbachi maka ya bụ abụbụ ọrụ.
Onyeisi ndị NLC bụ Sulaiman sị na ịlaazụ adịghị na ya bụ abụbụ ọrụ abalị ise ebe o metubeghị gọọmentị n'obi ịkpọ ha oku maka nkata.
O na aba mba sị na "gọomentị steeti ahu kporo onye ọbụla n'ọkpa site na-ịchụ ndị ọrụ ruru puku asaa (7000) na-eleghị anya n'azụ echeghị maka ịkwụ ha ụkwọ ntasiobi. Ndị a ha churu bụkwa mmadụ nwere ndị ha na-azụ. Ya bụ agwa ha kpara jọgburu onwe ya. Ọ bụ ya butere abụbụ ọrụ a anyị na-agba. Ka ọ dị ugbua, gọomentị akpọbeghị anyị oku, mana anyị dị njikere mgbe ọbụla ha kpọrọ anyị.
Anyị adịla njikere ịgbachi Kaduna niile taa - NLC
Otu 'Nigeria Labour Congress' ekwuola na ha ga-akpọchi Kaduna steeti niile taa iji gosi iwe ha maka ihe gọvanọ steeti ahụ Nasir El-Rufai na-eme ndị ọrụ.
Ayuba Suleima, bụ onyeisi NLC na Kaduna, gwara ndị ntaakụkọ Channels nke a n'abalị Sọnde.
Iwe ndị NLC bụ maka ọchụchụ El-Rufai chụrụ ndị ọrụ karịrị puku asaa n'okpuru ọchịchị dị icheiche na steeti ahụ.
Suleiman kwukwara na ha nụrụ na gọọmentị Kaduna na-akpa nkata ịchụ ndị ọrụ ọzọ ruru 11,000.
"Anyị adịla njikere maka ịgba abụbụ ọrụ nakwa ime ngagharịiwe n'ụbọchị Mọnde," Suleiman kwuru.
"Onye ga-edu anyị na ngagharịiwe a bụ onyeisi NLC bụ Comrade Ayuba Wabba."
"Mmadụ puku asaa na narị asaa ka a chụrụ n'ọrụ n'okpuru ọchịchị dị icheiche, mana gọọmentị ekwukwaala na ha ka ga-achụ mmadụ puku iri na otu ọzọ."
"Ọ bụ nke a mere na ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ anatabeghị ụgwọ ọnwa ha maka ọnwa Eprel."
Mana gọọmentị Kaduna akpọọla ekwe nkụ ma kwuo na onweghị ihe ga-eme ka ha laghachi azụ na mkpebi ha nwere ịchụ ndị ọrụ.
Kọmishọna okwu okpuru ọchịchị dị n'aka bụ Jafaru Sani, kwuru na ọ sọkwa ndị ọrụ ha gbaa abụbụ ọrụ otu afọ, ọ gaghị eme ka gọọmentị gbanwee mkpebi ha.