South-East Governors' Forum: 'Ọ bụghị ndị na-eti mkpu nnwereonwe na-akpa mkpamkpa n'Ọwụwa Anyanwụ'

Charles Soludo, Alex Otti, Hope Uzodimma ,Peter Mba na Francis Nwifur
Mgbe e biputara ya

Ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na ndị na-akpa mkpa mkpa na-akpọtụ na mpaghara ahụ bụ ndị omekome, na ọ bụghị ndị na-agba mbọ maka nnwereowe Biafra.

Ha kwuru nke a dịka ha mechara ọgbakọ otu jịkọrọ ha a kpọrọ 'South-East Governors' Forum n'ụbọchị Fraide (10/8/2023 n'obi Gọọmenti Enugwu Steeti.

Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma bụ onye gụpụtara mkpebi ndị gọvanọ Ọwụẁa Anyanwụ nwere n'ọgbakọ ahụ sịrị, "Otu a na-ekwu hooha na ndị na-ebute nsogbu nchekwa na mpaghara anyị na ndị na-abanyere ha aja n'ukwu bụ ndị omekome, e kwesịghị ịhụta ha dịka na-eti mkpu nnwereonwe."

" Ya mere o nwee onye a nwụchiri, si mee ya ka e si eme ekperima dịka iwu ala anyị siri dị."

Charles Soludo, Alex Otti, Hope Uzodimma ,Peter Mba na Francis Nwifur

Dịka ha kelere ndị ọrụ nchekwa maka nkwado ha, ha kpebiri ijikọ aka ibu agha megide nsogbu nchekwa na-eleghị anya n'azụ nakwa na onwe ma rịọ nkwa nke Gọọmentị Etiti.

Uzodimma gara n'ihu kwuo na ha kpebikwara inwe ọgbakọ nkwalite akụnaụba na nchekwa mpaghara ahụ n'ụbọchị ha ga-ekwupụta n'oge na-adịghị anya.

Alex Otti,Charles Soludo na Peter Mbah

Cheta na tigbuo-zogbuo na-aga n'ihu n'Ọwụwa Anyanwụ kemgbe Jenụwarị afọ 2021.

Nsogbu a kawanyere njọ ka a nwụchiri Nnamdi Kanu ma tunye na mkpọrọ DSS dịka a na-ekpe ya ikpe maka ebubo metụtara iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịkwatu Gọọmentị Etiti dịka ndị otu ya bụ Ipob tinyere Nọrọnụlọ kwa Monde nke ha ji a kpo oku ka a tọhapụ ya.

Mana Ipob mechara kwụsị nọrọnụlọ mana otu alaka otu ahụ k[pọrọ onswwe ha'Autopilot' gara n'ihu na amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ Monde ọbụla nakwa ụbọchị masịrị ha na-agbanyeghị na Kanu site n'ọnụ ndị ọkaiwu ya akpọọla oku ugboro ugboro ka a kwụsị nke a.

Mmanye nọrọnụlọ atala isi ọtụtụ ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ , mebie akụnaụba dara ndekwuru nde , ebe ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ na-agha ahịa n'ihi nke a.