Ihe amabeghị ihe ọ bụ gbara n'Enugwu n'abali

Ụgbọala ihe gbara n'ime ya
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ogbunigwe amaghị ndị tụnyere ya gbara n'Otigba Junction dị n'Enugwu.

Onweghị onye nwụrụ n'ọdachi ahụ nke mere n'ime ụgbọala bu ndị mmadụ na nso Otigba ka o ji ihe dịka nkeji iri abụọ gafee elekere asatọ nke abalị.

Mana ndị nọ n'ime ụgbọala ahụ merụrụ ahụ.

Ebe ihe mere

Oge onye ntaakụkọ BBC rutere ebe ahụ, ọ hụrụ ka akwa na ngwogwo fesasịrị ebe ahụ.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ha nụrụ ka ihe dara oke ụda.

Ka ọ dị ugbua, ndị ngalaba na-ahụ maka ogbunigwe erutela ebe ahụ inyocha ihe gbara ma ọ bụ ogbunigwe ma ọ bụghị ya.

Akụkọ ka na-abịa

Sexual abuses in Catholic Church: 'Taa Bishọp ọbụla gbuchiri fada na-akpara akwụ ahụhụ'

Ndị ụkọchụ Katọlik
Nkọwa foto, Iwu megidere ndị ụkọchukwu Katọlik ịlụ nwaanyị

Cardinal Blase Cupich nke Chicago dị n'Amerịka akpọọla oku ka ewepụta iwu ọhụrụ ga na-ata ndị Bishọp ahụhụ maka ikpuchi ndị ụkọchụkwu na-akpa arụ n'ụka Katọlik.

Cupich kpọrọ oku a n'ọgbakọ Popu Francis kpọrọ na Vatican City banyere mkpesa metụtara mmetọ ndị ụkọchụkwụ ụfọdụ na-emetọ ndị chiri sista nakwa ụmụaka nke a madoro akwa ọtụtụ afọ gara aga.

Achọghị m ime Naijiria mba na-ekpe ụka Alakụba

Muhammadu Buhari
Nkọwa foto, Muhammadu Buhari gwara ụmụ Naijiria ha ekwela ka onye ọbụla nagha ha ịtụ vootu echi

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari agọọla agụgọ sị na akụkọ na-efegharị nke kwuru na ọ chọrọ ime Naijiria obodo na-ekpe ụka Alakụbabụ ụgha mabụrụkwa aka ọrụ ndị arụrụala chọrọ ibute nkewa. O kwuru na ya kwudosiri ike na iwu ala Naijiria.

N'aka nke ọzọ, Buhari n'ozi ọ gbasara n'Fraide n'ihe onyonyo gbara ụmụ Naijiria ume ka ha pụta n'igwe tụnyere onye masiri ha na ntuliaka ọkwa onyeisiala ga-eme ụbọchị Satode.

Ndi uweojii dị njikere maka ntuliaka -FPPRO

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Frank Mbah ekwuola na ndị uweojii ezipụrụ ọrụ nọna makụkụ dị iche iche na Naijiria adịla njikere ịhụ na udo chịrị dịka a na-eme ntuliaka Satode.

Ọ dọrọ aka na nti ka ndị agbaro na omekome gbara ọgwụ ha nụọ n'ihi na ndị ọrụ ha ga-anyụ onye ọbụla chọrọ ibute ọgbaghara ebe a na-eme ntuliaka ịkpakwụ.

Ụkwụ atọla Chelsea n'ama

Bertrand Traore ka o ji uwe Chelsea oge ya banyere n'otu egwu ahụ n'afọ 2014
Nkọwa foto, Bertrand Traore nyere goolu anọ na asọmpi 16 o soro Chelsea gbaa

N'egwuregwu, Fifa amachiela otu egwu bọọlụ Chelsea ịzụ ndị egwu were ruo afọ 2020 maka ịda iwu ịzụ ndị egwu bọọlụ na-etorughị afọ iri na asatọ.eto.