You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
"Ọchịchị onyekwuouche ya ka dị ndụ n'Afrịka" - Goodluck Jonathan
"Ọchịchị onyekwuouche ya ka dị ndụ n'Afrịka" - Goodluck Jonathan
Mgbe e biputara ya
Goodluck Ebele Jonathan bụbu onyeisiala Naịjirịa ekwuola na ọchịchị onyekwuoucheya ka dị ndị n'Afrịka.
O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere na mba Saụt Afrịka bụ ebe ọ gara ịnyocha etu ntuliaka mba ahụ sị abịa.
Ọ sị na kemgbe afọ ole ma ole gara aga, ọnọdụ ọchịchịonyekwuouche ya agbalitela karịa etu ọ dị na mbụ.
"Ọchịchị onyekwuouche ya ka na-etolite n'Afrịka mana ndị mmadụ ka chọrọ ka o mee ngwangwa" ka o kwuru na mkparịtaụka ahụ.
Jonathan sịkwa na usoro ntuliaka na mba dị icheiche n'Afrịka bụ otu ihe ị ga-achọtanwu na mba ndị Yurop na ndị ọzọ.
Gee okwu ya n'uju ebe a.