Abụ m onye nkwado Peter Obi ruo echi - Aisha Yesufu

Aha onyonyo, Abụ m onye nkwado Peter Obi ruo echi - Aisha Yesufu
Abụ m onye nkwado Peter Obi ruo echi - Aisha Yesufu
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Editor
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Nwaanyị a ma ama na-akpọ oku maka ezi ọchịchị na Naịjirịa ma bụrụkwa otu n'ime ndị nkwado Peter Obi gbapụtara ihe bụ Aisha Yesufu ekwuola na o nweghị ihe ọbụla na-esere ya na Peter Obi.

Aisha Yesufu nyere nkọwa a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka, dịka ụfọdụ mmadụ na-ebugharị akụkọ na ọ gbahapụla Peter Obi.

O kwuru na ya bụ onye nke Peter Obi ruo echi n'ihi na Obi bụ onye ọ na-anụ ọkụ n'obi ime ka Naịjirịa dị mma.

"Ana m agwa ndị mmadụ oge niile na mụ na Peter Obi nọ. Ọ bụ naanị ihe gbasara Peter Obi, ọ gwụchaala. Malite n'afọ 2018 ka o doro m anya na anyị kwesịrị ilekwasa anya n'ọchịchị, inweta ndị ga-enye anyị ezi ọchịchị".

"Ọ bụkwa nke ahụ mere m ji nọrọ n'ụgbọ ndị chụụrụ Oby Ezekwesili nta vootu. N'afọ 2022 ka m sonyere na ndị nkwado Peter Obi, mụ na ya na ndị otu ya a na-agagharị. Dịka oge na-aga, m sị na e kwesịla m ịbanye n'ọchịchị n'onwe m".

"O nwereike o nweghị onye ga-anụ olu m, mana ebe m lekwasara anya bụ n'okwu ndị metụtara ime ka ndị mmadụ banye. N'okwu gbasara Peter Obi, chere ka a malite ịchụ nta vootu, akpụkpọụkwụ m ji agba egwu anọrọlarị na-eche".

"Ihe niile adịla njikere. Ugbua, anyị abaala NDC, anyị nọ ebe niile. Anyị ga-enweta ya. Ana m akwado Peter Obi hoohaa," ka Yesufu kwuru

Oge a jụrụ ya ihe o chere gbasara ọnọdụ ụmụnwaanyị n'Ụlọomeiwu Naịjirịa, Aisha Yesufu sịrị na ndị nọ n'Ụlọomeiwu na-emechi ụmụnwaanyị ọnụ ka a ghara ịnụ olu ha.

"Ọ bụrụ na ndị Naịjirịa họpụta ọtụtụ ụmụnwaanyị ka ha banye n'Ụlọomeiwu, ọ ga-ebelata ogogo e ji emechi ha ọnụ. Ihe a bụ ohere ọzọ e nwere dịka a ga-ahazi ntuliaka n'afọ 2027".

"Ụmụafọ Naịjirịa ga-eburu ya n'obi ịhụ na a họpụtakwuru ụmụnwaanyị n'ọkwa ọchịchị. Ọ bụghị naanị n'Ụlọomeiwu, ọ bụghịkwa naanị ụmụnwaanyị, ma ndị ntoroọbịa."

Aisha Yesufu gwara ndị otu Obedient Movement kwuru na ha achụpụla Peter Obi n'otu ha ka ha gaa n'ihu n'ihe ọbụla ha chọrọ ime n'ihi na nke ahụ abụghị ihe na-akpa Peter Obi ugbua.

"Ha gaa n'ihu bụrụ ihe ọbụla ha chọrọ ịbụ. Ha gaa n'ihu. Ihe ndị ahụ bụcha mmegheri anya ha chọrọ iji mee ka uche ndị mmadụ pụọ n'ihe ndị bara uru. Ka ọ dị ugbua, anyị na-aga n'ihu, ọ bụrụ na ha nọ anọ, ana m agọrọ ha ọfọ ọma, ha gaa n'ihu".

"Maka ndị na-akwado Peter Obi, ọ bụ ha na ya nọ, maka na ha nwere ntụkwasịobi na ya ma kwenyekwa na mgbe ọ ga-abanye n'ọchịchị dịka onyeisiala site n'amara Chineke, na ọ ga-emeta ndị Naịjirịa mma. Ọ ga-enye ezi ọchịchị, nkwụwaakaọtọ ma nye ezi ngụkọ."