Nigeria Election 2023: Ihe i nwereike ime ka ị bụrụ Onyeisiala Naịjirịa otu ụbọchị

Aha onyonyo, Nigerian President: Usoro e ji abụ Onyeisiala Naijiria
Nigeria Election 2023: Ihe i nwereike ime ka ị bụrụ Onyeisiala Naịjirịa otu ụbọchị
Mgbe e biputara ya

Ọkwa Onyeisiala bụ ọkwa kachasị dị elu, dị mkpa ma kachasị nwee ikike na Naịjirịa.

A na-asị na onyeisiala Naịjirịa nwere ikike ọchịchị karịa onyeisiala ọtụtụ mba ndị ọzọ, nke a mere ọkwa a ji adọ ọtụtụ ndị mmadụ akpịrị.

Ya mere onye chọrọ ịbụ onyeisiala Naịjirịa kwesịrị ịkwado ọfụma ma mara kwa ụzọ ndị ọ ga-eme iji nwete mmeri.

Akụkọ a na-arụtụ aka n'ihe i nwereike ime ka ị bụrụ onye ga-achị Naịjirịa n'otu ụbọchị

Obasanjo Yar'Adua, Jonathan na Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Akara nkewa
Akara nkewa

Akụrụngwa ndị ị ga-enwe tupu ị bụrụ onyeisiala Naịjirịa

Ọkọlọtọ na njirimaara Naịjirịa

Ebe foto si, Getty

Onye ọbụla chọrọ ịbụ onye isiala Naịjirịa ga-enweriri akụrụ ngwa ndị a;

1. Ị ga-abụ nwafọ mba Naịjirịa

Tupu ị bụrụ onyeisiala Naịjirịa, Ị ga-abụ nwafọ Naịjirịa site n'ọmụmụ.

Iwu kwuru na onye ahụ agaghị abụ nwafọ mba ọzọ ka ọ ghara inwe nkwenye na mba abụọ.

2. Afọ ole ị ga-adị

Afọ kachasị obere iji abụ onyeisiala bụ afọ iri atọ na ise (35). Nke mere na onye ruru afọ iri atọ tozuruoke ịzọ ọkwa onyeisiala.

3. Ogogo agụmakwụkwọ gị

Ogogo agụmakwụkwọ eji a bụ onyeisiala bụ naanị asambodo ụlọakwụkwọ sekọndịrị.

Anaghị akpụ asambodo akpụ, a ga-akwụsị onye mere nke a ịzọ ọkwa a.

Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Naịjirịa

Ebe foto si, Inec

4. Isonye n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị

N'agbanyeghi ikike niile n'eso ọkwa onyeisiala, ọ ghaghị ịbụ onye ahọpụtara site n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ịbụ onye otu n'ime ha.

5. Ịgba arụkwaghịm n'ọrụ

Tupu mmadụ e tozuo oke ịzọ ọkwa onyeisiala, onye ahụ ga-agba arụkwaghịm n'ọrụ ọhanaeze ọbụla ọ na-arụ.

Ọ ga-eme nke a ma ọfọdụ ihe dịka otu ọnwa tupu a na-eme ntụliaka imeụlọ pati ya iji họpụta ya.

6. Isi nakwa ahụ izuoke

Onweghi mba ga-achọ ka onyeisiala na-enweghi ezi akọ na uche na-chị ya, ya mere ị ga-abụ onye isi na-ahụ zuru oke dịka iwu na-achị Naịjirịa si kwuo.

Igbe e ji atụ vootu

Ebe foto si, Getty Images

7. Ị gaghị enwe akụkọ banyere mpụ na nrụrụaka

Onye isiala Naịjirịa agaghị enwe akụkọ ime mpụ ọbụla n'ihe banyere emeghi ihe n'eziokwu maọbụ ịkpa agwa aghụghọ.

8. Ị gaghị agba aka ego

Ọnye na-azọ ọkwa onyeisiala ekwesighị ibụ onye ego kọrọ n'akpa maọbụ n'ụlọ akụ ya dịka iwu na-achị Naịjirịa siri dị.

9. Ị gaghị anọ n'otu nzuzo

Onye na-azọ ọkwa onyeisiala agaghị abụ onye otu nzuzo ọbụla na Naịjirịa nakwa mba ofesi.

Akara nkewa

Nzọmụkwụ ị ga-eji tozuo oke n'ịzọ ọkwa onyeisiala na Naịjirịa.

Ndị na-atụ vootu

1. Banye n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị

Iwu kwuru na onweghi onye ọbụla ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala ma ọ bụrụ na o soyeghi n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị a maara aha ya.

I kwesiri ịba n'ime otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọ na Naịjirịa. Ị ga-aga debanye aha na wọọdụ ebe isi pụta, ebe ibi maọbụ ebe ị na-arụ ọrụ.

Ndị otu ahụ ga-anabata gị ma nye gị akwụkwọ ga-egosi na ịbụ onye otu ahụ.

2. Debanye aha dịka onye chọrọ ịzọ ọkwa

Ọ bụrụ na a nabata gị n'ime otu ndọrọ ndọrọ. Ị ga-ekwupụta uche gị nye ndị ndu otu ahụ na ị chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala, ka ha nwee ike họpụta.

3. Ihiwe otu achụmnta vootu

N'iji mee nke ọma dịka onye na-azọ ọkwa onyeisiala, i kwesiri inwe otu kpọrọ akpọ ga-achụrụ gị nta vootu.

Ndị otu a ga-enwe onyeisioche, onye odeakwụkwọ, onye odeakwụkwọ ego nakwa onye na-agụkọ ego.

Ndị gbakọrọ maka achụmnta vootu

Ebe foto si, Peter Obi

4. Malite ọsọ achụmnta vootu

Dịka ihiwechara otu achụnta vootu gị, ihe ọzọ bụ ịmalite ọsọ achụmnta vootu. Ọsọ achụmnta vootu nke onyeisiala kwesiri ka a gbaa ya na steeti niile dị na mba ahụ.

Ị ga-akpọtụrụ ndị ndu ọdịnala, ndị ndu ụka nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu na steeti ọbụla. Ị ga-agwa ha uche gị n'ịzọ ọkwa onyeisiala ma rịọ maka nkwado ha.

5. Sochie nta vootu gị n'azụ

Adala mba dịka i mechara njem ileta ndị i kwesịrị ileta. Ọsọ achụmnta vootu gị ekwesighi ịkwụsị rue oge a ga-eme ntuliaka ahụ.

Ndị otu achụnta vootu gị ga-esochi ntuliaka iji hụụ na-emere ihe niile n'ụzọ ziri ezi na-enweghi nrụrụaka ọbụla.

I soro nzọmụkwụ ndị a, i kwesịrị ịhụta onwe gị n'ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.