Jaydee Bombshell: Ndị Igbo kwesịrị ị na-akwado onwe ha maka na ugbua bụ oge ha

Jaydee Bombshell: Ndị Igbo kwesịrị ị na-akwado onwe ha maka na ugbua bụ oge ha
    • Onye dere ya, Amaka Bassey
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Ebeg o si, Lagos
  • Mgbe e biputara ya

Chukwujekwuterem Derrick a ma dịka Jaydee Bombshell bụ otiegwu a ma ama nke egwu ya na-ewu na mpaghara Naịjirịa niile.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwara etu o si malite ịtiegwu, hụ na egwu ndị ọcha adịghị mfe itipute ma tụgharịzịe banye n'egwu omenala.

Ọ sị na egwu omenala e weghi ya ihe ọbụla karịa itinye ya soshal midia tupu ọ malite iwu.

"Egwu sị n'ebe amamihe na mmasị apụta" ka o kwuru na ya bụ mkparịtaụka.

Ọ kọwakwara etu ụfọdụ egwu ya na-ewu karịa ya na onwe ya mana egwu weputara ya n'ihu ọha niile bụ egwu o tiri maka 'Pammy Udu Bonch bụkwa otiegwu omenala nwụrụla anwụ.

"Ọ bụ iji chetara ndị mmadụ maka mbọ Pammy gbara n'iweputa ụdịrị egwu a ma dịka Udubonch/Igba ebe niille.

A maghị m na ọ ga-ewu etu a" ka o kwukwara.

Mana ọ sịkwa na obi dị ya ụtọ na o chetaara ndị mmadụ maka Pammy n'ụzọ dị mma.

Jaydee Bombshell bụkwa onye na-eme ụfọdụ ihe dịka ọ malitere ịgba egwu tupu ọ banyezie n'itiegwu ma na-atụ anya isoro nzọmụkwụ Mike Ejeagha, Oliver de Coque nakwa Osadebe bụ ndị odogwu egwu Igbo a ma ama.

Ọ kọwara na ọ sighi Nkanu dị n'Enugwu kama na ọ bụ onye Ezeagu. Ọ dọrọ ndị Igbo aka na ntị ha nye onwe ha nkwado n'egwu n'ihi oge ha eruola.