Gọvanọ Peter Mba enyela ndị Rangers FC Enugwu onyinye ego N150m nakwa ala maka ibute iko NPFL

Aha onyonyo, NPFL Champions: Gọvanọ Peter Mba enyela ndị Rangers FC Enugwu onyinye ego N150m nakwa ala otu otu
Gọvanọ Peter Mba enyela ndị Rangers FC Enugwu onyinye ego N150m nakwa ala maka ibute iko NPFL
Mgbe e biputara ya

Mmemme nnabata ndị otu egwu bọlụ Rangers FC nke gọmenti Enugwu guzobere malitere site n'ịgba egwu, ịkwụ n’ahịrị n’ahịrị na gburu gburu Enugwu nke ndị nkwado Rangers, na ndị ihe ha na-amasi mere.

Ụmụnwaanyị na ụmụnwoke yi uwe njirimara Rangers gụrụ egwu ọṅụ ma gbaakwa egwu ọṅụ.

Mmeri a Rangers meriri otu egwu bọọlụ ndị ọzọ niile nọ na Naijiria bụ mmeri nke ugboro abụọ kamgbe Gọvanọ Peter Mbah rigooro n’ọkwa, ma bụrụkwa nke ugboro itoolu kemgbe e hiwere ha.

Rangers Enugwu gbara Ikorodu Boys ọkpụ abụọ ha sara otu iji bụrụ ndị mmeri n’ụbọchị 24 Mee 2026.

Na mmemme nri abalị o jiri nabata ndị ọgba bọọlụ ahụ na ndị na-elekọta ha, Gọvanọ Peter Mba ji ọṅụ nye ndị gbara bọọlụ otu narị nde naịra (N100m), ma nye ndị nlekọta ha nde naịra iri ise (N50m).

Ọ gara n’ihu nye ha ala n'otu n'otu ma nyekwa ụfọdụ ndị nlekọta ha dịka Nnukwu Onyeisi, Onye Nchịkọta, Odeakwụkwọ nakwa osote onye nchịkọta ala.

Mbah gara n’ihu kwee nkwa na ya amalitela ịrụgharị Nnamdi Azikiwe Stadium nke ga-enye aka ịhụ na Rangers ga-anọ na ya gbaa bọọlụ ma na-asọkọrịta mpị.

O kwuru na olileanya ndị Enugwu bụ ka otu egwu bọlụ Rangers jisie ike bulata iko CAF Champions League n’Enugwu oge na-adịghị anya.