Good Friday: Gịnị ka ọ bụ na ihe mere e ji akpọ ya ụbọchị dị mma

A kpọgburu Kraịst n'elu obe nke Calvary

Ebe foto si, Getty Image

Mgbe e biputara ya

N’oge emume Easter bụ oge ndị okpukperechi Kraịst a kpọro ‘christains’ n’ụwa niile ji echeta ọnwụ nke Jesus Kraịst nwụrụ n’elu obe nakwa mbilite n’ọnwụ ya n’ime abalị atọ.

Ụbọchị ndị gbapụtara ihe a na-eme emume ndị a gụnyere ‘Holy Thursday’, ‘Good Friday’ na ‘Easter Sunday’.

Ụbọchị ndị a nwechara ihe pụrụiche banyere ha nakwa usoro ndị ụka Kraịst si eme emume ha.

Akụkọ a ga-eleba anya n’ịkọwa ihe bụ ‘Good Friday’ nakwa ihe ọ pụtara.

Gịnị bụ Good Friday?

Ngosi elu obe ebe a kpọgburu Jesus Kraịst

Ebe foto si, Thinkstock

Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị a kpọgburu Jesus Kraịst n’elu obe. Kedụzie ihe dị mma banyere ụbọchị a?

Akwụkwọ nsọ bụ ‘bible’ kwuru na a pịara ya ụtalị, bunye obe na-anyị nnukwu arụ bụ nke e mechara kpọgide ya n’elu ya. Ọ na-ara ahụ ịhụta ihe dị mma banyere ya.

Ụfọdụ ndị kwuru na ‘good Friday’ dị mma maka ọ na ọ dị nsọ, maọbụ na o kwesịrị ịbụ ‘God’s Friday’ mana ndị mmadụ kpọhiere ya.

Otu onye ọkammụta n’ụlọọrụ Oxford English Dictionary (OED) bụ Fiona MacPherson kwuru na “ọ pụtara oge maọbụ mgbe ndị okpukperechi ji eme emume”. Akwụkwọ OED kwuru na ‘good’ dị ka ọ dị n’okwu a pụtara ‘ụbọchị ndị ụka Kraịst na-ahụta ka ụbọchị dị nsọ’.

N’akwụkwọ otu ụlọakwụkwọ Katọlik dị na mba Amerịka dere site n’afọ 1885 ruo 1960 kwuru na ‘good Friday’ dị mma maka na Kraịst “gosiri nnukwu ịhụnanya o nwere n’ebe mmadụ nọ ma gotere ya ngozi niile”.

Kedụ mgbe a malitere ịkpọ ya good friday?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akụkọ kwuru na otu n’ime oge mbụ uru aha ‘good Friday’ bụ n’akwụkwọ nkọwa okwu a kpọrọ South English Legendary, e dere n’afọ 1290, na ihe a kpọrọ ya mgbe ahụ bụ ‘guode friday’.

Otu ụkọchukwu Katọlik n'Enugwu Steeti bụ Fada Benjamin Achi kwuru na emume 'good friday' malitere na senchuri nke anọ (4th Century) mgbe a chọpụtara obe ahụ Jesus Kraịst nwuru n'elu ya.

Fada Achi kọwara na obe ahu ezughizi oke mgbe a hụrụ ya mana e dosara akụkụ ya ahụ iji na-echeta ọnwụ Krịast nakwa ahụhụ ndị ọ tara n'elu ya.

Akwụkwọ ‘Encyclopedia’ mbụ nke ndị Katọlik e bipụtara n’afọ 1907 kwuru na ebe aha ahụ si pụta edochaghị anya. O kwuru na ụfọdụ ndị na-ahụta ya dịka ‘God’s Friday’ ebe ndị ọzọ kwuru na e si ya n’olu mba Germany bụ ‘Gute Freitag’. O kwuru na ndị obodo Anglo-Saxons kpọrọ ya ‘Long Friday’.

Akwụkwọ gara n’ihu kwuo na mba Greek na-akpọ ụbọchị ahụ ‘Holy and Great Friday’ nke pụtara ụbọchị dị ukwuu ma dị nsọ, ndị Rom na-akpọ ya ‘Holy Friday’ bụ ụbọchị dị nsọ ebe German na-akpọ ya ‘Sorrowful Friday’ nke pụtara ụbọchị iru uju.