Afam Icha-Ituma: Etu o si bụrụ 'VC' kacha bụrụ nwata n'Enugwu steeti
Ọkammụta Afam Icha-Etuma dị naanị afọ 47 (a mụrụ ya n'afọ 1975), mana ọ bụrụlarị ihe ọtụtụ ndị banyere ọrụ nkuzi na-arọ nrọ ya.
Icha-Etuma bụ onye isi mahadum (nke ndị Bekee na-akpọ Vice Chancellor) na Coal City University dị n'Enugwu steeti.
- 'Etu anyị si buru asụsụ Igbo gaa mahadum Oxford' - Nwelue na Umenyirioha
- Ịgba abụbụọrụ ekewaaala Asuu nke Mahadum Odumegwu Ojukwu
- Lee Chinonye Egbo, nwada dị afọ 24 na-akụzị na Enugu State University of Science and Technology
- Ihe dị mkpa ị kwesiri ima maka Binta Nyako bụ ọkaikpe nọ n’isi ikpe Nnamdi Kanu
- Tony Ubesie: Akatamkpo nwoke gbara mbọ maka nkwalite asụsụ Igbo
Na mkparịtaụka a ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwara etu ọkwa ya si rịgịde elu ruo ebe a ọ nọ ugbua.
Ọ kọwara na ụtọdụ ndị mmadụ anaghị ama ihe mere ha ji aga akwụkwọ, na ụfọdụ bụ sọ asambodo ka ha chọrọ.
Ọ kọwara na onye na-aga akwụkwọ kwesịrị ikwe ka akwụkwọ baa ya n'ime, ka o nwee ike bụrụ na-echepụta echiche ga-egbo mkpa n'ụwa.
Ọ kọwara etu e si mụnye ya n'ezinụlọ ndị ụbụrụ ha na-acha ọkụ n'agụmakwụkwọ dịka nna ya gụrụru nke dọkịnta akwụkwọ a na-akpọ PhD, ebe nne ya bụkwa onye nkuzi n'otu Enugwu steeti ahụ.
Ọkammụta Icha-Etuma gụrụ maka nmgbasaozi (Mass Communication) na mahadum Enugu State University of Science and Technology (Esut).
Gee ihe ọ kọrọ maka ndụ ya dịka onye isi mahadum n'uju:


