Ihe ndị uweojii mba Amerịka gwara BBC Igbo maka Prof.Marinus Iwuchukwu a sị nwaanyị gburu n'ofesi

Ebe foto si, Screen grab
Ndị uweojii nke mpaghara Allegheny County mba Amerịka gwara BBC Igbo na a hụrụ ozu Marinus Iwuchukwu dị afọ 59 bụ onye nkuzi mahadum na otu nwwanyị bụ Charce Dunn dị afọ 50 n'ụlọ ha dị na mpaghara Allgheny n'ụtụtụ ụbọchị Tozde.
Ha kwuru na ha na-eche na ọ bụ ọnọdụ onye gburu mmadụ ma gbuo onwe (Murder-Suicide) ya butere ya bụ ọdachi.
Dịka o siri dị, ndị uweojii Allegheny County Police ndị zara oku gbata gbata ndị agbataobi kpọrọ ka na-eme nyocha ha.
Otu onye akaebe gwara onye ntaakụkụ Pittsburgh Action News na ọ nụrụ ka ndị uweojii ji igwe eji agbasaozi na-ekwu ka ndị nọ n'ime ụlọ ahụ pụta.
Onye akaebe a gara n'ihu kwuo na site na mmekọ ya na Iwuchukwu na Dunn nwere na mbụ na ha enweghị nsogbu ọbụla.
Keme lee ihe BBC Igbo ma maka nwoke a na ihe mere :
Ihe anyị ma maka akụkọ ogbugbu Marinus Iwuchukwu
- Iwuchukwu na Dunn nwụrụ n'otu ime ụlọ ahụ
- Ha abụọ merụrụ ahụ nke yiri ebe eji mma sụọ mmadụ
- Ozu Iwuchkwu na-egosi na ọ bụ ihe dịka mma ka e jiri gbuo ya
- Ozu Dunn na-egosi na ọ dịka o ji egbe gbagbuo onwe ya
- Ọ bụ otu onye agbataobi ha kpọrọ ndị uweojii ma sị na ọ dịka nwoke na nwaanyị na-alụ ọgụ.
- O bụ n'ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ Tuzde ka ya bụ ihe mere.
- Mgbe ndụ uweojii pụrụiche gbakara ụzọ ma banye n'ime ụlọ ha ka ahụrụ ozu ha abụọ.
Onye bụ Ọkammụta Marinus Iwuchukwu?

Ebe foto si, Screengrab
Marinus Iwuchukwu bụ ọkammụta na onye nkuzi n'ọmụmụ ihe gbasara nkwenye na Chukwu nke mahadum Duquesne dị n'obodo Pittsburgh, Pennslyvania mba Amerịka.
Tupu o gaa mahadum Duquesne, ọ rụburu ọrụ na mahadum nke dị na Kano Steeti Naijirịa ruo ihe dịka afọ iri na abụọ.
Iwuchukwu edeela akwụkwọ abụọ ma nyere aka dee otu akwụkwọ ọzọ.




























