Sexual abuse of minors: Ụfọdụ mmetọ ụmụaka e merela na nsonso a

Ụmụakwụkwọ
Nkọwa foto, Saa anya gị mmiri n'ihi na ndị na-elekọta ụmụaka nwere ike imetọ ha
Mgbe e biputara ya

Iwakpọ maọbụ metọọ ụmụaka bụ arụ na-arị elu ugbua.

Kwa ụbọchị, ana-anụ akụkọ banyere etu ụfọdụ okenye ọkachasị ndị ezinaụlọ, agbataobi na ndị ọrụ ha bụ ichekwa ụmụaka ndị asi na-akpa agwụ achaghị acha.

Akụkọ mmetọ ụmụaka mere nsonso a

* Otu nwoke a kpọrọ Adamu Abdullahi dị afọ 65 bụ onye ndị ọrụ nchekwa 'Civil Defence' na Jigawa maka ịmetọ nwa dị afọ 11 matụwa ya ime.

* N'ọnwa Febụwarị 25, akwụkwọ akụkọ Punch kwupụtara na otu nwaanyị kpụrụ di ya bụ Gabriel ụlọikpe.

Akụko kwuru na o mere nke maka na e chere na di ya metọrọ ụmụ ha dị afọ iri abụọ na ise, afọ iri abụo nakwa afọ iri na atọ na Badagry, Legọs.

Ụzọ ị ga-esi chekwa nwa gị

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Dorothy Oleka bụ onye ọkaiwu nakwa ọkachamara n'ihe gbasara ikike dịrị ụmụaka kọwara ụzọ ndị mụrụ nwa ga- esi chekwa ụmụaka n'aka ndị osochiegbu a.

Lee ụzọ ụfọdụ ọ tụpụtara ndị nne na nna na gọọmentị ga-esi gbochie arụ a:

Aha nkeananụānụ, 'Ụzọ ị ga-esi chekwa ụmụ gị n'aka ndị na-emetọ ụmụaka'

1. Ikwela ka di gị, ụmụ gị nwoke maọbụ odibo gị nwoke saa nwa gị nwaanyị ahụ.

2. Ahapụrụla ọbịa nwoke nọ n'ụlọ gị nwa gị nwaanyị ka o leta ya

Nwoke ku nwa

3. Kuziere nwa gị ihe a na-akpọ akụkụ ahụ dị iche ya ma gwa ya ka otie mkpu mgbe onye ọbụla metụrụ ya aka n'otele

Nwata na-ebe akwa

4. Jiri nwayọọ jụọ nwa gị onye nyere ya ihe onyinye ọbụla ị hụrụ n'aka ya abụghị nke i nyere ya.

5. Ọ bụghị sọọsọ nwa nwaanyị ka ana-emetọ, saa anya mmiri ma nwa gị nwoke ga ịnọnyere nwanne nna nwoke maọbụ nwanne gị nwoke.

Ụmụakwụkwọ ụmụnwoke

6. Gọọmenti kwesiri ịdegharị iwu gbasara mmetọ ụmụaka nke kwuru na a ga enwe onye akaebe kama ka e jiri okwu nwata ihe mere dịka okwu akaebe.

Akụkọ ga-amasị gị: