Ihe mere Bishop Katọlịk nke Abakịlikị jiri tụhapụ nkwanyeugwu Gọvanọ Umahi nyere ya.

Bishọp ụka Katọlịk nke Abakiliki bụ Peter Nworie Chukwu ajụla ịnabata nkwanyeugwu 'Commander, Ebonyi Hall of Fame' nke Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi nyere ya.
Ọ bụ n'akwụkwọ ozi nke na-efegharị na ịntanetị ebe Chukwu jụrụ ịnara nkwanye ugwụ Gọvanọ nyere ya.
Chukwu dere sị, " A chọrọ m iji obi ụmela kwuo na agaghị m anabata nkwanyeugwu ị chọrọ inye m. Nke a bụ n'ihi na m ka na-agba mbọ ịrụ ọrụ ọsọ eluigwe dịka ụlọorụ Bishọp siri dị. E chere m na ọ ga-aka mma ka enye ya onye m nọchịrị bụ Michael Nnachi Okoro onye gbarala mbọ ma rụọ ọrụ ọtụtụ oge nyere Chukwu na mmadụ. Kama ị ga-enye m ntụrụugo a, ọ ga-amasị m ka ị gbaa mbọ hụ na atọhapụrụ ụkọchukwu Timothy Ngwuta onye anwuchịrị maka ebubo ịgbụ ọchụ na ebubo ndị ọzọ".
Nworie jịkwa ohere a gwa Gọvanọ Umahi na ọ nwere ezi nkwanye ugwu maka ọrụ ọ na-arụ dịka Gọvanọ ma sịkwa na ọ na-ekpere ya , ọchịchị ya na ndị Ebonyi steeti ekpere oge niile.
Gịnị mere eji nwuchie ụkọchukwu Timothy Ngwuta?

Ebe foto si, Catholic Diocese Abakiliki
Dịka akwụkwọ ozi ndị ụka katọlikị depụtara , ndị uweojii nwuchiri ụkọchukwu Timothy Ngwuta onye bụ onye obodo Ezza effium nke dị n'okpuru ọchichọị Ohaukwu nke Ebonyi Steeti.
Dịka o siri dị, Ezza Effium na ndị obodo Effium na-alụrịta ọgụ kamgbe ọtụtụ ọnwa.
Ngwuta gara ụloọrụ ndị uweojii ịnyere enyi ya aka napụta ụgbọala ya ndị uweojii jichiri.
Dịka ha na ndị uweojii kpeziri ma ha achọrọ ịburu ya bụ ụgbọala. Otu ndị nche abụọ bịara nwee nghọtahe nke mere ka Ngwuta danye kwa n'aka ndị uweojii ọzọ.
Ha depụtara na ndị uweojii nwuchiri Ngwuta ruo abalị iri na abụọ kama ha mechara tọhapụ ya nwa mgbe nta mgbe ahụ bidoro ịnye ya nsogbu.
Akwụkwọ ozi a kwuru na Ngwuta rubere isi n'iwu ndị uweojii nyere ya ka ọ na-abịa kwamgbe kwamgbe egosi onwe ya dịka iwu ndị atọhapụrụr nwa mgbe nta siri dị.
Kama n'ọnwa Maachị afọ 2022 ka ndị uweojii nwuchi kwara ya ọzọ maka ebubo ịtọ mmadụ, igbu ọchụ na ịkwalite ọgụ n'etiti obodo abụọ.
Ọ ka nọ n'aka ndị uweojii ruo taa.




























