Ihe mere m ji hapụ Kanada ebe m bụ dọkịta bịa ịnọchite Anambra Central - Chinedu Umeadi
- Onye dere ya, Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
- Onye dere ya, Vining Ogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Chinedu Umeadi bụ dọkịta ahụike rụgoro ọrụ na mba Kanada nakwa United Kingdom.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a, o kọwara ihe mere o ji hapụ ọrụ ya n'ala bekee lọghachi Naịjirịa, ma jiri ọkọlọtọ 'Young Progressive Party' azọ ọkwa uloomeiwu nke Awka Central.
Ọ ruturu aka n'ihe gbasara ahụike, ikwalite aka ọrụ, inyere ndị ntorobịa aka nakwa mmepe obodo.
Umeadi kwuru na ọ bụrụ na ya merie dịka onye nnọchiteanya Awka Central, ya na ndị obodo ga na-enwe nzukọ kwa mgbe kwa mgbe iji mara ihe ha chọrọ.
O kwere nkwa na oke ọbụla si gọọmentị etiti ga-eruterịrị ndị mpaghara ya aka.
Ọ gara n'ihu kwuo na ya ga-agbaso ụzọ teknuzu iji mee ka ndị ọ na-anọchite anya ha mara etu ọrụ ọ kwere ha na nkwa si aga.
Kirie akụkọ ya n'uju ebe a.
Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Vining Ogu.







