Uche Nwosu: E resịghị m ọgọ nwoke Rochas Okorocha ala Imo
Kemgbe ọ hapụrụ ọchịchị na 2020, Uche Nwosu na ezinaụlọ ya agabigala ọtụtụ ihe n'Imo steeti.
E bola ya na ndị be ya ọtụtụ ebubo nke gụnyere ịwere ala ndị mmadụ n'ike nakwa ịweghara ihe ndị steeti ahụ.
Nke ikpeazụ bụ mnwuchi ndị uweojii nọ na obi gọọmenti Imo steeti nwuchiri ya n'ụbọchị iri abụọ na isii, ọnwa Disemba 2021 n'ụlọ ụka St. Peters Church, Eziama dị na Nkwere, Imo steeti.
Ndị otu a batara n'ime ụlọ ụka gbaliwe egbe elu, kpọrọ Maazi Nwosu gbalaga.
Gọomentị Imo steeti agọọla na aka ha adịghị na ya bụ mnwuchi maọlị.
Uche Nwosu gwara BBC Igbo ihe ya hụrụ ụbọchị ụka ahụ bụkwa ụbọchị ọ kaara nne ya nwụrụ anwụ ụka.
Ọ sị na ndị bịara ya bụ njem e gosighị ya akwụkwọ ikike ha ji bịa ịjide ya.
O kọkwara ka ha sị yipu ya akwa ya mee ya akaje n'ihu ọha mmadụ.
BBC jụkwara ya maka ebubo ala niile a na-ebo ya na steeti ahụ.
Nwosu sị na ọ nweghị ala mmadụ maọbụ nke steeti ya na ọ gọ ya nwoke bụ Rochas Okorocha nweere.
O kwuru maka ala ebe nwunye Okorocha rụrụ Royal Sping Palace bụ nke ọ sị na "Ọ bụghị oge nke m ka e nyere ya ala ahụ. A chịchala ọchịchị tupu enye ha ala".
O kwuru na ihe dị iche na gọọmentị Uzodimma na nke Rochas bụ na gọọmentị ka diri ndị mmadụ nso mgbe Rochas karịa ugbua.
O kwukwara na ihe kacha mkpa ugbua na steeti ahụ bụ udo na ihunanaya bụ nke kọrọ ụkọ ugbua.
O kwuru na ihe ka ya njọ bụ mmebọ e mebọrọ ya n'ụlọ ụka ụbọchị ya na eru uju nne ya.
Father Cliford Eze kọwara ka ihe siri mee n'ụbọchị ahụ na ka obodo siri gbakasie mgbe ndị uweojii ahụ gbawara egbe.
Onye bụ Uche Nwosu?
Uche Nwosu bụ onye so dọọ ọkwa Gọvanọ Imo steeti na ntuliaka 2020.
Ọ bụ ọgọ Gọvanọ na-achị mgbe ahụ bụ Rochas Okorocha.
Ọ rụrụ ọrụ na gọọmentị Okorocha dịka:
Osote onye nlekọta ndị ọrụ oyibo (Depty Chief of staff) - 2011 - 2013
Kọmishọna na-ahụ maka ala (Commissioner for lands) - 2013 - 2015
Onyeisi nlekọta ndị ọrụ oyibo (Chief of Staff) - 2015 - 2019