Atọrọla Eze mmụọ ndị Owerri na onyeisi otu ndị obodo Owerri Nchi-Ise n’Imo steetị

Reginald Ejiohu bụ Eze mmụọ Owerri

Ebe foto si, Reginald Ejiohu

Mgbe e biputara ya

Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị na-ekwu na ndị omekome tọọrọ Eze mmụọ Owerre bụ Reginald Ejiogu na onyeisi otu ndị obodo Umunwagbara bụ Sunny Unachukwu n'Imo steetị taa bụ Satọde.

Dịka ndị nọ ebe ahụ ihe a me si kwụọ, a tọọrọ ụmụnwoke abụọ ahụ n'okporoụzọ Christ Church dị na Owerre.

Ndị a nọ ihe a mee na-achọghị ka akpọọ aha ha gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ihe a mere n'ụtụtụ Satọde.

Otu onye ntaakụkọ na-agbasa ozi na redio n'Owerre a ma ama dịka Chinonso Ubah gbara ama ihe a mere ebe ọ sị:

"Ndị o ji egbe tọọrọ ha abụọ n'okporoụzọ Christ Church nọ nso Ihugba street, n'Owerre"

O kwukwara:

"Ndị mmadụ na-agba mbọ ugbua a ichọta ha dịka ha na-aga n'ụlọọrụ ndị uweojii dị icheiche n'Owerre achọ ha mana o nwebeghi onye ma ebe ndị ugbua"

Ndị bi ahụ nọ n'ụjọ dịka ha kwuru:

"Anyị ahụbeghi ihe dị etu a, ndị ntọ kara obi tọrọ anya ndị mmụọ n'Owerre. Ihe nke a bụ ihe imerụ ala nakwa imetọọ omenala anyị"

Mbọ niile BBC Igbo na-agba ịnụ ọnụ Michael Abbattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ adibeghi ire dịka ọ zaabeghi ekwe ntị ya ruo ugbua.

Cheta na nke a na-abịa dịka ndị omekome na-atọrọ ndị isi obodo, ndị Igwe nakwa ndị Eze odinala n'Imo steeti agharaghara na nso nso a.

Akụkọ ka na-abịa.