Afam Icha-Ituma: Etu o si bụrụ 'VC' kacha bụrụ nwata n'Enugwu steeti

Mgbe e biputara ya

Ọkammụta Afam Icha-Etuma dị naanị afọ 47 (a mụrụ ya n'afọ 1975), mana ọ bụrụlarị ihe ọtụtụ ndị banyere ọrụ nkuzi na-arọ nrọ ya.

Icha-Etuma bụ onye isi mahadum (nke ndị Bekee na-akpọ Vice Chancellor) na Coal City University dị n'Enugwu steeti.

Na mkparịtaụka a ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwara etu ọkwa ya si rịgịde elu ruo ebe a ọ nọ ugbua.

Ọ kọwara na ụtọdụ ndị mmadụ anaghị ama ihe mere ha ji aga akwụkwọ, na ụfọdụ bụ sọ asambodo ka ha chọrọ.

Ọ kọwara na onye na-aga akwụkwọ kwesịrị ikwe ka akwụkwọ baa ya n'ime, ka o nwee ike bụrụ na-echepụta echiche ga-egbo mkpa n'ụwa.

Ọ kọwara etu e si mụnye ya n'ezinụlọ ndị ụbụrụ ha na-acha ọkụ n'agụmakwụkwọ dịka nna ya gụrụru nke dọkịnta akwụkwọ a na-akpọ PhD, ebe nne ya bụkwa onye nkuzi n'otu Enugwu steeti ahụ.

Ọkammụta Icha-Etuma gụrụ maka nmgbasaozi (Mass Communication) na mahadum Enugu State University of Science and Technology (Esut).

Gee ihe ọ kọrọ maka ndụ ya dịka onye isi mahadum n'uju: