Ị chọrọ ka ahụ gị na-akwọ mụrụ mụrụ? Lee ihe 8 ị ga-eme.

Aha onyonyo, Ị chọrọ ka ahụ gị na-akwọ mụrụ mụrụ? Lee ihe 8 ị ga-eme.
Mgbe e biputara ya

Ọtụtụ mmadụ na-achọ ka ahụ ha kwụọ mụrụmụrụ makana ọ bụ otu ụzọ esi ama onye mara mma.

Nke mere na ndị mmadụ na-agbasi mbọ ike ịhụ na anụ ahụ ha mara mma n'anya.

Nchọcha BBC mere gosiri na mmetọ ikuku Bekee kpọrọ "pollution" so n'ihe na-eme ka ahụ mmadụ ghara ịna akwọ mụrụ mụrụ.

Ihe ọzọ bụ ajọ ude nakwa ihe otite ndị ọzọ, nri nakwa ahụike onye ahụ.

E nwekwara ebumpụtaụwa ihe ndị ọzọ na-esokwa ebute mgbanwe n'ahụ mmadụ dịka nka.

Ihu nhịkọ maọbụ akara nka Bekee kpọrọ "wrinkles" so na ebumpụtaụwa nke onweghị ihe ihere dị na ya.

Mana ọ bụrụ na nsogbu gị bụ ahụ gị ịkwọ mụrụmụrụ, lekwa ihe ndị ị ga-etinye anya na ya.

Mgbe BBC kpọtụụrụ ọkammụta gbasara nlekọta akpụkpọ ahụ na UNTH Enugwu bụ Ọkammụta Uche Ojimma ka ọ waa anyị anya maka nke a.

Ọ kọwara na akpụkpọ ahụ mmadụ niile abụghị ofu.

Ebe ọ dị mfe ịme ka ụfọdụ kwọọ mụrụmụrụ ozigbo, ọ na-ahịa ndị ụfọdụ ahụ.

Ebe ụfọdụ sị n'afọ dị mma, ụfọdụ kwesiri ịlekọta anya.

O kwuru na ahụike mmadụ na-egosikwa na ahụ ya maka ọbara adịghị n'ahụ, okpo maọbụ ịba nwereike ịme ka anụ ahụ mmadụ dị njọ.