Insecurity in Nigeria: O nweghizi ụzọ e si eme njem nwere nchekwa na Naịjirịa - Olusegun Obasanjo

Olusegun Obasanjo

Ebe foto si, Olusegun Obasanjo Presidential Library/FB

Mgbe e biputara ya

Onye chịbụrụ dịka onyeisiala Naijirịa bụ Olusegun Obasanjo ekwuola na ọ bụrụ na ndị Naijirịa ga-agwa onwe ha eziokwu, na ọnọdụ ha nọ na Naijirịa ugbua abụghị ihe otu onye ga-asị na ọ ga-emezi.

Ọ bụ mgbe ọ nabatara Ugochukwu Williams bụ onye chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala Naijirịa n'ọkọlọtọ otu pati PDP na ngwụcha ịzuụka n'ọba akwụkwọ onyeisiala nke dị n'Ogun Steeti.

Obasanjo kwuru sị, "Anyị kwesịrị ị bịa nọkọọ ọnụ maka ọnọdụ anyị, anyị enweghị nchekwa n'okporoụzọ, anyị enweghị nchekwa n'ụgbọ oloko, ya na ọdọ ụgbọelu".

Okwu ya na-esote mwakpo ndị omekome wakporo ụgbọoloko n'ụbọchị 28 nke ọnwa Maachị 2022.

Aha onyonyo, Ndị 'Bandits' nwere komishona ha na-akpọ aha mgbe ha wakporo anyị – Onye nọ ụgbọoloko ahụ

Nke a bụ okwu akpụ n'ọnụ dịka ndị mmadụ bu n'obi na ọ bụ ụgbọoloko kacha nwee nchekwa.

Egburu ụfọdụ mmadụ ebe atọorọ ụfọdụ ndị ọzọ na ya bụ mwakpo.

Onye bụ Olusegun Obasanjo?

Olusegun Obasanjo bụ aka chịbụrụ Naijirịa site n'afọ 1976 ruo afọ 1979 dịka onye agha ma chịkwaa site n'afọ 1999 ruo afọ 2007.

A mụrụ ya n'obodo Ibogun-Olaogun nke dị n'Ogun Steeti n'afọ 1937.

A na-echeta ya dịka onye gbara mbọ ịnyefe ndị nkịtị ọchịchị n'afọ ndị 1970 ma na-echeta kwa ya dịka onye wepụrụ ụgwọ niile Naijirịa ji n'ofesi.

Gbachie akara ekwentị ndị na-ejikọbeghị NIN na SIM kadị ha

Isa Pantami

Ebe foto si, NIMC/FB

Gọọmentị Naijirịa enyela ụlọọrụ na-eji ekwentị agbasa ozi nke gụnyere MTN. Globacom, Airtel na (Mobile ka ha gbachie ekwentị ndị na-edebabeghị akara NIN ha n'ime SIM kad ha.

Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Isa Pantami nyere iwu a n'ụbọchị mọnde ma sị na ya bụ iwu so n'usoro gọọmentị wepụtara iji hụ na-erubere iwu njịkọ NIN na SIM kad isi.

Pantami kwuru sị, "Onyeisiala ji obi ebere were dọọtịa oge ekwesịrị ịkwụsị ịdabanye akara NIN n'ime SIM kadị . . .ozi niile na-apụ apụ agaghịzị aga n'ekwentị ndị na-ejikọbeghị NIN na SIM kadị ha".

O kwuru na ndị nke ametụtara gaa jịkọọ NIN na SIM kadị ha n'ene ọ kwesịrị tupu ewepụ mmachị etinyere n'akara ekwentị ha.

Ọ bụ n'afọ 2020 n'ọnwa Disemba ka gọọmentị Naijirịa nyere iwu ka ndị mmadụ jikọọ akara NIN nanke SIM kadị ha dịka usoro nchekwa na Naijirịa.