Nicholas Ukachukwu: Ka anyị jụọ ajụjụ anyị

Aha onyonyo, Mkparịtaụka BBC News Igbo na Nicholas Ukachukwu na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra Steeti na pati APC
Nicholas Ukachukwu: Ka anyị jụọ ajụjụ anyị
Mgbe e biputara ya

Mkparịtaụka BBC News Igbo na Nicholas Ukachukwu na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra Steeti na pati APC

Na mkparịtaụka pụrụiche BBC Igbo na Nicholas Ukachukwu n'ụbọchị Tọzde 30 Ọktoba, ọ kọwara ọtụtu ihe dị iche iche ọ chọrọ ime ma ọ bụ na o nweta mmeri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti a ga-eme na Nọvemba 8, 2025.
Nkọwa foto, Nicholas Ukachukwu na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti

Ọkpụrụkpụ okwu Nicholas Ukachukwu kwuru na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere

Nicholas Ukachukwu ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti, ekwuola na ọ bụ ajọ ọnọdụ Anambra Steeti nọ na ya mere o ji azọ ọkwa Gọvanọ steeti ahụ.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Mazị Ukachukwu kwuru na ebumnobi ya bụ iwulite ezi ọnọdụ ọchịchị, kwalite azụmahịa, mmekọ nakwa ezi ịdị n'otu n'Anambra steeti.

O kwuru na ọ bụrụ na o nweta mmeri na ntuliaka a ga-eme na Nọvemba 8, ọ ga-akwụsị ndị ọrụ gbanụgbanụ dịka Ọcha Brigade na ndị otu ha maka na ha anaghị erube isi nye iwu gọọmenti ji hiwe ha.

Ọ kọwara na n'ime ọnwa atọ ọ banyere n'ọkwá, ọchịchị ya ga-ebu agha megide ndị omekome gụnyere ndị aka akpa, ndị ojiegbe ezu, ndị ntọ nakwa ndị ọzọ na-akpa mkpamkpa na steet ahụ.

O mere ka a mata na ọchịchị ya ga-emeputa iwu ga-ahụ na e nwere ezi ntaramahụhụ nye onye ọbụla a nwụchiri maka mpụ ọbụla.

Ọ kọwara na ọ ga-enye ndị ọrụ nchekwa ezi nkwado iji hụ na ha kwụrụ chịm ibu agha megide ndị omekome ma weta ezi nchekwa zuruoke n'Anambra steeti.

Nicholas Ukachukwu kwuru na ọchịchị ga-eme ka ndị Anambra nwee ọkụ latrik. O kwuru na ya na ụfọdụ ụlọọrụ maara ihe ekwe na-akụ banyere ọkụ latrik amalitela ịkpa nkata banyere nke.

O kwuru na nke a ga-eme ka ndị ntorobịa Anambra Steeti nwee ọrụ.

Ọzọ dịka ibe ya bụ ọrụ ugbo nke Ukachukwu kwuru na ọ ga-enye ndị ọrụ ugbo nkwado zuru ezu iji hụ na ndị Anambra nwere nri oriri.

Mkparịtaụka BBC Igbo na ndi na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti