Lee nwaanyị na-amara Chukwu mbem na ka o si ama ya
Ify Nweke bụ nwaada Igbo nwere onyinye ịma mbem.
Ọ sị na anaghị agara ịma mbem ụlọakwụkwọ na ọ bụ sọ Chi na-enye mbem.
Ify si na nwata mawa mbem.
Ọ na-akọwa na mbem bụ onyinye nke mmụọ ya ji arịọ Chukwu ihe dị ya mkpa.
"Ọnwebeghị ihe m ji mbe a rịọ Chukwu ọ mebeghịrị m ya".
Ify sị na mgbe ya rịara ọrịa na ọ bụ mbem a ka ya jị chọta ihu Chukwu gwọrọ ya bụ ọrịa.
Ọ sị na isi mbem bụ n'egwu ka ọ dị.
Ify sị na ọnye onyinye mba mara wepụta ya, "ezozina ya ezo, ka anyị were ya na-enye Chineke otito".
Gịnị bụ mbem?
Mbem bụ ụsoro agụmegwu pụrụiche.
Ọ nye na-ama mbe ji okwu agụ egwu.
Ihe a ga-eji tụnyere ya na Bekee bụ "rap music" nke ọtụtụ ụmụntorobịa na-eme taa.
Mbem bụ ọdịnala nka ndị Igbo ja ji eme ihe siri ike.
A na-eji mbam eto jike, eji ya akwa arịrị ma ihe ike mee n'obodo.
Ejikwa ya akpọkụ olisa dị n'igwe ma ọ dị na mkpa.
Onyinye mbem na-ama mmadụ ama, anaghị amụ ya amụ.
Ụmụnwoke na-amakarị mbem, mana lekwa nwaanyị a Chukwu nyere onyinye mbem.
Ihe mere Mbem ji dị mkpa n'ala Igbo
Igbo bụ ndị na-ekwupụta etu ihe dị ha n'obi.
Lee ihe ndị mere mbem jiri dị mkpa n'ala Igbo -
- E ji ajalite mmadụ ike
- E ji ya egosipụta uju ma jiri ya kasie onye na-eru uju obi
- Ụfọdụ ndị na-eji ya achụ obi mgbawa
- Igbo ji mbem egosịpụta ọṅụ.
Ọ bụ Chigozie Ohaka na Chiemela Mgbeahuru mere akụkọ a