Conjoined twins: Etu ejima jikọrọ ọnụ ndị dọkịta sị na ha ga-anwụ abalị ole na ole a mụrụ ha si dịrị ndụ

- Onye dere ya, Lucy Owen
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
- Mgbe e biputara ya
Marieme na Ndeye Ibrahima bụ ụmụejima abụọ jirikọrọ ọnụ e leghị anya ịdị ndụ karịa abalị ole na ole oge a mụrụ ha.
Ugbua ha eruola afọ asaa ma bụrụ ndị a na-eche na ọ bụ ha bụ naanị ejima jikọrọ ọnụ na-eto eto na mpaghara Yurop.
Na-agbanyeghị na ụmụaka nwaanyị abụọ nwere agwa dị iche iche, ha na-adabere n'onwe ha ji dị ndụ.
Marieme na Ndeye nwekọrọ ụkwụ abụọ, otu ukwu mana ha abụọ nwere otu onye, otu obi na otu ọkpụkpụ azụ.
Nna ha bụ Ibrahima sịrị, "A gwa gị na mbido na olileanya adịghị, ị ga na-ebi ndụ ihe chi fotere, i were."
"Ha bụ ndị lụrụ ọgụ ndụ ha, ma jụ imezu ihe nile e chere ga-eme ha."
Ụmụ ejima jikọrọ ọnụ abụghị ihe a na-ahụ kwa daa.
Na mba Briten a na-enwe otu n'ime ụmụaka 500,000 a mụrụ ọhụrụ na mba ahụ.

Ọkara n'ime ha na-anwụ ngwa ngwa a mụrụ ha, ebe ụfọdụ na-anwụ tupu awa 24 e ji mụọ ha agafee.
Ya mere ịhụ Marieme na Ndeye ka ha mere emume ncheta afọ asaa a mụrụ ha bụ ihe ọṅụ nye ọbụghị naanị Ibrahima mana ndị dọkịta lekọtara ụmụaka ahụ.

Ibrahima sịrị, "Ụmụ m nwaanyị dị iche iche. Marieme dị nwayọọ ma na-anọrọ onwe ya. Mana Ndeye dị iche; o nwere okwu aka ya.
"Agaghị m asị gị na ọ dị mfe mana ọ bụ nnukwu ihe meere m. Ọ bụ nnukwu ihu ọma ị na-ahụ ọgụ ndụ a."
Oge a mụrụ ụmụejima a na mba Senegal n'afọ 2016 dịka nne na nna ha na-atụ anya otu nwa.

Ndị dọkịta ekweteghị na ha ga-adị ndụ karịa abalị ole na ole.
Ibrahima gwara 'Inseparable Sisters' nke BBC sị, "Anọ m na-akwado onwe maka ihe mberede."
"Naanị ihe anyị na-emeli bụ ịnọ ha nso ma hụ na ya bụ ije abụghị nanị ha na-aga ya. Anyị hụrụ ya n'oge na ọ bụ ndhịagha ka anyị na ha kwụ na ha ga-ekwechiri."
Naanị ụzọ ha nwere ike isi dị ndụ bụ ma ekewara ha.
Dịka ha kpọchara ọtụtụ ụlọọgwụ n'ụwa naarịọ enyemaka, ezinaụlọ ahụ bịara Briten nlọọgwụ 'Great Ormond Street Hospital' dị na London n'afọ 2017.
Ibrahima nweburu olileanya na ụlọọgwụ ahụ ama ama bụ nke kewarala ọtụtụ ụmụejima jikọrọ ọnụ n'ụwa, ga-ekewali ha, ka ha were nwee ike laghachikwuru ụmụnne ha na Dakar, mana nke ahụ agaghị ka ha siri chee ya.
Nnyocha e mere gosiri na obi Marianne esichaghị ike ịnagide ọwụwa ahụ.

Ndị dọkịta dọrọ ezinaụlọ ahụ aka na ndị na ọ bụụ na ekewaghị ụmụejima ahụ, na o nweghị nke ga-adị ndụ gafee ọnwa ole ma ole.
Ndị dọkịta kwuru na ọ bụ Ndeye nwere ike ịdị ndụ ma ekewaa ha.
Ibrahima kwuru mgbe ahụ sị,"Nke a bụ igbu otu n'ime ụmụ ka nke ọzọ werere dị ndụ., ọ bụ ihe aagaghị ekwe m mee."
"Agaghị m ahọrọ onye ga-adị na onye ga-anwụ."
Nne ha laghachiri Afrịka ịga lekọta ụmụ ha ndị ọzọ,Marieme, Ndeye na nna ha bụ Ibrahima nọọrọ na Briten maka nleta ahụike, ha atọ kwagara Cardiff.































