Procrastination: Ụzọ isii ị ga-esinwu kwụsị "e mechaa e mechaa"

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Claudia Hammond
- Ndị mere akụkọ a, BBC Future
- Mgbe e biputara ya
Onye ọbụla na-enwe mgbe ha na-egbutu oge n'ime ihe ha kwesịrị ime, mana ọ na-abụ nsogbu mgbe ị megidere ya ọ bụrụzịa njirimara gị.
Oke "e mechaa e mechaa" nwereike ịdị njọ nye ahụike gị, tinye gị n'ihe mgbakasị ahụ ogologo oge, mee gị ka ị ghara iyinye mgbe ị ga na-eme mgbatị ahụ maọbụ iri ezigbo nri ga-adị ahụ gị mma, maọbụ nke kacha njọ, mee ka ị ghara ịga hụ dọkịta ma e nwee etu ahụ si eme gị.
Lee ihe ndị nchọpụta kwuru nwere ike inyere gị aka ịkwụsị agwa ọjọọ a:
1. Echezila ka mkpebisiike (willpower) nyere gị aka:

Ebe foto si, Getty Images
Ian Taylor, onye ọkachamara n'akparamagwa ndị egwuregwu na-agụ maka ikpalite mmụọ na mahadum Loughborough, achọpụtala na ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-eche na ọ bụ ike nke aka bụ azịza nsogbu ha.
O kwuru sị "mkpebisiike bụ otu ụzọ e si akpalite mmụọ, mana ọ bụghị ya kacha mma".
Kama ịtụkwasị obi n'elu mkpebisiike iji mee ka ị chefuo etu ọrụ si raa ahụ, buru n'obi ma lekwasị ya anya dịka eze a ma na a ga-echi na ọrụ dị mkpa ị ga-arụ iji mezuo nchekwube gị.
Ọ bụrụ na ị na-agba ọsọ ihe ruru nkeji iri atọ, akwara fụwa gị ụfụ, ọ bụchaghị ihe ọjọọ imegide gị, were ya na ọ bụ ụzọ ahụ gị si agbasi ike.
2. Chọọ ihe ọma n'ime ọrụ ahụ ị na-eme "e mechaa e mechaa"

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ ụjọ na ị gaghị eme ya nke ọma mere ka ị na-egbu oge ịrụ ọrụ ahụ?
Fuschia Sirois, si mahadum nke Sheffield ejirila ihe karịrị afọ 15 na-enyocha ihe gbasara igbu oge, ọ chọpụtala na nsogbu "e mechaa" anaghị abụkarị umengwụ maọbụ amaghị etu e si ejikwa oge - ọ na-esikarị n'etu mmadụ si ahazi mmetụta uche ya.
Ọ na-echekasị gị na ị nwereike ịda, ị ga-achọta ngọpụ ị ga-eji gbuo oge imepụta ọrụ ahụ maọbụ gbara ime ya ma ncha nakwa ụzọ ị ga-esi ghara inwe obi adịghị mma.
Mana nke a nwereike ibute onye ahụ n'ọnọdụ imere gawa n'ihu: makana oge ahụ ị gburu emeela ka oge ị ji arụ ọrụ belata, mee ka ụjọ na ị gaghị emeta ya gbalie ma mee ka obi na-amapụ gị maka ya nke nwereike ime ka ị ghara imalite ya maọlị.
Iji kwụsị ihe ọjọọ ndị a, chọọ ihe ndị ọma dị n'ime ọrụ ahụ: ị nwereike ịmụta ihe n'ime ya maọbụ ị nwee mmasị ime ya karịa ihe ị tụwara anya.
3. Buru ụzọ mee atụmatụ!

Ebe foto si, Getty Images
Ị mara na e nwere ọnwụnwa na-akwanye gị ka ị gbuo oge ghara ime ihe dịịrị gị, ṅomie akparamagwa a na-akpọ "ọ bụrụ na - ya bụ na" - mgbe ị ga-atụpụta atụmatụ ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọnwụnwa ahụ dakwasị gị.
Peter Gollwitzer bụ ọkachamara n'akparamagwa si mba Amerịka nyochara mmadụ 94 site n'atụmatụ a ma chọpụta na ha nwere mmasị imezu nchekwube ha ugboro abụọ maọbụ karịa ndị ọzọ na-amaghị maka atụmatụ a.
4. Wetuo mbọ ị na-etinye

Ebe foto si, Getty Images
Ime nke a ga-eme ka ọ dịrị gị mfe imalite.
Ị nụla maka ihe a kpọrọ "choice architecture"? Ndị na-ere nri malitere itinye mkpụrụosisi nso ebe a na-akwụ ụgwọ karịa itinye chọkọleti, nke mere ka ndị na-azụ nri na-eri ihe na-edozi ahụ.
Ọzọ bụ ikwado onwe gị n'oge; ọ bụrụ na ị ga-aga ọrụ n'ụtụtụ, ị wepụta ọrụ i nwere ịrụ n'abalị nke ga-eme ka ọ bụrụ ihe mbụ ị ga-ahụ n'ụtụtụ ma malite ime ya.
Cheta wepụ ihe ndị ga-adọpụ uche gị dịka ịhapụ soshal midia, itinye ekwentị gị ka ọ ghara ịkụ egwu ma mmadụ kpọo gị, maọbụ ịgbanyụ ya agbanyụ.
5. Kwụọ onwe gị ụgwọ

Ebe foto si, Getty Images
Nchọpụta Kaitlin Woolley mere na mahadum Cornell gosiri na dịka ị si tụwa anya, ịkwụ onwe gị ụgwọ ozugbo na-ajalite ndị mmadụ ka ha tinye uchu n'ihe ha na-eme karịa ụgwọ a na-eche ma na-enwere olileanya.
"E mechaa e mechaa" na-aba n'anya makana igbu oge n'ọrụ nwereike ịra gị ahụ dị ka ịkwụ onwe gị ụgwọ ozugbo - nke bụ na ị ga-agba mbọ isi ụzọ ọzọ kwụọ onwe gị ụgwọ.
Chọta nke na-agara gị ma jiri ya jalite ma kwe onwe gị nkwa ma mezuo ya ma ị rụchaa ọrụ ahụ.
6. Aha ị kpọrọ onwe gị ka ị ga-aza

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ntakịrị dịka asụsụ ị ji dee ya nwere uru ọ bara.
Akpọzịla onwe gị "onye na-anọtu nnyochaa nri ọ na-eri" maọbụ onye na-anọtu agba ọsọ, ị kwuo na ị bụ onye na-agba ọsọ, ị ga-etinye uchu n'ịgba ọsọ.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:
IMPORTANT INFORMATION - Please make sure you tag our content. Under the Tags tab, in the Campaigns dropdown, select CS

































