Lee nwaanyị na-amara Chukwu mbem na ka o si ama ya

Mgbe e biputara ya

Ify Nweke bụ nwaada Igbo nwere onyinye ịma mbem.

Ọ sị na anaghị agara ịma mbem ụlọakwụkwọ na ọ bụ sọ Chi na-enye mbem.

Ify si na nwata mawa mbem.

Ọ na-akọwa na mbem bụ onyinye nke mmụọ ya ji arịọ Chukwu ihe dị ya mkpa.

"Ọnwebeghị ihe m ji mbe a rịọ Chukwu ọ mebeghịrị m ya".

Ify sị na mgbe ya rịara ọrịa na ọ bụ mbem a ka ya jị chọta ihu Chukwu gwọrọ ya bụ ọrịa.

Ọ sị na isi mbem bụ n'egwu ka ọ dị.

Ify sị na ọnye onyinye mba mara wepụta ya, "ezozina ya ezo, ka anyị were ya na-enye Chineke otito".

Gịnị bụ mbem?

Mbem bụ ụsoro agụmegwu pụrụiche.

Ọ nye na-ama mbe ji okwu agụ egwu.

Ihe a ga-eji tụnyere ya na Bekee bụ "rap music" nke ọtụtụ ụmụntorobịa na-eme taa.

Mbem bụ ọdịnala nka ndị Igbo ja ji eme ihe siri ike.

A na-eji mbam eto jike, eji ya akwa arịrị ma ihe ike mee n'obodo.

Ejikwa ya akpọkụ olisa dị n'igwe ma ọ dị na mkpa.

Onyinye mbem na-ama mmadụ ama, anaghị amụ ya amụ.

Ụmụnwoke na-amakarị mbem, mana lekwa nwaanyị a Chukwu nyere onyinye mbem.

Ihe mere Mbem ji dị mkpa n'ala Igbo

Igbo bụ ndị na-ekwupụta etu ihe dị ha n'obi.

Lee ihe ndị mere mbem jiri dị mkpa n'ala Igbo -

  • E ji ajalite mmadụ ike
  • E ji ya egosipụta uju ma jiri ya kasie onye na-eru uju obi
  • Ụfọdụ ndị na-eji ya achụ obi mgbawa
  • Igbo ji mbem egosịpụta ọṅụ.

Ọ bụ Chigozie Ohaka na Chiemela Mgbeahuru mere akụkọ a