Ihe anyị ma maka ebe a sị ndị uweojii nwụchiri ndị Inec n'ebe ndị agboro chụsara ndị na-edenye aha maka 'PVC' na Legọs

Ebe foto si, Princess Idemudia
Nghọtahịe adapụtala banyere etu ọgbaghara si dapụta n'ebe a na-edenye aha maka inweta akwụkwọ e ji atụ vootu n'Ijesha dị na Legọs n'ụbọchị Fraide.
Akụkọ fegharịrị kwuru na ndị uweojii nwụchiri ndị ọrụ Inec dịka ndị agboro a sị ji ngwaọgụ wakporo ebe a na-eme ndebanye aha maka ntuliaka n'ụlọụka 'St. Bridget Catholic Church' dị n' ljesha, Surulere, Legọs, buru akọrọngwa ndị ọrụ Inec ji edebanye aha.
Mana ndị Inec na ndị uweojii steeti ahụ ekwuola na ọ bụghị eziokwu na a nwụchiri ndị ọrụ Inec maka ime ndebanye aha ebe "adịghị n'iwu" .
Ihe onyonyo na-egosi ihe ndị mmadụ nọ ebe ahụ kwuru na ihe ndị uweojii kwukwara
Akụkọ nnwụchi ahụ so ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia ụbọchị Fraide nke kwuru na ndị agboro ji ngwaọgụ wakporo ebe
Ndị nọ nso ebe ihe mere gwara BBC Igbo na n'ezie ndị agboro bịara chụsaa ndị mmadụ pụtara n'igwe idebanye aha n' nso St Bridget Catholic Church dị na Ijesjhatedo, Surulere Legọs n'ụtụtụ ụbọchị 29 ọnwa Julai afọ 2022.
Chidiebere Nwosu, onye gara idenye aha ya kwuru sị, "Ụnyahụ agara m idenye aha."
"Mgbe m rutere ndị mmadụ juru ebe ahụ. E mere ya maka ndị mmadụ niile ma ndị ụka, anyị nọ ebe ahụ ndị a dịka mmadụ iri batara buru akọrọngwa e ji eme ntuliaka, jụwa ihe mere e ji eme ya n'ụlọụka."
" Tupu ndị uweojii abịazia kpụrụ ndị Inec."
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Anyị nọrọ ebe ahụ ihe karịrị otu awa tupu ha alọghachie."
Princess Franca Okojie Idemudia sịrị " ndị agboro ji ngwaọgụ , buru ihe ndị ọrụ Inec ji ebebanye aha mana ndị uweojii bịara kpọrọ ndị ọrụ Inec gawa ogige ha."
Idemudia kwuru na oge nke a mere, na ndị mmadụ ruru 500 bịara idenye aha .
O gara n'ihu kwuo na dịka ndị Inec lọghachiri, na ọ bụ mmadụ 20 bụ ndị nwenwuru ike idebanye aha ha tupu ndị Inec emechie ọrụ ha.
Mana ndị uweojii Legọs steeti kwuru na akụkọ na ndị agboro chụsara ndị na-edebanye aha bụ akụkọ ụgha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC Igbo n'ekwentị sị,"Onye kwuru na ndị agboro wakporo ebe a na-edebanye aha weta ihe onyonyo ebe o mere."
" Ọ bụ ndị uweojii gara ebe ndị mmadụ na-eti mkpu na a hapụrụ ebe e kwesịrị Inec hiwere maka ndebanye aha bụ nke dị ụlọ atọ site n'ụlọụka na-eme ya n'ụlọụka".
" Anyị anwụchighị ndị ọrụ Inec, kama anyị kpọrọ ha ga n'ogige ndị uweojii ebe a gbara ha ajụjụ ọnụ ha kọwa ihe mere na ha chere na ọ bụ n'ụlọụka bụ ebe e zigara ha."
"Ebe ha nọ bụ n'ụlọ ọgbakọ ụlọụka nke dị iche na no 9A Imam Thani Street bụ ebe ha kwesịrị ịnọ nke bụ ụlọ atọ site n'ụlọụka ha nọ."
" Ndị uweojii hapụkwara ha ka ha lọghachi ebe ha kwesịrị ịnọ."
































