E teghị m mmanụ dịka ụkọchukwu- Charles Okafor

Aha onyonyo, Ihe mere m ji kọọ ụkọ n'anya na Nollywood- Charles Okafor
E teghị m mmanụ dịka ụkọchukwu- Charles Okafor
Charles Okafor

Ebe foto si, Charles Okafor

Mgbe e biputara ya

Charles Okafor bụ onye ejije Nollywood a ma ama.

Ọ chawapụtara n'agbata afọ 1995 na 2000 dika o sonyere n'ụfọdọ ejije wuru ewu dịka Igodo, Oracle , Domitilla na ndi ọzọ.

E mechara ihu ya kọwa ụkọ na Nollywood.

Akụkọ fesara na soshal midia bụ na ọ ghọọla ụkọchukwu nke mere o jiri hapụ ị na-emezi Ihe ejije.

Mana na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a, Okafor kwuru na ya bụghị ụkọchukwu.

Ọ kọwakwara ihe mere o jiri kọọ ụkọ na Nollywood afọ ole ma ole.

O kwukwara na ya alọghachila ọzọ.

Kirie ihe ndị o kwuru n'uju:

Onye bụdị Charles Okafor?

Charles Okafor bụ onye ejije Nollywood a ma ama nakwa onye na-ahazi ejije.

  • O sonyela n'ihe ejije karịrị 200.
  • O mepụtala ọtụtụ ihe ejije gụnyere Omalinze,The Proposal, Dust
  • O nwere ụlọọrụ na-emepụta ihe onyonyo a kpọrọ C&E Productions
  • Ọ bụ onye Umuleri,Anambra steeti mana o toro na Ajegunle ,Legọs
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum 'University of Port-Harcourt
  • Ọ rụrụ ọrụ na Security and Exchange Commision nwa oge tupu ọ banye
  • Nollywood.