World Sight Day: 'Ịtụnye mamiri maọbụ mmiri ara nwere ike itinye anya gị na nsogbu'

Aha onyonyo, World Sight Day: 'Ịtụnye mamiri maọbụ mmiri ara nwere ike itinye anya gị na nsogbu'.
Mgbe e biputara ya

Nsogbu anya dị na ụdị na ụdị.

Ụfọdụ e jiri ya mụọ ya, ebe ụfọdụ, ọ nọkatara ọ malite ha.

Ha gụnyere nke mere na ụfọdụ anaghị ahụ ihe tere aka nke Bekee kpọrọ 'Short-sightedness'.

Anyanwụ Promise Uchenna si na nsogbu ya bụ ebumpụtaụwa dịka o bididoro ya oge ọ nọ ọtakara.

O kwuru na ọ bụ na nwata ka ọ chọpụtara na ile ihe onyonyo dịka ụmụaka ibe ya na-ara ya.

Dọkịnta anya

Ejiogu Munachi chọpụtara na o nwere nsogbu dịka nwata dịka is ọwụẁa, anyammiri na nsogbu ịhụ ihe tere aka.

Dọkịta Okechukwu Egboluche kọwara na nsogbu ya dịka 'Shortsightedness.' maọbụ 'myopịa."

Njirimara dị iche iche na-eso nsogbu anya, mana naanị dọkịta anya nwere ike inye gị ọgwụgwọ maọbụ nleta zuru oke ma i nwee nsogbu anya.

Dkt Egboluche dụrụ ọdụ ka ndị mmadụ kwụsị ụfọdụ agwa omenala a na-eme nke dị o kwuru nwere ike ibutere ha ọghọm metụtara anya.

Ọ sịrị na ịtụnye maamiri maọbụ mmiri ara n'anya si na ị na-agwọ otu nsogbu anya nke a maọbụ nke ọzọ nwere ike itinye gị na nsogbu.