Ndị uweojii Imo steeti achụọla ndị otu ha mmadụ asaa maka nrụrụaka

Ndị isi ndị uweojii

Ebe foto si, NPF/Facebook

Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii nke Imo steeti ekwuola na ha achụọla ndị otu ha mmadụ asaa maka mkpagbu,, ịnyocha ekwe ntị ndị mmadụ n'ụzọ ezighị ezi, ịnapụ ndị mmadụ ego n'ike nakwa erubeghị isi n'iwu onyeisi ndị uweojii nyere maka agwa ndị a.

Ọ bụ n'akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Michael Abattam ka ha kwuru nke a.

Ha kwuru na ha ga-akpụpụ ha ụlọikpe ma chụọ kwa ha n'ọrụ.

Ndị a achụpụrụ bụ : F/No. 462315 Sgt. Ohakim Chibuzo, F/No. 505455 Sgt. Irome Finian, F/No. 505592 Sgt. George Osueke, F/No. 511966 Cpl. Kelechi Onuegbu, F/No. 512320 Cpl. Nwagoro Isdore, F/No. 528165 PC Nwadike Stephen and F/No. 528156 PC Ihemtuge Plastidus.

Dika o siri dị, kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ enyela iwu ka ndị isi uweojii niile na steti ahụ gwa ndị otu ha ka ha hapụ itinye aka na mpụ ọbụla.

N'akwụkwọ ozi a ka ha gwakwara ndị obodo ka ha na-akpa ezi agwa mgbe ọbụla ha zutere ndị uweojii, ma wepụta kwa akara ekwe ntị ha ga-eji eme mkpesa mgbe ọbụla onye uweojii na-akpugbu ha; 08034773600 maọbụ 08098880197.