Biafra Separatists: Lee aha mmadụ 19 na-achọ nnwereonwe Biafra ụlọikpe tọhapụrụ ka ha nọchara nga afọ 15

Ndị na-achọ nwereonwe a tọhapụrụ na mkpọrọ na nsonso a.

Ebe foto si, MASSOB

Mgbe e biputara ya

Otu Massob egosipụtala ọnụ ndị otu ha nwere onwe ha site mkpọrọ atụnyere ha kemgbe afọ iri na ise maka mbọ nnwereonwe Biafra ma kelee ndị nyere ha aka gbaa mbọ ịhụ na o mezuru.

Na nsonso a, Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị N'ọka, Anambara steeti tọghapụrụ ndị otu Massob mmadụ 19 bụ ndị e ji na mkpọrọ dị n'Ọnịcha nakwa Ọka, sị ha lawa, na ikpe amaghị ha.

Aha onyonyo, 'Otu ihe ga-ebi ọchụchụ Ipob na Massob'

Ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Comrade Samuel Edeson gwara BBC Igbo n'ekwentị na 'Obi dị anyị nnukwu ụtọ na ha nweere onwe ha."

"Anyị na-ekele n'ụzọ pụrụiche Senetọ Enyinnaya Abaribe na ndị ọzọ nyere aka hụ na nke a bịara na mmezu."

Ihe Massob kwuru maka October 1

Ndị ritere erere ntọhapụ na nga gụnyere otu nwaanyị nke mụrụ nwa n'ime mkpọrọ nke nwa ya rurula afọ 14.

Lee aha ụfọdụ n'ime:

1:Mrs Onyekachi Orji ( Mkpọrọ Ọnịcha)

2: Emmanuel Orji (Mkpọrọ Ọka)

3:Uche Idikaigbo (Mkpọrọ Ọka)

4:Micheal Okezie (Mkpọrọ Ọka)

5:Uchenna Nicholas ( Mkpọrọ Ọnịcha)

6:Peter Igbokwe ( Mkpọrọ Ọnịcha)

7:Ikechukwu Aghara (Mkpọrọ Ọka)

8:Miss Okwudiri Bassey ( Mkpọrọ Ọnịcha)

9:China Asor (Mkpọrọ Ọka)

10:Chinweike Irondi (Mkpọrọ Ọka)

11:Sabastine Amadi ( Mkpọrọ Ọnịcha)

12:Casmir Odakara (Mkpọrọ Ọka)

13:Ojemba Anyanwu (Mkpọrọ Ọka)

14:Eni Kalu (Mkpọrọ Ọka)

15:Ndubuisi Okam(Mkpọrọ Ọka)

16: Ikechukwu Chikwem ( Mkpọrọ Ọnịcha)

17:Chukwuma Kalu (Mkpọrọ Ọka)

18:Chidiebere Chikwem (Mkpọrọ Ọka)

19:Mmaduabuchi Asika (Mkpọrọ Ọka)