Ndị uweojii anwụchiela nwoke a sị tụwara nwa ya nwaanyị ime n'Enugu State

Ndị ọrụ ministri na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ụdị ekere na nwata nwaanyị nna ya tụwara ime
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ ruru anyị aka na-ekwu na a napụtala otu nwata nwaanyị nna ya dinara ma tụwa ime na Nenwe dị n'Enugu state.

Ọ bụ ndị uweojii Enugu state na mịnịstrị na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ụdị ekere nyere aka napụta nwata nwaanyị ahụ a na-akpọghị aha ya.

Nke a mere oge ndị obodo Nenwe chụpụchara nwata nwaanyị ahụ na nna ya n'obodo ha maka imerụ ala.

N'otu onyonyoo fesara n'ogbe nzirịtaozi soshal midịa na nso nso a, a hụrụ ebe ndị obodo Nenwe dị n'okpuruọchịchị Aninri n'Enugu state na-achụpụ nwata nwaanyị ahụ na nna ya.

N'onyonyoo ahụ, a hụrụ ka nwoke ahụ na nwa ya nwaanyị ọ tụwara ime nya ọmụ n'olu ma buru akpa ha pụta n'okporoụzọ, ebe ndị obodo gọrọ ọfọ ma sị ha pụọ n'obodo ha maka ime ihe ala sọrọ nsọ.

Ka ọ dị, ndị uweojii ekwuola na ha nwụchiri nwoke ahụ oge ha nwetara akụkọ gbasara ihe merenụ.

Oge BBC kpọrọ ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugu state, ha kwuru na ngwangwa ha nwetara ozi gbasara ihe mere na Nenwe, ha gara n'obodo ahụ, nwụchie nwoke ahụ a na-enyo enyo.

Ndị uweojii gwara anyị na ha napụtara nwata nwaanyị ahụ nna ya tụwara ime ma nyefee ya n'aka mịnịstrị na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ụdị ekere, bụ ebe ọ nọ ugbua na-enweta ezi nlekọta.

Anyị akpọtụrụla kọmịshọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ụdị ekere n'Enugu state ka ọ gwa anyị ihe ọ ma gbasara okwu a, mana anyị ka na-eche nzaghachi ya.