Ọ bụ naanị mụ na Njideka ma ihe seere anyị okwu - Gozie Okeke
- Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Onye dere ya, Michael Ngene
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Mgbe e biputara ya
Onye na-eti egwu ụka a ma ama na Naịjirịa bụ Prince Gozie Okeke akọwaala maka esemokwu ya na onye bụbu nwunye ya aha ya bụ Princess Njideka.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC News Igbo nwere n'ụlọ ya dị n'Anambra Steeti ka o kwuru na ya na Njideka enweghị ohere ịmata onwe ha tupu ha alụọ nke Bekee kpọrọ 'courtship'.
O kwuru na ha lụrụ di na nwunye n'ihe na-erughị ọnwa ise ha matara onwe ha.
Prince Gozie kwuru na ya maliitere iti egwu n'afọ 1987.
"Efere egwu nke mbụ nke Bekee kpọrọ 'album' bụ 'Ekwensu Adaala Gwoogwoo'. Etiri m egwu ahụ n'afọ 1989. Adara m ogbenye, atara m ahụhụ. Nna m nwụrụ mgbe m dị afọ iri na abụọ," ka o kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo: "A na-emezi o nwee ebe a na-eme mmemme, ha sị ka a chọọ m ka m bịa gụọ egwu. Ọ bụ n'afọ 1999 na 2000 ka Chineke bịara nyere m aka. Chinyere Udoma bụ... mụ na ya na-akpọ onwe anyị ọ bụrụ ndị Oyibo, ha sị 'blood'. Anyị na-ahụta onwe anyị ka ụmụnne. Anyị tara ahụhụ egwu na mbido. Oge ahụ, i tichaa egwu, i buru egwu gị na baro ga na-ere. Chinyere soro ree nke ya mụnwa rere."
O kwuru na ụdịrị ihe ahụ adịghịzi n'ụwa ugbua n'ihi na soshal midịa mere ihe niile ọ dịrị anyị mfe.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
N'ihe gbasara echichi ọzọ ndị obodo ha chiri ya na nso nso a, o kwuru na ọ bụ oge o mere afọ iri atọ na ise ọ malitere iti egwu ka ụmụnna ya gwara ya na nna ya bụ onyeisi ọzọ mana o nweghị onye ọbụla kpu okpu ọzọ n'ezinaụlọ ya niile.
"Ha wee sị na ọ bụ iwu na ha ga-ekpunye m okpu. Asịrị m mba n'ihi na mụ achọghị ihe ọzọ. Ha kpere ikpe ya ihe karịrị ọnwa isii. Onye nọ n'akụkọ nụrụ ka a na-ekwu maka ọzọ, o nwere anya ndị mmadụ ji ahụta ya na ọzọ na okpukperechị Krịast, Chineke nọ n'igwe ga-abụrụ m onye akaebe na ọ bụ ime ụlọ m ka mere ya.
O kwukwara na etu e si ekpuwe okpu ichi eze ka e siri chie ya ọzọ ma kwuo na o nweghị ihe ọbụla yiri ịgwọ nsị maọbụ arụsị dị na ya.
"Ụdịrị ihe dị etu ahụ adịghị na ya. Ọ bụghị ichi ọzọ ga-eme ka m daa n'okwukwe. Naanị ihe dị na ya bụ ọdịmma gị na chi gị hapụ nke mmadụ," ka o kwuru.
Gozie kwuru na ya nwere ugbo ebe ọ na-azụ ụmụanụmanụ na be ya ugbua.
"Ọ na-amasị n'obi na m kulie ụra n'ụtụtụ, o nwee ihe m ga-aga nye nri. Ya bụ, o nwee anụmanụ m ga-aga nye nri. Ọ bụ m na-azụ ihe ndị ahụ, obi a na-atọ m ụtọ. I lee anya, ị ga-ahụcha ma ụmụ enwe, e nwere ugo, nnukwu ugo abụọ nọ na be m".
"Enwere m ọtụtụ anụ gụnyere enyinnụnụ, 'peacock' ndị mmadụ na-azụ ya. Ụfọdụ na-eji ya edozi ezi ha maka na ọ pụta n'ụtụtụ gbasaa nku ya ahụ, ọ na-atọ ụtọ n'obi. Ihe niile a bụ ihe e ji edozi ụlọ ọ maa mma," ka ọ kọwara.



