Doctors strike: Gọọmentị etiti etiela iwu 'onye na-arụghị ọrụ agaghị anata ụgwọ ọnwa' n'ụlọọgwụ

Doctors strike: Gọọmentị etiti etiela iwu 'onye na-arụghị ọrụ agaghị anata ụgwọ ọnwa' n'ụlọọgwụ
Mgbe e biputara ya

Gọọmentị etiti Naịjirịa enyela ndị isi ọrụ ahụike n’ụlọogwụ ndị gọọmentị etiti nwee ka ha tinye ụsọrọ ‘onye na-arụghị arụ agaghị anata ụgwọ ọnwa’ n’ụlọọrụ ha n’akụkụ Naịjirịa niile.

Tuziaka so ozi a nyekwara ndị isi ọrụ a iwu ka ha malite na-edetu aha ndị dọkịnta bịara ọrụ kwa ụbọchị iji mara ndị a ga-akwụ ụgwọ na ndị agaghị akwụ ụgwọ.

Ozi nke si n’aka ministri ahụ Naịjirịa gbara n’ọha n’ụbọchị Tọọzde.

Isiokwu ya bụ ozi gosiri na nke a bụ ihe gọọmentị etiti ji asaa abụbọ ọrụ ndị dọkịnta na-arụ n’ụlọọgwụ ndị gọọmentị nwee na-agba megide gọọmentị dịka ha na-ekwu na gọọmentị emebeghị ihe ndị ha na-achọ.

Otu National Association of Resident Doctors (Nard) malitere abụbọọrụ mbụ ha n’oge ọchịchị onyeisiala Bola Tinubu n’ụbọchị 26 nke ọnwa Jụlaị maka okwu gụnyere ibuli ego ụgwọ ọnwa ha, iwee ndị dọkịnta ọhụrụ n’ọrụ nakwa ihe ndị ọzọ.

Abụbọ ọrụ a malitere ịmetụta ndị mmadụ n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche dịka ndị na-aga ụlọọgwụ gọọmentị nwee inata ọgwụgwọ na-agba aka ala.

‘Ndị dọkịnta ekweghi leta nwa m dara ọrịa n’ihi na ha na-agba abụbụ ọrụ’

Cheta na n’ụbọchị Tọọzde abalị 27 nke ọnwa Jụlaị, Ekpo Nta bụ Onyeisi ọrụ ịkwụ ụgwọ ọnwa Naịjirịa zipụtara ozi kwuo na:

“Gọọmentị etiti Naịjirịa ebinyela aka ka a kwụọ ndị dọkịnta Naịjirịa na ndị dọkịnta eze N25,000 ma wepụta akwụkwọ ilebeanya n’ụfọdụ ihe ndị ọzọ ha na-eme mkpesa maka ya.”

Ya bụ ozi emebeghi ka ndị dọkịnta a na-agba abụbọ ọrụ kwụsị atụmatụ a.

Otu National association of resident doctors (NARD) gbara abụbọ ọrụ n’ihi na ha na-ekwu na gọọmentị emezubeghi ihe ha na-achọ.

Abụbọ ọrụ a nke ekwubeghi mgbe o ga-ebi amalitela imetụta ndị ndị mmadụ n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche dịka ndị na-achọ inweta ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ndị gọọmentị nwee na-enwe nsogbu.

Otu nwoke bịara ụlọọgwụ gọọmentị dị n’Abakaliki, Ebonyi steeti gwara BBC Igbo na

“A kpọm nwoke bịa ka e nye ya ọgwụgwọ n’ihi na ahụ adịghị ya, a bịazie gwa anyị na ndị dọkịnta na-agba abụbọ ọrụ.”

Nwaanyị ọzọ kpọkwa nwa ya ahụ adịghị bịa ụlọọgwụ ahụ kwuru

“A bịara m ụlọọgwụ n’ihi na ahụ adịghị nwa m, mana ndị dọkịnta ahụghịkwa anyị n’ihi na [ndị dọkịnta] gọọmentị na-agba abụbọ ọrụ dịka a sị anyị lawa ụlọ.”Emeka Innocent Orji bụ onyeisi ndị dọkịnta (Nard) gwara BBC Igbo na mkparịtaụka na gọọmentị emezubeghi ihe ndị ha chọrọ ruo ugbua ma kọwa na

“Ihe anyị na-ekwu bụ ka e wee ndị dọkịnta na ndị nọọsụ ọhụrụ n’ọrụ maka ndị n’ọtụtụ ụlọọgwụ anyị apụchaala gawa mba ofesi maka gọọmentị anyị anaghị eleta ha anyị nke ọma”

Otu a kwuru n’afọ 2022 na kwa izuụka, opekatampe, ndị dọkịnta mmadụ 50 na-apụ Naịjirịa aga mba ndị ọzọ ewere ọrụ n’ihi okwu etu gọọmentị Naịjirịa si eme ha.

Orji kwukwara:

“Anyị na-ekwukwa ka ụgwọ niile ha ji anyị m a nke ha ji anyị na 2014 ruo taa, nakwa ego ọzụzụ (training fund) nke afọ a bụ 2023, ndị otu anyị na-asị ka gọọmentị kwuọ ha niile.”

Onyeisi otu a n’ụlọọgwụ Parkline dị n’Enugu kwuturu BBC Igbo ma kwaa arịrị na ụgwọ ọnwa ha pere mpe dịka o kwuru na gọọmentị anaghị enye ha ego 'hazard allowance' nwere isi tinyekwara na Gọọmenti Etiti emejuputaghi nkwekọrịta ha n’okwu usoro ịkwụ ụgwọ nke Consolidated Medical Salary Structure (CONMESS) kamgbe afọ 1999.

Nke a ga-abụ mbụ otu a na-agba abụbọ ọrụ n’oge ọchịchị Bola Ahmed Tinubu bu onyeisiala Naịjirịa ọhụrụ.

N’afọ 2021, otu Nard gbara abụbọ ọrụ ruo abalị 21 maka okwu na gọọmentị Muhammadu Buhari ‘emezughi ihe ndị ha chọrọ’ banyere okwu ụgwọ ọnwa ha.

Cheta na otu a mara ọkwa abụbọ ọrụ a kemgbe ọnwa Mee ma kwuo ma emezughi ihe ha chọrọ na ga-amalite ya bụ abụbọ ọrụ

Ka ọ dị ugbua, o dobeghi anya etu okwu a ga-esi bie dịka otu a na gọọmentị ka na-enwe mkparịtaụka