Ụlọ Nze Edwin Nworah na Aba tupu agha daa na ka alụchara agha
Ụlọ be Nze Edwin Nwora dị na 52 Ozubulu Road, Aba, Abia steeti.
Arụrụ ụlọ a tupu agha ebido mana akụpịara ya tupu alụchaa agha.
Ka agha dara, Nze Nworah na ezinaụlọ ya gbara ọsọ ndụ gaa obodo ha bụ Enugwu-Ukwu dị n'Anambara steeti ugbua.
Mana ndị agha Naịjirịa wakporo obodo ahụ ha gbagara Ndikelionwu di okpuru ọchịchị n'Orumba Nọt ugbua ebe ha mụrụ osote ọkpara ha bụ Uchenna.
Uchenna bụ onyeisi ụlọ mgbasaozi akpọrọ "Anambra Broadcasting Service" (ABS).

Ebe foto si, Uche Nworah






