Sit at home order: Ihe ise ga-akwụsị atụmatụ a Ipob na-eme – Elliot Uko

Mgbe e biputara ya

Mmachị ngagharị Ipob mere ụnyahụ bụ August 9,2021 ka kpụ ọkụ n'ọnụ dịka ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo na-ekwu okwu gbasara ya.

Elliot Ugochukwu Uko chọpụtara otu Igbo Youth Movement kwuputere ọtụtụ ihe o chere ga-akwụsị mmachị ngagharị Indigenous People of Biafra na-eme n'ala Igbo.

O kwuru na ọ ga-adị mma ka gọọmenti etiti jụọ onwe ha, "ụmụaka a na-ekwu na ha achọghịzị ịbụ ndị Naịjirịa, kedụ ihe bu iwe ha?".

Ụkọchukwu Ukoh kwukwara ụzọ ndị ọzọ a ga-eji kwụsị sit-at-home ndị otu Ipob na-emekarị.

"Imachị ngagharị n'ụbọchị Mọnde ọbụla ga-enye ala Igbo nsogbu"

Ohaneze Ndigbo ekwuola na imachị ndị mmadụ ịgagharị n'ụbọchị Mọnde agaghị enyere ala Igbo aka.

Odee akwụkwọ otu ahụ bụ Chiedozie Alex Ogbonnaya kwuru nke a mgbe ọ na-ekwu maka etu iwu "sit at home" nke Indigenous People of Biafra malitere n'August 10,2021.

O kwuru na iwu mmachị a ga-emetụta azụmahịa ndị Igbo tụmadị ndị na-esi mba ndị ọzọ abịa azụ ahịa n'ala Igbo.

Ogbonnaya kwuru, "Anyị ga-achọ ụzọ ọzọ anyị ga-eji mee ka gọọmenti etiti mara na etu ha si ka jide Nnamdi Kanu na-ewute anyị."

"Nke mere ụnyahụ metụtara ụmụaka anyị na-ele ule National Council Examinations(NECO)."

Ogbonnaya kwuru na ihe ndị otu Ipob na-achọ bụ ihe ziri ezi mana ọ ga-adị mma ka ndị Igbo niile akpa akpa ka amara ụzọ ka mma a ga-esi sowe ya.

O kwuru na Ohaneze NdiIgbo akwadoghị tigbuo zọgbuo mere ụnyahụ.

"O bụrụ na ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume ndị Ipob, ụkọchukwu, Ohaneze Ndigbo nakwa ka akpa maka ụzọ a ga-esi kwọ onye ije ukwu wara, ka ije wee kwe ọgịga."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: