Procrastination: Ụzọ isii ị ga-esinwu kwụsị "e mechaa e mechaa"

Onye na-esebiri ụra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye na-esebiri ụra
    • Onye dere ya, Claudia Hammond
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Future
  • Mgbe e biputara ya

Onye ọbụla na-enwe mgbe ha na-egbutu oge n'ime ihe ha kwesịrị ime, mana ọ na-abụ nsogbu mgbe ị megidere ya ọ bụrụzịa njirimara gị.

Oke "e mechaa e mechaa" nwereike ịdị njọ nye ahụike gị, tinye gị n'ihe mgbakasị ahụ ogologo oge, mee gị ka ị ghara iyinye mgbe ị ga na-eme mgbatị ahụ maọbụ iri ezigbo nri ga-adị ahụ gị mma, maọbụ nke kacha njọ, mee ka ị ghara ịga hụ dọkịta ma e nwee etu ahụ si eme gị.

Lee ihe ndị nchọpụta kwuru nwere ike inyere gị aka ịkwụsị agwa ọjọọ a:

1. Echezila ka mkpebisiike (willpower) nyere gị aka:

Ndị na-agbatị ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mkpebisiike nwereike imezuru gị ihe ị chọrọ mgbe ụfọdụ, mana o karughi aka imezu ya oge ọbụla

Ian Taylor, onye ọkachamara n'akparamagwa ndị egwuregwu na-agụ maka ikpalite mmụọ na mahadum Loughborough, achọpụtala na ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-eche na ọ bụ ike nke aka bụ azịza nsogbu ha.

O kwuru sị "mkpebisiike bụ otu ụzọ e si akpalite mmụọ, mana ọ bụghị ya kacha mma".

Kama ịtụkwasị obi n'elu mkpebisiike iji mee ka ị chefuo etu ọrụ si raa ahụ, buru n'obi ma lekwasị ya anya dịka eze a ma na a ga-echi na ọrụ dị mkpa ị ga-arụ iji mezuo nchekwube gị.

Ọ bụrụ na ị na-agba ọsọ ihe ruru nkeji iri atọ, akwara fụwa gị ụfụ, ọ bụchaghị ihe ọjọọ imegide gị, were ya na ọ bụ ụzọ ahụ gị si agbasi ike.

2. Chọọ ihe ọma n'ime ọrụ ahụ ị na-eme "e mechaa e mechaa"

Nwaagbọghọ dị ka ọ mụ anya arọ nrọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, M ga-ebido ime ya n'oge na-adịghị anya

Ọ bụ ụjọ na ị gaghị eme ya nke ọma mere ka ị na-egbu oge ịrụ ọrụ ahụ?

Fuschia Sirois, si mahadum nke Sheffield ejirila ihe karịrị afọ 15 na-enyocha ihe gbasara igbu oge, ọ chọpụtala na nsogbu "e mechaa" anaghị abụkarị umengwụ maọbụ amaghị etu e si ejikwa oge - ọ na-esikarị n'etu mmadụ si ahazi mmetụta uche ya.

Ọ na-echekasị gị na ị nwereike ịda, ị ga-achọta ngọpụ ị ga-eji gbuo oge imepụta ọrụ ahụ maọbụ gbara ime ya ma ncha nakwa ụzọ ị ga-esi ghara inwe obi adịghị mma.

Mana nke a nwereike ibute onye ahụ n'ọnọdụ imere gawa n'ihu: makana oge ahụ ị gburu emeela ka oge ị ji arụ ọrụ belata, mee ka ụjọ na ị gaghị emeta ya gbalie ma mee ka obi na-amapụ gị maka ya nke nwereike ime ka ị ghara imalite ya maọlị.

Iji kwụsị ihe ọjọọ ndị a, chọọ ihe ndị ọma dị n'ime ọrụ ahụ: ị nwereike ịmụta ihe n'ime ya maọbụ ị nwee mmasị ime ya karịa ihe ị tụwara anya.

3. Buru ụzọ mee atụmatụ!

Nwaanyị kwụ n'ime ọhịa na-ele oge anya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ị nwereike ịmụta etu e si eburu ụzọ mee atụmatụ

Ị mara na e nwere ọnwụnwa na-akwanye gị ka ị gbuo oge ghara ime ihe dịịrị gị, ṅomie akparamagwa a na-akpọ "ọ bụrụ na - ya bụ na" - mgbe ị ga-atụpụta atụmatụ ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọnwụnwa ahụ dakwasị gị.

Peter Gollwitzer bụ ọkachamara n'akparamagwa si mba Amerịka nyochara mmadụ 94 site n'atụmatụ a ma chọpụta na ha nwere mmasị imezu nchekwube ha ugboro abụọ maọbụ karịa ndị ọzọ na-amaghị maka atụmatụ a.

4. Wetuo mbọ ị na-etinye

Nwatakịrị na-apị ekwentị ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Họrọ okwungafe "password" toro ogologo ma raa ahụ maka iji agbape soshal midia gị - o nwereike ime ka ike gwụ gị mgbe ị ga-achọ ịga gbuo oge ebe ahụ

Ime nke a ga-eme ka ọ dịrị gị mfe imalite.

Ị nụla maka ihe a kpọrọ "choice architecture"? Ndị na-ere nri malitere itinye mkpụrụosisi nso ebe a na-akwụ ụgwọ karịa itinye chọkọleti, nke mere ka ndị na-azụ nri na-eri ihe na-edozi ahụ.

Ọzọ bụ ikwado onwe gị n'oge; ọ bụrụ na ị ga-aga ọrụ n'ụtụtụ, ị wepụta ọrụ i nwere ịrụ n'abalị nke ga-eme ka ọ bụrụ ihe mbụ ị ga-ahụ n'ụtụtụ ma malite ime ya.

Cheta wepụ ihe ndị ga-adọpụ uche gị dịka ịhapụ soshal midia, itinye ekwentị gị ka ọ ghara ịkụ egwu ma mmadụ kpọo gị, maọbụ ịgbanyụ ya agbanyụ.

5. Kwụọ onwe gị ụgwọ

Ndị na-awụbanye na mmiri

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ị rụchaa ọrụ gị n'oge, i nwee ike gaa lere onwe gị ọbịa ọsịsọ

Nchọpụta Kaitlin Woolley mere na mahadum Cornell gosiri na dịka ị si tụwa anya, ịkwụ onwe gị ụgwọ ozugbo na-ajalite ndị mmadụ ka ha tinye uchu n'ihe ha na-eme karịa ụgwọ a na-eche ma na-enwere olileanya.

"E mechaa e mechaa" na-aba n'anya makana igbu oge n'ọrụ nwereike ịra gị ahụ dị ka ịkwụ onwe gị ụgwọ ozugbo - nke bụ na ị ga-agba mbọ isi ụzọ ọzọ kwụọ onwe gị ụgwọ.

Chọta nke na-agara gị ma jiri ya jalite ma kwe onwe gị nkwa ma mezuo ya ma ị rụchaa ọrụ ahụ.

6. Aha ị kpọrọ onwe gị ka ị ga-aza

Ogbu oge

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ị gwa onwe gị na ị bụ odeakwụkwọ, ị ga-agba mbọ tụtụrụ mkpịsịodee gị dee ihe

Ihe ntakịrị dịka asụsụ ị ji dee ya nwere uru ọ bara.

Akpọzịla onwe gị "onye na-anọtu nnyochaa nri ọ na-eri" maọbụ onye na-anọtu agba ọsọ, ị kwuo na ị bụ onye na-agba ọsọ, ị ga-etinye uchu n'ịgba ọsọ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Igbo Language: Lee aha Igbo ndị mmadụ kpọrọ 'Graduate'

IMPORTANT INFORMATION - Please make sure you tag our content. Under the Tags tab, in the Campaigns dropdown, select CS