Jude Ezenwafor: Ka anyị jụọ ajụjụ anyị

Jude Ezenwafor: Ka anyị jụọ ajụjụ anyị
Mgbe e biputara ya

Mkparịtaụka BBC News Igbo na Jude Ezenwafor na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra Steeti na pati PDP

Ọkpụrụkpụ okwu Jude Ezenwafor kwuru na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Jude Ezenwafor ji ọkọlọtọ PDP azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti kwuru ọtụtụ ihe ọ ga-eme ma ọ bụrụ na o nweta mmeri na ntuliaka ahụ a ga-eme na Nọvemba 8, 2025 na steeti ahụ.

Nke mbụ, Mazi Ezenwafor kwuru na ọ ga-ebu agha megide ọnọdụ enweghị nchekwa nke o kwuru na ọ na-emetụta azụmahịa nakwa ihe ndị ọzọ niile na steeti ahụ. O mekwara ka o doo anya na Anambra bụ steeti e ji azụmahịa mara mana ndị mkpa mkpa ndị omekome na-akpa na steeti ahụ emeela ma gbochi ezi azụmahịa na steeti ahụ.

Ọzọ dịka ibe ya bụ ime ka Anambra Steeti nwee ọdọ ụgbọmmiri ngwaahịa bekee kpọrọ 'seaport' iji nye ndị na-azụahịa ohere ibubata ngwa ahịa ha. Jude Ezenwafor kwuru na ọ ga-arịọ onyeisiala ka ọ hụ na Anambra seaport malitere ịrụ ọrụ.

O kwuru na gọọmenti ya ga-arụ okporoụzọ n'okpuru ọchịchị niile dị n'Anambra Steeti ọ kachasị okpuruọchịchị Anyamelum.

O mere ka o doo anya na ọchịchị ya ga-awulite ọnọdụ agụmakwụkwọ n'Anambra Steeti.

N'aka nke ọzọ, Jude Ezenwafor kwuru na ọchịchị ya ga-eme ka ndị Anambra steeti nwee ihe oriri.

Banyere okwu Nnamdi Kanu, Jude Ezenwafor kwuru na ọ bụrụ na o weta mmeri na ntuliaka a, ọ ga-aga nara Nnamdi Kanu n'akaebe. O kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti tọhapụ Nnamdi Kanu, ọ ga-eme ka ọnọdụ enweghị nchekwa kwụsị na mpaghara ọwụwụ anyanwụ Naịjirịa.