Ghana: Ndị LGBT si ka emere ntuliaka gbasara mmekọ ha

Mgbe e biputara ya

Otu LGBT na Ghana akpọkuola ndị omee iwu mba ahụ ka ha mee ntuliaka nye ụmụ Ghana ohere ikwu okwu gbasara ndị na-enwe mmekọ n'etiti ndị dị ka ha.

Ha kwuru na nke a bụ iji gosi ha na ezie, e nwere ụdị ndị a na mba ahụ.

Onye nkwuchiteọnụ ndị LGBT na Ghana kwuru na ndị na-enwe ụdị mmekọ a na Ghana juru ebe niile mana ha enweghi ike ịpụta maka ụjọ na-eso mkpagbu ndị mmadụ na-enye ha maka ụka maọbụ omenaala.

N'okwu ya : "Okwu gbasara ime ka mmekọ nwoke nwoke maọbụ nwaanyị na nwaanyị abụghị okwu otu onye, ka ha kpaa ya n'ụlọ omeeiwu nye anyị ohere ime ntuliak gbasara ya", ọ gwara BBC Pidgin.

Onye na-anọchite anya mba US na Ghana bụ Rober P Jackson nime ngwụcha izuụka gara aga kwuru ka ọnụọgụgụ ndị LGBT na Ghana karịrị etu ndị mmadụ si eche.

O kwukwara na Ghana nwere ike ime iwu ikwado her tupu afọ iri na-abị mana na Naịjirịa, oney ọbụla ejidere na-enwe ụdị mmekọ a, ga-aga nga afọ iri na anọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: