Anambra Election: Ihe ndị mbịarambịara nọ n'Anambra chọrọ n'aka gọvanọ ọhụrụ ga-achị steeti ahụ

Aha onyonyo, Anambra Election:Ihe ndị mbiarambiara nọ n'Anambra chọrọ n'aka gọvanọ ọhụrụ
Mgbe e biputara ya

Dịka Anambra steeti nweterela gọvanọ ọhụrụ, lekwa ihe ụfọdụ ndị ugwu bi na steeti ahụ na-atụ anya n'aka gọvanọ ọhụrụ ga-amalite chịwa na March 17, 2022.

Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo ji ọkọlọtọ pati All Progressive Grand Alliance (APGA), meriri ntụliaka nke ọkwa gọvanọ Anambra steeti e mere n'ụbọchị Satọde, November 6, 2021.

O ji vootu ruru otu narị na ụma (112,229) wee merie Valentine Ozigbo nke Peoples Democratic Party chịtara vootu iri ise na atọ na ụma (53,807).

Cheta na ndị otu Indigenous People of Biafra gwara ndị Anambra ka ha ghara ịpụta mee ntuliaka a mana ha mechara si ha pụta mee ntuliaka ahụ.

Ihe mere akụkọ a ji mkpa?

Dịka ọtụtụ nghọtaghie dị n 'etiti ndị na-achị ehi na ndị na-akọ ugbo na-efegharị n'ala Igbo, ọ dịmkpa ka ndị mmadụ ghọta na o nwere ọtụtụ ndị ugwu bi n'ala Igbo na-enweghị nsogwu ọbụla.

Chetakwa na ndị otu Idigenous People of Biafra (Ipob) bụ otu na-achọ nwereonwe ndị Igbo kwuru ka ndị Igbo kwụsị ịzụ ngwaahịa ndị ugwu ọbụla na-abata ala Igbo n'afọ 2021.

N'afọ 2017, ka otu ndị ugwu ruru iri na isii nyere iwu ka ndị Igbo niile bi n'ugwu Hausa si ebe ahụ gbapụ , ọ bụrụ na ha emeghị nke a ihe ọbụla ha hụrụ ha were.

Onyeisi ndị ugwu bi n'Anambra kwuru na kamgbe okwu a malitere, na ha kpokọbara otu na-elebanye ya anya.

O kwuru na ọ ga-achọ ka gọvanọ na-abata ọhụrụ n'Anambra steeti tinye mmadụ ole ma ole n'ime ha n'ụlọọrụ ya maka ịnọchite anya ha ọfụma na steeti ahụ dịka gọvanọ Willie Obiano si mere ha n'oge ya.

Gịnị bụ Ipob?

Ipob pụtara 'Indigenous People of Biafra'.

Ọ bụ otu na-azọ ka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụrụ obodo nke aka ya.

Mana gọọmentị Naịjirịa akpọọla ha otu na-eyi ndụ egwu, ma kwuo na o megidere iwu mmadụ isonye n'otu ahụ.

Gere ihe ụfọdụ ndị ugwu bi n'Anambra steeti kwuru n'uju ebe a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: