Ọgụ mba Kameruun bụ nsogbu ndị Krọs Riva nwere - Ayade

Gọvanọ Ben Ayade
Mgbe e biputara ya

Gọvanọ Krọs Riva steeti bụ Ben Ayade etiela mkpu n'oke olu na ndị Ambazonia chọrọ nwereonwe site na Kameroon na-ebubata ngwaagha na Naịjirịa.

O kwuru na ndị Ambazonia a na gọomentị mba Kameruun na-esi n'oke karịrị iri abụọ na asaa dị n'etiti Kameruun na Naịjirịa ebubata ngwaagha ndị a.

O kwuru nke a na ngwụcha mkparịta ụka nchekwa ha mere na Krọss Riva Steeti ebe ọ katọọrọ ndị ọrụ nchekwa maka nsogbu dị n'oke ha na ndị Kameruun.

Mgbe BBC gbara ọnụ na-ekwuru gọvanọ Ben Ayade bụ Christain Ita ajụjụ, na nke a bụ eziokwu na oke dị n'etiti steeti ahụ na Kameruun enweghi ezigbo nchekwa ọbụla.

Ndị chọrọ mwereonwe site na Kameruun
Nkọwa foto, Kamgbe Ọktoba afọ 2017 ha ndị kwupụtara mnwereonwe bụ ebe nsogbu ha bidoro

O kwuru na nke a mere ndị a ji na-abata na Naịjirịa na-ewe ụmụ Naịjirịa n'ọrụ isonye ha lụọ agha dị na kameruun site n'ibunye ha egbe na ngwaagha.

Ihe gọọmentị etiti kwesiri ime;

Onyeisiala Buhari na Gọvanọ Ayade

O kwuru na gọvanọ Ayade edegarala onyeisiala bụ Muhammadu Buhari akwụkwọ ozi banyere nke a, na-arịọkwa ka gọọmentị etiti gbatara ha ọsọ n'ichekwa oke ndị a.

O kwuru na steet na-agba mbọ nke ya site n'ike ajị n'ume ịhụ na-ebelatara oke mpụ nke mbubata ngwaagha ndị a na-ebute.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ