Anambra: Okwu a akarịala gọọmenti ọwụwaanyanwụ Buhari tinye 'State of emergency' - Joe Igbokwe

Mgbe e biputara ya

Joe Igbokwe bụ onye enyemaka Gọvanọ Lagọs steetị n'ịdịọcha obodo nakwa ezigbo onye otu Bola Ahmed Tinubu, onyeisi ndị All Progressive Congress (APC) gwara gọọmentị etiti ka ha tinye ọnọdụ gbata gbata n'alaigbo nille gbaa gburugburu maka ọnọdụ enweghị nchekwa dị na-ebe ahụ.

Igbokwe sị na ihe na-eme n'ala Igbo ugbua bụ ihe ha na-akọpị n'ugwuawụsa.

Ọ sị, "Ọ bụghị naanị n'Anambra steetị ka e kwesiri ịme ya, ọ bụ n'ala Igbo niile maka na e jide ha (ndị ekperịma) na steeti a, ha agbafere n'ọzọ. Ihe na-eme ebe ahụ ugbua bụzị ịchụntaego".

Maka onye omeiwu Anambra steeti bụ Okechukwu Okoye, e gburu, Igbokwe sị na ya bụ ihe jọgburu udele sigbuoa nkakwụ

N'okwu ya, ọ sị "ndị ahụ mere arụ".

Ọ chetere ka ndị omekome n'ala Igbo siri gbaa ụlọ ya na ụlọ ndị ọzọ ọkụ nakwa ka e siri gbuo ndị agha, di na nwunye na nso nso a.

O kwukwara okwu maka ajọ ihe niile ndị ajọ mmadụ a mere sị na ndị ahụ e meruola ala Igbo.

"Anụ gbaa ajọ ọsọ, agba ya ajọ egbe".

O kwuru na ọtụtụ ajọ ihe ka ga-eme n'ọdị n'ihu.

Ọ sị na Chukwuma Solodu bụ Gọvanọ Anambra steeti kwesiri ịọ ga-zuoike uigbua rụọ mgbe ndị agha meminachara ndị ajọ mmadụ a., maka na ndị gọvano enweghị ike n'aka ndị uweojii maọbụ ndị agha,