O nweghi onye m kpọrọ aha mana ị sị na ọ bụ gị nke ahụ gbasara gị - Fada Mbaka

Fada Ejike Mbaka onyeisi ụlọụka Adoration Ministri

Ebe foto si, Adoration Ministry

Mgbe e biputara ya

Ọtụtụ ndị mmadụ kpụụ Fada Ejike Mbaka nke Adoration Ministri Enugwu n’ọnụ maka ihe o kwuru banyere ụfọdụ ndị amụma ibe ya.

Na nkwusa okwu Chineke nke o mere n’ụbọchị Jenụwarị 28 afọ 2024, Fada Mbaka katọrọ ụfọdụ ndị amụma bụ ọ sịrị ji ibu ‘amụma ụgha’ a kpọrọ ‘arangee prophet’ na-aghọgbu ụmụ mmadụ.

N’okwu ya “ọrụ amụma bụ ọrụ dị oke egwu, ọ bụghị oge niile ka a na-ebu amụma ma nke Chineke kwuru na nke o kwughi.”

“Ọ bụrụ na mmadụ gwaa gị ihe kwuo na ọ bụ mmadụ kwuru kama ịsị na ọ bụ Chineke kwuru.”

Ọ gara n’ihu kwuo na oke nghọgbu ndị mmadụ na-arịzi elu ugbua n’ụlọụka n'aha ibu amụma.

“N’oge Jesus Kraịst, ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-ebu amụma, ọ bụ mgbe ọ masịrị Chineke ka ọ na-ezi ozi.

“Ọ bụrụ na m ekwughi banyere etu ndị amụma ụgha si anapụ unu ego n’aha inuru unu amụma, Chineke agaghị agbaghara m.”

Okwu ndị a na ihe ndị ọzọ Fada Mbaka kwuru bọlitere ọtụtụ okwu dị iche iche na soshal midia.

Ụfọdụ kwadoro ihe o kwuru ebe ndị ọzọ katọrọ ya ma sị na o so n’ihe ọ na-eme mere o jiri maara maka ya.

N’ime ihe niile a Fada Mbaka kwuru, o nweghi onye ụkọchukwu, ụlọụka maọbụ onye amụma ọbụla ọ kpọrọ aha.

Mana ọtụtụ ndị mmadụ na soshal midia na-akpọgaasị aha ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ọ bụ ha ka Fada Mbaka kweere kwuo okwu ndị a.

N’ụbọchị Sọnde 5 Febụwarị 2024 Fada Mbaka gakwara n’ihu kwuo na o nweghi onye ọbụla ọ kpọrọ aha n’ihe o kwuru.

“O nweghi onye m kpọrọ aha n’ihe m kwuru mana onye sị na ọ bụ cheere na ọ bụ ya ka m na-ekwu ka ọ bụrụ ya.”

Ajụjụ ọtụtụ mmadụ kpụụ n’ọnụ ugbua bụ “kedụzie onye Fada Mbaka na-ekwu maka ya?”

Nke a abụghị mbụ Fada Mbaka na-ekwu ụdịrị okwu na-ebute okwu na soshal midia. Ọtụtụ mgbe ọ katọọla ọchịchị gọọmentị na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche.