Annie Idibia and 2face: Ihe ọhụrụ nwanne Tuface gwara Annie Idibia

Ebe foto si, Annie Idibia/Instagram
Dịka okwu ka na-ebiri ọkụ n'etiti Annie Idibia bụ nwunye otiegwu Tuface nakwa ndị ezinaụlọ ya ihe ọhụrụ apụtala
Nwanne Tuface bụ Charly eboola Annie ebubo ọhụrụ ị wakpo Tuface ma kparịa ya n'ihu ndị ọrụ ya na ndị enyi ya.
N'ozi o depụtara n'akara Instagram ya na Annie kwara Tuface nir, maa ya karama Hennessy ma na-etikpo ya mkpu mgbe niile.
"Ị gwara ndị orụ gị kpọchie ụzọ zitere gị igodo na Saut Afrịka ebe ị ma na mma m si Abuja bịa ileta ụmụ ya" ka o gwakwara Annie.
Rue ugbua, o nwebeghi ihe Annie zaghachiri ya dịka ọ zaghachiri ya n'ebubo mbụ Charly boro ya.
Ihe i kwesịrị ịma maka Annie Idibia bụ nwunye 2face

Ebe foto si, Instagram/Annie Idibia
Nwada Annie Idibia bụ nwunye 2face chipụtachara di ya ụkwụ n'ama na soshal midia n'ihi ihe ọ sị na ọ na-agabiga n'ezinaụlọ ha.
Kamgbe o mechara nke ahụ ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ ya nke mere aha ji na-ewu ewu.
Mana onye ka nwada a bụ? Nke a so n'ihe akụkọ a ga-eleba anya,
Ihe I kwesịrị ịma maka Annie Idibia

Ebe foto si, Annie Idibia/Instagram
- Annie bụ nwafọ obodo Eket dị n'Akwa Ibom Steetị.
- A mụrụ ya n'Ibadan n'ụbọchị 13 nke ọnwa Nọvemba afọ 1984.
- O sooro nne ya laa Legọs, mgbe nne na nna ya gbara alụkwaghịm.
- Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Legọs Steetị na ngalaba 'Computer science' nakwa 'Theatre Arts'.
- Ọ lụrụ oti egwu a ma ama bụ 2face ebe ha mụrụ ụmụnwaanyị abụọ Isabella na Olivia.
- Ọ na-eme ihe nkiri Nollywood bụ ebe o mere ọtụtụ ihe nkịrị gụnyere First Family, Blackberry Babes, Estate Runs dgz.
'Soshal midia abụghị ebe a na-ekpezi okwu di na nwunye' - Nkechi Blessing, Junior Pope

Ebe foto si, Instagram/AnnieIdibia/NBS/Jnrpope
Ndị a ma ama etinyela ọnụ n'etu Annie Idibia si buputa esemokwu dị n'etiti ya na di ya bụ Tubaba (2face) na soshal midia.
Ndị gụnyere ndị ejije Nollywood a ma dịka Junior Pope, Nkechi Blessing Sunday nakwa Bisi Alimi bụ onye a ma ama maka ikwado mmekọrịta nwoke na nwaanyị, so tinye ọnụ.

Ebe foto si, Instagram/Bisi Alimi/Harrysong

Ebe foto si, Instagram/Nkechiblessingsunday

Ebe foto si, Instagram/Bisi Alimi/Harrysong
'Agaghị eji aka ekpuchi eziokwu ebighebi' - Nwanne 2face

Ebe foto si, Instagram/Charlybrave
Nwanne Innocent Idibia '2face' bụ Charles Idibia asaala Annie Idibia n'ihe o kwuru gbasara nwanne ezinaụlọ ha ịmịkọrọ ya.
Ihe nwanne 2face sara Annie
Charles sara okwu Annie kwuru n'ebubo o dere n'Instagram ya, ebe ọ sị na ezinụlọ Tubaba so akpa nkata na-etisa alụmalụ ha.
Annie bokwara ha ebubo itinye 'straw' n'ahụ nwanne ha na-amị ya chọọọọ.

Ebe foto si, Instagram/Annieidibia
Charles Idibia dere n'akara Instagram ya na obi adighi 2face mma cha cha mana na ọ nọnyere Annie makana ọ bụ onye okpeudo.
Charles gakwara n'ihu bo nne Annie ebubo na ọ na-agwọ ọgwụ.

Ebe foto si, Instagram/Charlybrave
O dere sị: "I che na ezinụlọ anyị bụ nke ndị iberibe maka na anyị bụ ndị okpe udo.
"Akụkọ Disney a ị buru pụta ugbua bụ ihe mere kemgbe afọ gara aga mana ị na-akọ ya ugbua makana i nwetaghi ihe ị chọrọ.

Ebe foto si, Instagram/Annie Idibia
"Ị chọrọ imetọ aha di gị n'ihu ọha mana ị ma na di gị anaghị achọ okwu n'ihu ọha. Ị chere na nke a bụ ezigbo akụrụngwa ị ga-eji merie na-agha a? E chekwara m na ị ma ihe ka ọ bụ na onye na-eresị gị ọgwụ ike gị enyeghị gị nke dị mma taa?
"Agbakwala ọsọ, bịakwa ka anyị kọwaziere ọha ihe na-eme, ka ha tinyere anyị ọnụ ebe ị chọrọ ịkụwa akị oyibo Nsugbe n'ihu ọha".
'Tubaba na m gbachiri gị nkịtị emeghị m onye iberibe' - Annie Idibia
Ọ dị ka agwọ abanyela n'akịrịka n'alụmdinanwunye Innocent Idibia a ma dịka 'Tubaba maọbụ 2face' na nwunye ya bụ Annie.
Annie Idibia depụtara n'akara Instagram ya n'ụbọchị Tọọzde sị "Abụ m nwaanyị nwere ndidi, abụghị m onye iberibe. Bido na mbido, onweghị mgbe ezinụlọ gị ji hụ m n'anya. N'agbanyeghi mbọ niile m na-agba mana ọ naghị ezuru ha."

Ebe foto si, Instagram/AnnieIdibia1
Annie gakwara n'ihu dee, "Anwaala m ịnọ nwayọ kemgbe, ọ bụghị gị bụ onye mbụ n'ụwa ụmụnwaanyị ndị ọzọ mụrụla ụmụ. I nwere ike ime ọfụma karịa etu a. Ihe niile m na-eme kemgbe bụ igosi ụwa na ị bụ ezigbo mmadụ"
Nwunye 2face gakwara n'ihu kụwaa aki onyibo Nsugbe mgbe o depụtara "Nke a i mere taa; gị, Efe, Frankie na ndị ezinụlọ unu mere, anabataghi m ya cha cha."
"Kedụ ụdịrị nwoke na-eduga ụmụ ya ebe egwuregwu Disney ma saa anya duru ụmụaka ahụ gaa lakwuru nne ha na-abụghị nwunye gị n'ụlọ? Ụgbọrọ ọle ka gị na ụmụ gị garala hụkọ Pero ọnụ ma ọ nọnyere gị na ụmụ aka ahụ n'ụlọ.
Ihe dị etu a emebuọla mbụ n'afọ 2015 na 2016 ebe ha abụọ bu esemokwu ha pụta sọshal midia. Ihe kpalitere esemokwu ha mgbe ahụ bụ foto pụtara na sọshal midia gosiri ihe dịka ebe 2face na-esusu Pero ọnụ n'afọ 2015.
Ihe a na-eme n'etiti 2face na nwunye ya bụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua na soshal midia nke mere ndị mmadụ ji ajụ "Di na nwunye ekwesịrị iburu esemokwu ha pụta Soshal Midia?"
Cheta na Tubaba na nwunye ya Annie bidoro ime enyi kemgbe afọ 2004 mgbe ha zutere na Even Ezra Music Studio.
N'agbanyeghi na ọtụtụ ihe chere ha aka mgba nke gụnyere na Tubaba atụnyebuola ụmụnwaanyị abụọ ime ha amụọrọ ya ụmụ ise, Tubaba gara n'ihu rịọ Annie ọlụlụ n'afọ 2012.
Ha abụọ lụrụ n'ụbọchị 23 nke ọnwa Maachị nke 2013. Ha ebiela kemgbe ahụ ruo ugbua.
Ya na Annie amụọla ụmụ abụọ (ụmụnwaanyị) kemgbe ahụ.




























