Home security/safety: Ụfọdụ ihe ndị mmadụ sị ha gabigarala n'aka ụmụodibo

Nwanaeku na odibo a na-enyo enyo igbu nne ya ukwu

Ebe foto si, Getty Images/Niger Police Command

Mgbe e biputara ya

Dịka akụkọ na-efegharị na odibo sugburu nne ya ukwu, ụfọdụ ụmụNaijiria ekwupụtara ihe dị iche iche ha gabighara n'aka ndị ọrụ enyemaka ezinaụlọ ha nwerela.

Otu nwata gbara afọ 14 a kpọrọ Joy Afekafe sụgburu nne ya ukwu bụ Funmilola Adefolalu bụ onye nkuzi na mahadum 'Federal University of Technology, Minna' na nsonso a.

Ọnwụ nwaanyị ahụ na-akụzi 'Biochemistry' na mahadum ahụ kpalitere okwu gbasara mkpamkpa ụfọdụ ndị ọrụ e were n'ezi n'ụlọ na-akpa nke tinyerela ọtụtụ ezinaụlọ n'ihe mgbu.

Nwanaeku nyere nwa ọhụrụ m mmiri ọkụ rechapụrụ eriri afọ ya

Nwa na-eku nwa

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwoke achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na o dibo na-ekuru ha nwa chere nwa ọhụrụ ha dị ọnwa anọ mmiri ọkụ rechapụrụ nwata ahụ eriri afọ.

"Ihe mere ezinaụlọ m n'afọ 2020; mụ na nwunye m si ahịa bata ọ bụrụ na otu n'ime ụmụ ejima na-ebe akwa, ihe nile anyị mere. o kweghị agụgụ."

"Ka a jụrụ nwanaeku, o kwupụtara na ya nyere nwa mmiri ọkụ.""Ọ dara n’ọrịa tupu anyị mara ihe na-eme, eriri afọ nwa bidoro na-ere."

"Anyị bugara nwa ụlọọgwụ, ndi dọkịta mechara ihe nile ha mere ma na nwa m nwa nwụrụ ka ọ gachara ọnwa isii,ọfụdụ otu ejima."

'Nwanaeku m zuru ohi,wụọ aja gbalaga'

Nwata nwaanyị a hụghị ihu ya

Ebe foto si, Getty

Ijeoma Orji, onye ọkaiwu gwara BBC Igbo na ihe ọ gabigara n'aka nwata nwaanyị dị afọ 18 o were n'ọrụ ilekọta ụmụaka mere ya ikpebie na ya agaghị akpọkwa nwata ọzọ.

Ọ sịrị: "Ọ na-esi n'ụlọ abịa. Ọ malitere na-ezu kirikiri ego, ị jụọ ya, ya aghọọ."

"O siri na izu ego banye n'izu akwa m. ị jụọ ya, ọ gọọ."

"Mana o nwere nke o zuru, amaghị m ma ihe ọ na-akpatụ ya n'isi, o yiri ya bịa ọrụ."

"Oge m jụrụ ya, ọ sị na ọ bụ akwa ya zụrụ n'Abuja."

"Agwara m ya na m na ya ga-eso gaa na ogige ndị uweojii ka o nye ha ihe akaebe goziri ebe ọ zụrụ ya dịka m gosiri ya ihe akaebe ebe m zụrụ ya."

"O mere ka ọ gara ozi n'azụ ụlọ, wụọ aja gbalaga."

"Nke a tụrụ m n'anya nke mere ka m kpebie na agaghị m akpọkwa nwa odibo ọzọ.

"Onye nwere ike ịwụ aja nwere babuwaya, o nweghị ihe o nweghị ike ime."

Etu odibo si gbuo nne ya ukwu
Joy, nwata a na-enyo maka igbu nne ya ukwu

Ebe foto si, Niger State Police

Ndị uweojii si na aka ha akparala nwatakịrị gburu nne ya ukwu.

Joy Afekafe gbara afọ 14 na ndị otu ya ji mma sụgbuo Oriakụ Fumilola Adefolalu bụ onye nkuzi na ngalaba 'Biochemistry' na mahadum 'Federal University of Technology, Minna' na nsonso a.

Akụkọ kwuru na Joy na-arụrụ Adefolabu ọrụ dịka nwa odibo, ọ chụọ ya n'ọrụ ka ọrụchara ya ọrụ naanị izuụka atọ, Joy gara dute ndị enyi ya abụọ.

Ha gaa ụlọ Adefolabu, kụọ ya ihe tinka kụrụ pan, ma were mma ekwu sụkasịa ya, hapụ ozu ya gbalaga.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ dịka ndị enyi na ndị ụlọụka Fumilola Adefolalu kpogidere ya n'ekwentị, ọ gaghị ka ha si bịa ụlọ ya ịhụ ya.

Oge ha rutere, ụlọ ya gbachiri agbachi.

Oge ha gbawara ụzọ, ha hụrụ nwaanyị ka ọ dọ n'ozu, ọbara ebe nile, ebe e ji mma gheewa ya akpịrị.

Ọnụ na-ekwuu ndị uweojii Niger Steeti bụ Wasiu Abiodun gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere n'ezie.

Abiodun kwuru na ọ bụ ka e wetara ha mkpesa ka ha mmere nchọpụta dugara ha ebe ha nwuchiri nwaodibo nwaanyị ahụ.

" Ndị uweojii na-arụ na ngalaba Bosso gara ebe ihe mere ,hụ mma abụọ ọbara tere nke e chere e ji gbuo nwaanyị ahụ.E bugara ahụ ya n'Ụlọoọgwụ IBB Hospital, Minna ebe e kwuru na ọ nwụọla."

"Ndị uweojii gara n'ihu gbaa ndị bi n' ogbe ahụ ajụju ma mee nnyocha nke dugara ha n'ebe Joy Afekafe 'gbara afọ 14 bi na Gbeganu, Minna dị na Minna bụ ebe a nwụchiri ya n'abalị 30 nke ọnwa Oktoba."